Etu nnyocha ogbugbu nwata a na 'West Bank' si bute ebubo na ndịagha Israel mere mpụ agha

N'ehihie abalị 29 nke ọnwa Novemba afọ gara aga, ọtụtụ ụmụaka nwoke ndị Palestine wụjuru n'okporo dị ụzọ na 'West Bank' ebe ha na-egwukarị egwu.
O teghị aka, abụọ n'ime ha tọgbọrọ n'ozu dịka mgbọ si na egbe ndịagha Izrel gbara tụrụ ha - Basil gbara afọ 15 ebe Adam gbara afọ asatọ.
BBC mere nnyocha ihe ndị ọrụ nchekwa Izrel na-eme na West Bank, nke ndị agha na-aga n'ihu ihe ruru afọ 50 (ọkara centuri), iji kpupee etu e si gbuo ụmụaka abụọ ahụ.
Ekwentị nakwa igwe onyonyo CCTV gosiri etu ndịagha Izrel si gaa, akaebe ndị hụrụ ihe mere na nnyocha ihe mere na nnyocha ebe ihe nọrọ mee.
Ihe akaebe anyị hụrụ kpalitere onye ọrụ pụrụ iche n'okwu ikike dịịrị onye agha megide iyi egwu bụ Ben Saul, ịkpọ ọnwụ Adam "mpụ agha".
Ọkamachara iwu ọzọ bụ Dọkịnta Lawrence Hill-Cawthorne, kwuru na ndịagha Izrel na-eji aka ike eme ihe aghara aghara
Ndịagha Izrel bụ "Israel Defense Forces" (IDF) kwuru na a na-enyocha ọnọdụ ihe ahụ si mee" mana sị, “A na-agba egbe naanị iji wepụta ihe nwere ike iwere ndụ maọbụ iji nwuchie mmadụ, ma ọ bụ na emeela ihe ndị ọzọ a na-eme tupu a nwụchie mmadụ."

Dịka tigbuo-zogbuo na-akpọtụ na 'West Bank' n'ọnwa ole na ole kemgbe Hamas wakporo Izrel na Gaza n'ọnwa Oktoba, BBC ahụla ihe akaebe gosiri na a na-emebi ụlọ ndị Palestine, dekacha ya ihe, a na-eji ngwagha na-amaja ha ma gwa ha ka ha pụọ gawa na Jordan dị n'agbata obi ha., naakwa ozu onye bu egbe e bekachara ahụ ya.
Onyonyo e mere n'abalị 29 nke ọnwa Novemba gosiri Basil ka ọ kwụ n'akụkụ ọdọahịa ebe a na-ere 'hardware', a kpọchiri mpio ọdọaghịa ahụ.
Mgbe ndịagha Izrel bịarutere, ndị nwe ọdọahịa mechiri ngwangwa na Jenin - bụ ebe ndị Palestinia, ọ dịghị ka Gaza nke Hamas na-achịkọta.
Ndị akaebe kwuru na egbe na-ada dịka ndịagha Izrel nọ ọrụ na mpaghara ebe ndị gbara ọsọ ndụ dị na Jenin.
Adam, onye egwu bọọlụ na-amasi ma bụrụ onye nkwado ọgbabọọlụ 'Lionel Messi', na nwanne ya nwoke tọrọ ya bụ Baha dị afọ 14.
E nwere ihe dịka ụmụaka ụmụnwoke itoolu ndị ọzọ a hụrụ n'ihe onyonyo CCTV nke gosiri ihe mere.

Isi n'elyu lee okporoụzọ dị na Jenin, ị ga-ahụ ebe Basil, Adam na ụmụaka ndị ọzọ kwụ.
I lepụga anya ọzọ, ị ga-ahụ ụgbọala ndịagha Izrel dị isii kwụkọtara ọnụ ka ha tụgharịrị n'otu akụkụ, nyara na-aga ebe ụmụaka ahụ nọ, bụ ndị nọgharịwara. Ụfọdụ ụmụaka ndị ahụ malitere pụwa.
Ozigbo, ihe onyonyo si n'ekwentị gosiri ka ọnụụzọ otu ụgbọagha ahụ mepere.
Onyeagha ahụ nọ n'ihu ụmụaka ụmụnwoke ndị ahụ.
Basil gbagara n'etiti okporoụzọ, ebe Adam bụ onye nọ ihe dịka mita 12 site n'ebe ndịagha ahụ nọ gbawara ọsọ.
Ihe dịka ọnụ egbe 11 gbara.
Ka BBC nyochara ebe ahụ ihe mere, ha hụrụ na mgbọ ahụ tụrụ ebe buru ibu.
Mgbọ anọ tụrụ n'okporo igwe(( metal pole), abụọ tụrụ na mpio ọdọ ebe a na-ere 'hardware', otu mgbọ tupuru azụ ụgbọala e dọwara ebe ahụ, ọzọ tupuru igwe a na-ejide aka aga( handrail.)

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mgbọ ọzọ tụrụ Adam gbara afọ asatọ n’isi dịka ọ na-agba ọsọ; nwanne ya nwoke bụ Baha gbalịrị ịkpụrụ ya ka ha zoo, ma na-eti mkpu ka ụgbọala gbatagbata gbatara ha ọsọ enyemaka.
Ọbara juru n’ala ebe o si kpụrụ nwanne ya agaje.
Mana oge agaala, Baha kwuru na Adam na enyi ya Basil nwụrụ n’ihu ya.
Baha ji Anyammiri gwa BBC sị, “Anọ m n’ọnọdụ mgbagwoju anya; anaghịdị m eche maka onwe m. Agbalịrị m gwa ya okwu . M na-akpọ ya: ‘Adam, Adam!’. Mana mkpụrụọbi ya apụwala n’ahụ ya, ọ zaghị m.”
Tupu a gbaa ya egbe, Basil nwere ihe o ji n’aka.
O doghị anya ihe ọ bụ. IDF mechara wepụta foto ha sere ebe ihe mere sị na o ji ogbunigwe n’aka ya.
Onye ọrụ pụrụ iche n'okwu ikike dịịrị onye na agha megide iyi ndụ egwu bụ Ben Saul, kwuru na e kwesịrị ịjụ ọtụtụ ajụjụ na ụdị aka ike e ji gbuo Basil ekwesịrị ekwesị, ma o ji ogbunigwe n’aka?
N’okwu nke Adam, ihe a dịka imegide iwu mbaụwa, igbu ndị nkịtị, mpụ agha nakwa imegide ikike mmadụ nwere ịdị ndụ.”
Dkta Lawrence Hill-Cawthorne, so na ndị hiwere ngalaba ‘ Centre for International Law ‘ na mahadum ‘University of Bristol’, sịrị: "Ndịagha nọ n’ụgbọ agha. Ọ bụrụgodi na e nwere ihe nwere aka mgba dịrị ndị ndịagha ahụ, ha kara ị buru ụgbọala ha pụọ, ma haazie nnwuchi kama iji nnukwu aka ike, nke megidere iwu mbauwa.”
Ndịaghga Izrel(Israel Defence Force(IDF) kwuru na ụmụaka ahụ na-achọ ịtụ ha ogbunigwe, nke gaara etinye ndịagha ah ụ n’ihe egwu.











