Omenala Igbo: 'Nwa m amụtaghị nwa tupu ọ nwụọ, anyị wee lụtara ya nwaanyị ga-amụtara ya nwa'

Aha onyonyo, Nwaanyị lụtara nwa ya nwụrụ nwaanyị

Omenala Igbo dị omimi.. Ọtụtụ ihe dị n'ime Omenala bụ ihe ndị mgbe ochie wepụtara iji nye ndị mmadụ ohere ịchọputa ụzọ mmezi ihe ọbụla na-enye ha nsogbu.

Otu n'ime omenala ndị a bụ nke na-enye ohere ka a lụtara nwoke nwaanyị - ọkachasị onye amụghị nwa tupu ọ nwụọ.

Felicia Orji gwara BBC Igbo ihe mere o Ji sooro usoro omenala a.

Gee ya ntị n'ihe nkiri a.

Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo na Chiemela Mgbeahuru

Akụkọ ga-amasi gị: