A mụrụ anyị mgbe a na-atụfu ejima - Ụmụ ejima gbara afọ 80
Ụmụ ejima gbara afọ 80 n’afọ a kọwara BBC Igbo etu nne ha siri zọọ ndụ ha oge ochie a na-atụfụ ụmụ ejima dịka ha.
Na mkparịtaụka a, otu n’ime ha bụ Christian Odocha kọwara na oge a mụrụ ha n’obodo Isiokpo nke Rivas steeti na ndị obodo ahụ sị ka etufo ha n’ihi na nwaanyị ewesịghị ịmụ ụmụ abụọ n’otu mgbe mana nne ha gbara isi akwara na nke a.
O kwuru na obi dị ya ezigbo mma ịhụ na ya na ejima ya dị ndụ ruo afọ 80.
Christian bụ onye ụkọchukwu ụka Kraịst, ebe ejima ya bụ onye ọrụ ịnjịnịa.
Ha kọwara na ha si Mbaise nke Imo steeti ebe nne na nna ha mụrụ ụmụ asatọ nke ha niile ka dị ndụ ruo taa.
Mgbe otu nwa nwoke aha ya bụ Umego Valentine bụ onye nọ ezinụlọ a kesara foto ha jiri mee emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ha na Twitter ya, ọtụtụ ndị mmadụ gosiri mmasị ha n'ebe ogologo ndụ mmadụ abụọ a dị.
Ọtụtụ kwuru na ndụ ha abụọ kpalitere mmụọ ha n'ụzọ ọma ebe ndị ọzọ nọ na-ekpe ekpere ka ha mmụọ ejima nakwa ka ha bie ndụ toro ogologo ka ha abụọ.

Ebe foto si, Ezinaụlọ Odocha
Ha rịọkwara ndị ọchịchị na Naịjirịa ka ha ghara ịga n’ihu na-ekuziri ndị ntorobịa ndụ na-akwalite mpụ na aghụghọ.
N’okwu ha, ha rịọrọ ndị ọgbọ ha ka ha tinye aka nye ndị ọgbara ọhụrụ ezi ntuziaka, ọkachasị dịka ọ bụ ha bụ ndị kposara ụwa a nke ndị ntorobịa nọ n’ime ya ugbua.
Akụkọ ha kọrọ gbakwara ama etu ihe ịtụ n’anya siri mee na ndụ ha nke bụ na ha abụọ lụrụ ụmụnwaanyị abụọ bi n’otu ama na ntunye nke bụ na ha akpaghị ya akpa n’oge agha Biafra.
Ndị mere akụkọ a bụ Makuochi Okafor na Vining Ogu.






