Etu ndị uweojii mbaụwa si jide ndị otu Black Axe na mba ofesi ma na Naịjirịa

Ndị uweojii na-awuchi ndị omekome

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, Ndị uweojii na-awuchi ndị omekome
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ndị uweojii n’ụwa niile gbaa gburugburu ejikọọla aka iji rụọ ọrụ ma nyocha otu ‘Black Axe’ a na-atụ egwu n’ọdịda anyanwụ Afrịka.

Ndi uweojii yi uwe ma jiri akụrụngwa agha rụrụ ọrụ ahụ a kpọrọ Operation Jackal III, wakporo mba 21 n’ime ọnwa Eprel na Julaị afọ 2024.

Ọrụ ahụ nke ụlọọrụ global policing agency Interpol haziri, mere ka a wuchie mmadụ 300 so n’otu Black Axe nakwa otu ndịọzọ.

Ụlọọrụ interpol kọwara ọrụ dịka ọdachi dakwasara ndị omekome na Naịjirịa ma dọọ aka na nti na nfesa ndị omekome n’obodo dị iche iche n’ụwa bụ ihe iyi egwu nye ọha.

Iji maa atụ, ndị ọrụ mba Canada kwuru na ha wakporo otu na-ebupu ego n'uzo megidere iwu a na-ekwu so n'otu Black Axe man wuchie ego ruru ijeri dọla ise ($5 billion) n'afo 2017.

Akụkọ maka otu nzuzo ndị ọzọ

Otu onyeisi na ngalaba Financial Crime and Anti-Corruption Centre n'ụlọọrụ interpol bụ Tomonobu Kaya gwara BBC na ndị otu ahụ haziri onwe ha nke ọma.

Akwụkwọ nyochaa Interpol wepụtara n'afọ 2022 kwuru na otu Black Axe na ndịọzọ yiri ya, bụ ndị na-eme nrụrụaka cyber nakwa mkpamkpa ndịọzọ.

Mazị Kaya kwuru na ọ bụ mmepe, ọtụtụ ụzọ ezi eziga ego nakwa ego crypto ka ndị otu ahụ ji egwu ndị mmadụ wayo.

Ọrụ ahụ bụ Operation Jackal III emeela ka a wuchie ihe onụ́ ego ya ruru nde dọla ato ($3m) nakwa oba ego akaụntụ 700 a machiri.

Ụfọdụ ndị otu Black Axe bụ ndị gụrụ akwụkwọ banyere otú ahụ oge ha na-agụ akwụkwọ.

Akụkọ Africa Eye ndị ọzọ

Ha bụ otu nzuzo na-atụ mgbere mmadụ, ndị akwụna ma na-egbu ndị mmadụ n'ụwa niile gbaa gburugburu.

Ndị ha na-achọ bụ ụlọọrụ buru ibu ma nwee nnukwu ego.

Enweela ọtụtụ ọrụ nchọpụta "Jackal" ndị uweojii kemgbe afọ 2022.

A awuchiela ọtụtụ ndị otu Black Axe na ndị otu ọzọ na akụrụngwa ha ji arụ ọrụ. Ọrụ nchọpụta emeela ka Interpol nweta ọtụtụ ozi ha kesara na 196 ụlọọrụ ha dị.

Mazị Kaya kwuru na nchọpụta na nyocha ha mere na-enyere ha aka ịchọpụta ka otu ndị ahụ si akpa agwa.

Ndị uweojii na-enyocha ihe ha nwetara ka ha mesiri mwakpo

Ebe foto si, Interpol

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Na agbaghehi nwuchi e mere, ndị ọkachamara kwuru na enwere ọtụtụ ihe e kwesịrị ime iji kwụsị ndị otu nzuzo a n’ọdịda anyanwụ Afrịka.

Onye nhazi ụlọọrụ Institute for Security Studies n’ọdịda anyanwụ Afrịka bụ Oluwole Ojewale, kwuru na e kwesịrị igbochi ọrụ ndị otu ahụ.

Enweela ngagharịiwe maka nrụrụaka na Naịjirịa na nso nso a. Dịka mba Afrịka akụnaụba ya kachasị, ihe ruru nde mmadụ 87 dara ógbè ye dịka akụkọ ụlọakụ mba ụwa World Bank. Ọ bụ na Naịjirịa ka e nwere ndị otu Black Axe karịsịa.

Interpol kwuru na ha na-enye ndị uweojii Naịjirịa ọzụzụ, mana nrụrụaka na mmekọ ndị otu Black Axe na ndị ọchịchị na-egbochi ya.

"Ọ bụ ndị nọ n'ọchịchị na-enye ndị otu ngwa agha," ka Ojewale kwuru. "Ajọ ọnọdụ obodo na-eme ka ndị mmadụ ka ha banye n'otu Black Axe".

Ọrụ nchọpụta Interpol gbasaraa n'ụwa niile mana ọrụ nchọpụta a malitere na mba Ireland.

Ka ụlọọrụ Garda National Economic Crime Bureau (GNECB) mechara mwakpo n'afọ 2020, ha wichiri ọtụtụ ndị otu Black Axe nke mere ka ọha mara maka otu ahụ nakwa ngalaba ha n'ụwa.

Onye ọrụ n'ụlọọrụ GNECB bụ Michael Cryan kwuru na "Anyị na-enyocha ndị ahụ kemgbe tupu anyị wuchie ha".

O kwuru na ego ha nwetara n'aka ndị otu ahụ a wuchiri buru ibu.

Ekwenti ndị uweojii machiri

Ebe foto si, Interpol

Ndị uweojii mechara chọpụta mmadụ 1,000 ha na otu Black Axe nwere mmekọ na mba Ireland ma wuchie ọtụtụ n'ime ha.

Cryan kwuru na e ji igwe kọmpụta ezu ụlọakụ ohi ugbua.

O kwuru na ezurula ihe ruru narị nde yuro abụọ (€200m) na mba Ireland n'ime afọ ise gara aga.

Ihe abụghị obere ihe..ndị omeiwu kwesiri ịma maka ya.

N'ọnwa Nọvemba 2023, ndị uweojii mba Ireland kwuru na ego crypto bụ etu ndị otu Black Axe na-eji ezu ndị mmadụ ohi maka na ọ bụ ego dijitalụ.

Akụkọ kwuru na a wuchiri ihe ruru otu nde yuro (€1m) n'otu ọrụ nchọpụta e mere.

Interpol ewepụtala ụzọ ọhụrụ a kpọrọ Global Rapid Intervention of Payments system (I-GRIP) iji buo agha megide ndị otu ahụ.

(I-GRIP) na-enyere ndị ọrụ mba ụfọdụ aka ịmachi ọbaego ụlọakụ a chọpụtara na ha ji ya eme mpụ.

Mzị Kaya kwuru na mmepụta teknụzụ a ga-enyere gbochie ndị omekome eziga ego n'ụzọ megidere iwu.

A na-akwado ịchịkọta ma kesaa nchọpụta na ihe banyere otu Black Axe na otu nzuzo dị n'ọdịda anyanwụ Afrịka.

"Anyị nweta nke a, anyị ga-eji ya rụọ ọrụ", Kaya kwuru.