Awakpoola ụlọ onye ji ọkọlọtọ Labour Party azọ ọkwa n'Imo Steeti

ụgbọala a gbara ọkụ

Ndị ojiegbe awakpoola ụlọ Nnaemeka Obiaraeri bụ onye ki ọkolọtọ otu ndọrọndọrọ Labour Party azọ ọkwa nnọchite anya Okigwe n'ụlọomeiwu nke Imo steeti n'ụtụtụ ụbọchị satọde.

Ọ bụ n'akwụkwọ ozi Obiaraeri depụtara n'ụtụtụ satọde ka o kwuru nke a ma sị na ndị ojiegbe a gbara ụlọ ya, nke nna ya, na nke nwanna ya ọkụ na ya bụ mwakpo ma gbaa kwa ụgbọala ha ọkụ.

O kwuru na ọ bụ ndaghe nke otu patị All Progressive Congress nọ n'ọchịchị butere ya bụ mkpamkpa.

ụgbọala ndị omekome gbara ọkụ

Obiaraeri dere sị, " Eritela m ọdachị ọzọ nke sitere n'enweghị ezi nchekwa na Naịjirịa".

Ọ gara n'ihu dee sị, " Ndị ojiegbe a amaghị ndị ha bụ (kama ndị zitere ha ma ndị ha bụ), gara n'ụlọ m dị n'ama nna m nke dị n'Amagu Ihube were gbaa ụlọ m ọkụ naụgbọala ndị m ji arụ ọrụ. Ha gbakwara ụlọ nna m ọkụ, na nke nwanna m...egwu ka ji nne m na ụmụnne m aka ugbua".

O dere na ndị a ji ụgbọala Hilux atọ were bịa ma enweghị onye ọbụla gbochiri ha.

Ọ dekwara sị, " Amaghị m onye m mejọrọ na ihe mere mmadụ ji achụ m...enweghị onye m ji ji maọbụ ede ya".