Ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa Anthrax nọ na Naịjirịa ugbua

Ebe foto si, Thinkstock
Ministri na-ahụ maka ọrụ ugbo ekwuola na ọrịa Anthrax abatala na Naịjirịa n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Joel Oruche wepụtara na Mọnde 17 Julaị 2023.
Nke a na-abia akụkọ kwuru na a hụrụ ihe yiri njirimaara ọrịa n’otu ugbo ụmụanụmanụ dị na Gajiri n’ụzọ si Abuja gawa Kaduna n’okpuruọchịchị Suleja nke Niger Steeti.
Mpụtara nyocha ngalaba na-ahụ maka ahụike ụmụanụmanụ na Plateau Steeti mere na 16 Jụlaị 2023, gosiri na ọrịa a dị ire na Naịjirịa.
Nke a na-eso aka na ntị gọọmenti Naịjirịa dọrọ ka ndị mmadụ mụrụ akọ mgbe a chọpụtara Anthrax na mba Ghana dị nso n’izuụka ole ma ole gara aga.
Gọọmentị etiti nakwa nke Niger steeti agbakọtala aka ọnụ ịhụ na a chịkwara ọrịa a aka ọ ghara ifesasị.
A gbachiela ọrụ ugbo ebe a hụrụ ọrịa dịka e kesara ọgwụ mgbochi ọrịa a ruru puku iri ise (50,000).Nje ọrịa a na-amụbawanye n’ebe unyi dị nakwa ebe ọbụla ha metụtara.
Gọomentị amaala ọkwa ka ndị na-azụ anụmanụ nakwa ọha ka ha kpachara anya banyere ọrịa a ma mee mkpesa ma ọ bụrụ ha hụụ ihe dị aṅyaa.

Ebe foto si, AFP
Gịnị bụ Anthrax kpọm kwem?
Dịka ụlọọrụ mgbochi mefesa ọrịa nke mba Amerịka bụ Centers for Disease Control and Prevention (CDC) siri kwuo, ọrịa bụ ihe nje a kpọrọ Bacillus anthracis na-akpata.
Ọrịa a na-esi n’ahụ ụmụanụmanụ abanye n’ahụ mmadụ.
Ụdịrị anụmanụ na-ebenyekarị ya ndị mmadụ bụ anụmanụ dịka ehi, ewu nakwa atarụrụ.
Nje a na-anyụpụta ihe nwereike ịmetụta ahụike mmadụ n’ọzọ ọjọọ ma nweike kpata ọnwụ mmadụ. Ndị mmadụ na-ebute ọrịa a site n’imetụ anụmanụ bu ọrịa aka, ahụ maọbụ rie nri si n’ahụ anụmanụ bu ọrịa a.

Ebe foto si, Getty Images
Ụdịrị ọrịa Anthrax ole ka e nwere?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka otu ahụike ụwa WHO siri kwuo, e nwere ụdịrị ọrịa atọ n’ụwa dịka ha nwere njirimara ndị dị iche iche.
Cutaneous anthrax: Ụdịrị nke a bụ ihe kacha baa ụba n’ụwa. Mmadụ nwereike isi n’akpụkpọ ahụ bute ụdịrị ọkachasị site n’ọnya, ebe mmadụ mere ahụ, ebe yere oye n’anụ ahụ mmadụ nke njem ọrịa nwereike isi banye n’ime ahụ mmadụ. Nke a ga-eme ka ebe ahụ malite ịkọ mmadụ ọkọ ma malite ịcha agwa ojii. Ụfọdụ ndị ga-amalite ịnwe ahụ mgbu, ahụ mkpomọkụ, ịgbọ agbọ nakwa inwe isi ọwụwa.
Gastrointestinal anthrax: Ụdịrị nke a bụ nke mmadụ nwereike ibute ma o rie nri si n’ahụ anaụmanụ bu ọrịa a. Onye butere ya etu a nwereike ịmalite nwewe ihe mgbu n’afọ ya, gbọwa ọbara maọbụ malite inwe afọ ọsụsa.
Pulmonary anthrax: Ụdịrị nke a bụ nke ndị mmadụ anaghị ebutekarị bụ nke a na-esi site n’iku ume kuba n’ime ahụ mmadụ. Nke a mee, ịmara na onye ahụ gara n’ebe nje ọrịa bara ụba n’ikuku dịka ụdịrị a nwereike ịmalite dịka azụzụ ma mecha mee ka iku ume malite ịra onye bu ya ahụ.
E nweela ụdịrị nke anọ a na-akpọ ‘Injection anthrax’, ụdịrị nke a bụ nke a na-ahụkarị na mpaghara Europe bụ nke a na-esi na ntụtụ bute. Onye butere ụdịrị nke a ga-enweta oke ahụ ịkọ ọkọ, nakwa ndakpo ịrụ ọrụ ime ahụ ya.
Gọọmentị etiti Naịjirịa amalitela itinye usoor ga-ebelata mfesa ọrịa a ugbua. Ka ọ dị ugbua, e dopụla ụlọ ebe a na-azụ anụmanụ ebe a e bu ụzọ hụ ọrịa a iche ugbua.
Amalitekwala inye ndị na-azụ anụmanụ ozụzụ pụrụiche maka nchekwa n’aka ọrịa a dịka a na-agbazị ụmụanụmnụ ọgwụ mgbochi.












