Ụzọ ise ị nwereike iji agbalahụ ụbịam ugbua

Ahịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ma onye ukwu ma onye nta na-ebe akwa ihe isi ike ugbua

Nke bụ eziokwu bụ na ma nwa e bu n'afọ na Naịjirịa ugbua amarala na ihe tara akpụ, kpọọ akpọ ka chịnchịn. Ma onye elu ma onye ala, ma onye ukwu ma onye nta na-ebe na obodo bụ igwe.

I nwereike hie ụra teta ego naịra a na-ada, na-akpụ afọ n'ala, nke ka njọ bụ na ị gacha ahịa na mgbede labaa, tupu i teta n'ụtụtụ, ihe ahụ ị zụtara na mgbede etinyela ego karịa ihe ị tụrụ anya ya, nke a na-eme ka onye ọbụla na-ebe akwa arịrị.

Mana ihe dikwa mkpa ịmata bụ na ụdị ihe isi ike a na-adị oge niile a chọrọ ime ntuliaka ọhụrụ na Naịjirịa. Nke mere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji eji nri eme achụmnta vootu n'oge gara aga maka na agụụ akarịala n'obodo.

Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eji agụụ eme ngwaagha ha ji achụ nta vootu mana oge a, ọ dị ka a ga-asị na ihe agbanweela.

Ebe ọ bụ na dịnta amụtala ịgba na-ataghị ata, nwannụnnụ ga-amụta ifegharị na-ebeghi ebe.

Ọ dị mkpa ịmata ụzọ mmadụ ga-esi enyere ndụ ya aka n'oge a ka ọ ghara inwe ọbara mgbali elu ebe a na-eche echiche maka ihe isi ike.

Ego dọla na naịra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, I hie ụra teta, naịra adaa, dọla arịgọ

Ihe ise ị nwereike ime ka isi gị pụta gị n'oge a

  • Hazigharịa ego gị na ihe nweta gị

Ugbua abụghị oge e ji ata ego 'vamvamvam', nke onye nwere, o jidesie ya ike mara etu ọ ga-esi enwetakwu karịa imefu ya emefu.

Ọ dị mkpa mmadụ ilebara etu o si emefu ego anya mara ebe ego ya na-ala na ihe ndị na-eri ya ego iji mara etu o ga-esi hazie onwe ya.

Mee bọjetị ka i wee mara ihe dị mkpa na ihe ndị na-adịchaghị mkpa karịa. Etu ahụ, ị ga-ama ebe ego kwesiri ịga na ebe ndị i nwereike idi.

Onye na-agụ ego

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Jiri nwayọọ na-emefu ego
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

2. Kwusi mbimbi

Igbo sị na "ebe aka ruru nwaanyị ka ọ na-atụkwasị di ya." Onye niile kwesiri ịgba onwe ya ume ma guzosie ike iji gbanarị ọnwụnwa ibi ego.

Ihe na-eche mmadụ ugbua akarịala iji tinye ụgwọ n'elu ya. Jidesie onwe gị ike n'ihe ọbụla ị na-enweghi ego ya ka ị hapụ ya.

Wepụ anya gị n'ihe ị na-enweghi ego ya ma gị emela maka na ndị ọzọ mere. Ejila maka Ịnstagram maọbụ soshal midịa tinye onwe gị n'agbagharịa.

Ebila ego iji mee ihe na-agaghị amụtara gị nwa ego n'elu ya ka i nwee ike hie ụra nke ọma n'abalị. Onye ọbụla kowe akpa ya ebe aka ya ga-eru ya.

3. Mụta aka ọrụ ọzọ ma chọta ụzọ ọzọ iji enweta ego

Ndị ọkacha mara n'okwu gbasara akụnaụba ekwuola ọtụtụ oge na isi n'otu ụzọ enweta ego anaghị aba mmadụ ọgaranya, i kwesiri inwe ụzọ dị icheiche ego si abata gị n'akpa, o si ebe a bata, si ebe ọzọ bata, akpa eju.

E nwere ọtụtụ aka ọrụ dị icheiche mmadụ nwereike ime n'akụkụ iji nweta ego tinyere ego ụgwọ ọnwa maọbụ ego ọrụ ị na-anata.

Tinye uchu mụta otu ga-enye aka n'oge ụkọ a.

4. Azụzịla ihe ọhụrụ ma i nwere ya nke ochie

Ekeresimesi fọrọ izu ole na ole, oge e ji adọ ndị mmadụ gote gote.

Biko lezie anya nke ọma n'ụlọ gị mara ihe ndị i nwere i nwereike iwepụta tichaa ya nke ọma maọbụ saa ya mmiri ka o wee ghọrọ nke ọhụrụ kama imefu ego zụta nke ọhụrụ.

Ọ bụghị iwu na ị zụrụ akwa ọhụrụ, o nwere akwa ụfọdụ ndị ị zụrụ kamgbe ị na-emetubeghidị aka, gaa chịpụta ndị ahụ kama ịzụ nke ọhụrụ.

O nwekwara ike na akpụkpọ ụkwụ juru n'ime be gị mana umengwụ ekweghị gị gaa kpopụta ha. I lemie anya elemi, ihe ndị dị n'ụlo nwereike ibetara gị ego dị egwu n'oge a.

Ọzọkwa dị ka ibe ya bụ na ị hụ ebe ọ ga-ebelatara gị ego ma ihe ahụ dị ezigbo mma, biko agala ebe ọ ga-eri gị ego karịa. Chọọ ebe ọ ga-ebelatara gị ego oge niile mana azụkwala ebere ego ebere akpa.

Onye na-achịpụta akwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihere adịghị n'iticha ihe i nwere

5. Malite ịnata ndị enyi gị ego maka akaọrụ ahụ ị na-enye ha n'efu

I nwere ihe ndị Bekee kpọrọ 'hobbies' bụ ihe ndị ị na-eme na-etinye uche na ya, ihe ndị ahụ nwereike ịkpatara gị ego.

Ugbua bụ oge mmadụ kwesiri inweta ego n'ụzọ dị icheiche, kama ime ya n'efu, natawa ndị mmadụ ego maka ya ka o tinyekwuo na nke i ji.

Nke ikpeazụ a bụzi mgbakwụnye, "a zụla ihe ahụ karịa ma ọ dị mkpa karịa ihe ndị ọzọ niile".