New Artisan: Nyocha ịrụzi akwa mmiri a na-aga n'ihu n'Enugwu

Ọdịda Akwa mmiri New Artisan Enugwu dara na ụbọchị monde 25th nke ọnwa Septemba mara ndị mmadụ nnukwu akpata oyi n’ihi na ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọala amaghị na agwọ nọ n’akịrịka tupu o mee.
Oge ya bụ akwa dara na elekere iri na abụọ nke etitu ụbọchị, nani otu ụgbọala 'Diana' danyere na olulu ahụ, n’ihi na puku kwuru puku ụgbọala na agafe ya bụ akwa mmiri nọ n’ụlọ maka nke akpọrọ sit-at-home n’emekari kwa monde na ọwụwa anyanwụ Naijiria.
Gọvanọ Enugwu bụ Peter Mbah gbatakwara ngwa ngwa o mere kwee nkwa na ọchịchị ya ga amalite ọrụ ozigbo.
Minista n’ahụ maka ọrụ na akụrụngwa bụ Dave Umahi biakwara njem nleta na ya bụ akwa nke nọ na “Federal Road”.
Umahi gosiri obi aṅụrị ya na mmadụ anwụghị n’ihe mberede ahụ ma kwee nkwa na gọmenti etiti nakwa nke steeti Enugwu ga ejikọ aka ọnụ rụọ ụzọ ahụ ngwa ngwa.
Ugbua o meela abalị iri na ọtu ya bụ akwa mmiri dara.
Mgbe BBC rutere na New Artisan Enugwu, ihe anyị hụrụ bụ ụlọ ọrụ n’eme nke bekee kpọrọ “Intergrity test” na “ Geo-Technical Survey”.
Onye Engineer nọ ọrụ ebe ahụ kwuru na ọrụ amalitebeghị n’uju, kama na ọ bụ nyoch a ụlọ ọrụ ya n’eme ugbua ga ekeu ma okwesịrị ka akụtuo akwa mmiri ahụ niile tụọ nke ọhụrụ ka ekwesiri imekwaba ya emekwa.
Mazi Kehinde gara n’ihu gosi anyị na ihe ha na enyocha bụ ka ala ya bụ akwa mmiri di, igwe na cement ejiri ruọ ya ọka dị ndụ, igwe niile nọ n’ala ọka zuru ezu, akwa mmiri ahọ ọkaala nka nke ukwuu nakw ihe ndị ọzọ.
Ngwa ngwa ha mechara nkea ka gọmentị ga-amazị ndị ha ga-enye ya bụ ọrụ ngo.
Nchọpụta gosiri na Akwa mmiri new Artisan Enugwu akarịala afọ iri ise arụrụ ya.
Lee akwa mmiri dị n’Enugwu gọọmentị kwesiri ịlebanye anya

Enugwu steeti nwere ọtụtụ akwa mmiri mere ochie nke ukwuu, kwesịrị ka Gọmentị na arụgharị ya kwa mgbe kwa mgbe mana ha anaghị eme otu a.
Enugwu bubu isi obodo Anambra steeti ma bụrụkwa isi obodo ọwụwa anyanwụ Naijiria, nke a mere na ọtụtụ akwa mmiri ndi a bụ nke arụgasiri tupu a lụọ agha ma ọ bụ ozigbo anụchara agha.
Kwamgbe kwamgbe ka gọmenti ndị chịrị Enugwu na amapụta amụma ka edozigharịa akwa mmịrị ndia, mana naanị otu ma ọ bụ abụọ n’ime ha ka edoziri.
Lee ụfọdụ Akwa mmiri ndi ahụ
Akwa mmiri New Artisan Enugwu

Nchọpụta anyị gosiri na akwa mmiri a bụ ihe dịka afọ iri ise gara aga ka arụrụ ya.
Ebe ọ nọ bụ ebe ndị si mgbago ugwu ala anyị n’ere rhi na atụrụ.
Ndị ọkwọ ụgbọala na esikari ya bụ okporo ụzọ kwuru na ka mgbe afọ iri gara aga, ya bụ akwa mmiri na eme nnukwu mkpọtụ ma ha na agafe.
Nke a gosiri na ọ chọrọ ida ada.
Akwa mmiri New Artisan Enugwu dara ada n’ụbọchị mọnde 25th septemba 2023.
Mmadụ anwụghị na-ya bụ ọdachi, kama naani otu ụgnọala danyere n’ime ya bụ mmiri ngwa ngwa ụzọ gbawara abụọ.
Akwa mmiri TransEkulu Enugwu

Akwa mmiri a bụ nke jikọrọ GRA Enugwu na Damija Trans Ekulu Enugwu.
Kemgbe ihe karịrị afọ 30yrs ka ya bụ akwa mmiri n’eme nnukwu mkpọtụ ma ụgbọala gaa na ya.
Jijiji ọ na ama mere na ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọala ji agbara ya ọsọ, maka egwu na o nwere ike ịda gbuo ndị mmadụ.
Akwa mmiri Abakpa 1st Bus stop
Akwa mmiri Abakpa so na ndị kacha mee ochie n’Enugwu niile.
Ya bụ akwa mmiri dara ada n’afọ anọ gara aga oge Gọvanọ Ugwuanyị nọ n’ọchịchị.
Enugwu steeti gọmentị rụziri ya nke gbanụ gbanụ ma kwee nkwa na ha ga arụzi ya nke ọma, mana ọ ka dịkwa otu ọ dị.
Puku kwụrụ puku ụgbọala na-agafe ya bụ akwa mmiri Abakpa kwa ụbọchi.
Akwa mmiri Orie Emene

Akwa mmiri a megoro ochie nke ukwuu bụ nke si na ebe ọdọụgboelu were gafee ahịa orie Emene.
Akwa mmiri ahụ kwesịkwara mmezi makana oteela aka.
Akwa mmiri ndi a bụ nke nọ na gburu gburu “township” Enugwu, e nwere ndị nọkwa n’ime ime obodo dika akwa mmiri mmiri Nkerefi na akwa mmiri Nomeh mere ochie ma kwesi na gọmenti ga eleba ya anya.
Ụfọdụ akwa mmiri ndị ahụ nọ n’okpuru Gọmenti Etiti ebe ụfọdụ nọ na nke gọmenti Enugwu.










