Omenala Igbo: 'Nwa m amụtaghị nwa tupu ọ nwụọ, anyị wee lụtara ya nwaanyị ga-amụtara ya nwa'
Omenala Igbo dị omimi.. Ọtụtụ ihe dị n'ime Omenala bụ ihe ndị mgbe ochie wepụtara iji nye ndị mmadụ ohere ịchọputa ụzọ mmezi ihe ọbụla na-enye ha nsogbu.
Otu n'ime omenala ndị a bụ nke na-enye ohere ka a lụtara nwoke nwaanyị - ọkachasị onye amụghị nwa tupu ọ nwụọ.
Felicia Orji gwara BBC Igbo ihe mere o Ji sooro usoro omenala a.
Gee ya ntị n'ihe nkiri a.
Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo na Chiemela Mgbeahuru

