Gịnị bụ 'Blue Economy' nke onyeisiala Tinubu kepụtara ọhụrụ?
Dịka onyeisiala Bola Ahmed Tinubu kpọpụtara aha mmadụ 45 o họrọ n'ọrụ dịka Mịnịsta, ọ gbara ọtụtụ ndị mmadụ gharịị dịka ha nụrụ na a ga-enwe mịnịsta ga-elekọta ngalaba a kpọrọ 'Marine na Blue Economy'.
Nke a bụ nke mbụ a ga-enwe mịnịsta 'Blue Economy' na Naịjirịa, nke kpatara ọtụtụ ji ajụ sị, gịnị bụ Blue Economy? Gịnịkwa ga-abụ ọrụ Mịnịsta ga-elekọta ngalaba a?
BLUE ECONOMY bụ okwu e ji akọwa ihe niile gbasara oke osimiri, akụnụba e nwereike inweta na ya, nakwa etu a ga-esi kwalite ma chekwaa gburugburu osimiri.
Nnyocha nke otu Commonwealth mere gosiri na ngalaba a bụ Blue Economy na-ewebata akụ ruru otu tarị dọla na ọkara ($1.5 trillion) kwa afọ, dịka a na-atụ anya na ọ ga-eru tarị dọla atọ ($3trillion) n’afọ 2030.
Gboyega Oyetola, bụbu gọvanọ Osun Steeti, bụ onye onyeisiala Tinubu họpụtara dịka Mịnịsta ga-elekọta ngalaba a, nke a mere ya onye mbụ na Naịjirịa ga-eji ọkwa Mịnịsta Blue Economy.

Gịnị ga-abụ ọrụ Mịnịsta 'Blue Economy'
N'ihi na ọkwa a bụ ọkwa ọhụrụ na gọọmentị Naịjirịa, o dochaghị anya ihe ga-abụ ọrụ Mịnịsta ọhụrụ a, mana BBC kpọtụụrụ otu onye ọkachamara na ngalaba akụnụba na ọdịmma gburugburu aha ya bụ Samuel Ajala ma jụọ ya ihe o chere mịnịstrị 'Blue Economy' a kwesịrị ime.
Ajala kwuru na otu ọrụ chere Mịnịstrị a n'ihu bụ ịchọpụta ụzọ Naịjirịa ga-esi ritewanye uru n'osimiri ndị gbara anyị gburgburu, na-ewepụghị uche n'atụmatụ nchekwa osimiri dịka mgbanwe ihu eligwe kacha emetụta osimiri.
Onye ọzọkwa aha ya bụ Nicholas Adeniyi kwuru na nkepụta mịnịstrị ọhụhụ a gosiri na gọọmentị dị uchu iwulite ọnọdụ akụnụba Naịjirịa.
"Atụmatụ inwe mịnịstrị ga-elekọta 'Blue Economy' bụ ihe dị mma, mana oge erubeghị maka inwe aṅụrị n'ihi na ọrụ dịịrị onye ga-abụ mịnịsta na ngalaba ahụ dị ọtụtụ."

Ebe foto si, Nigerian Presidency
Ụfọdụ ihe ga-abụ ọrụ ngalaba a, dịka ndị ọkachamara si kwuo, gụnyere:
Ichepụta etu a ga-esi kepụta ọrụ na ngalaba a, maka imirikiti ndị ntorobịa Naịjirịa na-enweghị ọrụ
Ilebanye n’uzoro mbubata na mbupu ngwaahịa site n’oshimiri, nke bekeee na-akpọ Shipping, ma mee ka ọ kawanye mma
Itinye anya n’ụzọ a ga-esi buso mgbanwe ihu eluigwe (climate change) agha, ma gbochie ụfọdụ ọdachi na-esi n’osimiri
Iwultite ihu osimiri dị icheiche e nwere na Naịjirịa iji Ịkwalite njem nlere anya
Ịkwalite mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ n’ihe gbasara ọdịmma osimiri.












