Iran vs Israel: Kedu onye ngwa agha ya kaa?

Onyeisiala Iran, Ali Khamenei na Praịm Minista Izrel, Benjamin Netnayahu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Iran, Ali Khamenei na Praịm Minista Izrel, Benjamin Netnayahu
    • Onye dere ya, By Arif Shamim
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News Urdu & BBC News Persian

Ndị ọrụ gọọmentị mba Amerịka agwala ndị ntaakụkọ na ndị Izrel a tụọla otu ogbunigwe na mba Iran.

Ndị mmadụ nụrụ ụda ogbunigwe ahụ na mpaghara Isfahan, mana e nweghị onye maa ebe e zigara ya.

Iran nọ na nche kemgbe Izrel kwuru na ha ga-azaghachi mwakpo ndị Iran wakporo ha n'abalị Satọde mgbe ha tụrụ ogbunigwe ruru 300 maka mbuso agha megide Izrel.

Ndị ntaakụkọ Iran na ndị ụlọọrụ 'International Atomic Energy Agency' (IAEA) ekwubeghị na-enwere mmetụta ọ bụla site na ogbunigwe ahụ a tụrụ ụbọchị Fraịde.

Isfahan, di n'ógbè ahụ ogbunigwe ahụ dara, nwere ụtụtụ ọdụ ụgbọ elu, ebe a na emepụta ngwa agha nuklia.

Ụlọọrụ mgbasa ozi Fars nke Iran nke dị nso na Islamic Revolution Guard Corps (IRGC) kwuru na ha nụrụ ụda ogbunigwe ahụ.

Osote onye na-ahụ maka mba ofesi Iran bụ Ali Bagheri Kani kwuru na ha ga-ebuso Izrel agha n'oge na adịghị anya.

Onyeisi ndịagha Izrel Lt Colonel Herzei Halevi e kwubuola na ha ga atụ ogbunigwe n'Iran maka mwakpo ahụ ha wakporo ha na 13 Eprel.

Nke a bụ ihe ọzọ na-eme agha ahụ dị n'etiti Izrel a D Iran

Ozi kwuru n'aka Izrel dị n'agha ahụ Gaza.

Ngosipụta Ngwa agha Iran

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ngwa ngwa Iran bụ otu bụ otu ike ndị agha ha

Kedụ mba ngwa agha ha kachasị?

Ụlọọrụ BBC jiri ndepụta a tụlee ajụjụ a na-agbanyeghị na mba ndị a nwere ike ị nwe ngwa agha ha zoro ezo.

Ụlọọrụ 'International Institute for Strategic Studies' (IISS) tụlere ngwaagha mba abụọ ahụ site n'ozi ndị oru gọọmentị ị ji chọpụta ndị ngwaagha ha ka.

Ụlọ mmụta 'Stockholm International Peace Research Institute' weputara nkọwa nke ha.

Mana, Nicholas Marsh, onye ọrụ ụlọ mmụta 'Peace Research Institute' di n'Oslo (PRIO) kwuru na ọ bụ ndị nnyocha IISS nwere ike ị chọpụta mba kacha nwe ngwa agha n'ụwa niile.

Ihe ngosipụta ọnụọgụgụ Izrel na Iran, Gross Domestic Product (GDP), ego nchekwa ndị agha (pasent 4% bụ maka Izrel, pasent 2% bụ maka Iran)

IISS kwuru na Izrel na-etinye nnukwu ego maka nchekwa karịa Iran, nke na-enye ha ike maka ihe ọbụla nwere ike ime.

IISS kwuru na ego nchekwa Iran dị ihe dịka ijeri $7.4 n'afo 2022 na 2023, ebe nke Izrel ruru ijeri $19.

Ụgbọelu F-35 plane

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ugbọelu agha F-35 bụ nke kachasị n'uwa niile

Uru teknụzụ

Ọnụọgụgụ IISS na-egosi na Izrel nwere ụgbọelu ndịagha ruru 340 dị njikere agha.

Ọ bụ ya na-enye ha nkasiobi maka agha ụgbọelu.

Ụgbọelu ndị ahụ gụnyere ụgbọelu F-15 bụ ndị na-aga ebe dị anya, F-35 - bụ ụgbọelu teknụzụ "stealth" nke nwere ike izo ezo.

IISS kwuru na Iran nwere ụgbọelu ruru 320 dị njikere agha. Ụgbọelu ndị a bụ ndị a rụrụ n'afọ 1960, gụnyere F-4, F-5 na F-14 (ụgbọelu nke ikpeazụ bụ nke ihe onyonyo 'Top Gun' e mepụtara n'afo 1986 mere ka o wuo ewu).

Mana Nicholas Marsh si ụlọọrụ PRIO kwuru na o doro anya na ụgbọelu ndị ochie ahụ na-efe, maka ịchọta maka na akụrụngwa ya dị ụkọ.

.

F-14 ka-eji mee ihe onyonyo ‘Top Gun’ n’afọ 1986

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị agha mmiri Amerịka gbara F-14 Tomcat n’afọ 20 gara aga mana Iran ka ji ya anụ agha

Igwe 'Dome' na Ụta

Nke a bụ akụkụ kacha banyere nchekwa Izrel akụrụngwa 'Iron Dome na Arrow' ha.

Injinia ogbunigwe bụ Uzi Rubin bụ onye chọpụtara 'Israel Missile Defense Organisation' nke ministri ọrụ nchekwa.

Ugbu a, ọ bụrụla onye nnyocha n'ụlọọrụ 'Jerusalem Institute for Strategy and Security'.

Ọ gwara BBC n'obi jụrụ ya mgbe ọ hụrụ Iron Dome nke gbaturu ogbunigwe ahụ Iran tụrụ ha na Satọde izu ụka gara aga.

"Enwere m afọ ojuju na obi ụtọ dị ukwuu... Ọ bụ nnukwu ihe ka ọ bu. Ọ nweghị akụrụngwa agha ọzọ dị ka ya.

Mgbochi ogbunigwe a gbara n'elu Israel

Ebe foto si, Amir Cohen / Reuters

Nkọwa foto, Ngwaagha Iron Dome mba Izrel nyere aka ibibi ogbunigwe karịrị 300 ndị Iran gbara n’ịzu ụka gara aga

Kedu ihe dị anya n'etiti Iran na Israel?

Izrel ji 2,100km tee aka n' Iran.

Map na-egosi Iran, Izrel na ndị agbata obi ha

A na-ahụ ngwaagha Iran dị ka nke kachasị ukwuu na mpaghara Middle East.

N'afọ 2022, Generalụ Kenneth McKenzie sitere Central Command mba Amerịka kwuru na Iran na-enweta ngwaagha ballistic "karịrị 3,000".

Dị ka CSIS Missile Defence Project' si kwuo, Izrel na-eziga ngwa agha n'ọtụtụ ebe.

Ogbunigwe Iran gbara Izrel

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Iran gbara ogbunigwe ruru 300 na Israel ụbọchị Satọde 13 Eprel

Ogbunigwe na drone mba Iran

Iran ruru ọrụ dị ukwuu na sistemu ogbunigwe na drones ha kemgbe agha ya na Iraq n'afo 1980 ruo 1988.

Ha mepụtara ọtụtụ ngwa agha bụ nke ha tụrụ izrel nso nso a.

Ndị nnyocha nyochara mgbọ ogbunigwe ndị ahụ wakporo Saudi Arabia kwuru na ọ bụ Iran rụrụ ya.

Ụlọ ndị nnọchianya ogbunigwe mebiri

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Mwakpo ụgbọelu nke Eprel 1 mebiri otu ụlọ ndị nnọchianya Iran na Syria, gbuo ndị isi ndị agha Iran

'Ntaramahụhụ' site na mwakpo

Tim Ripley kwuru o bụ naanị ọgụ ụgbọelu ka Izrel were ike ịnụ so Iran.

Ripley kwuru na nke a ga-egbu ndị isi ma kwatuo ụlọọrụ mmanụ.

Ndị isi agha na ndọrọndọrọ ọchịchị Izrel kwuru na ha ga-emesị mba ọbụla na e-megide ha ike.

Na mbụ, Izrel egbuola nnukwu ndịagha Iran n' ọtụtụ ndị mmadụ n'Eprelụ 1 mana Izrel gọnarịrị mwakpo ahụ.

Foto Ụgbọmmiri ndị agha Islamic Revolutionary Guard Corps (IRGC) na Abu Musa Island, 2 Ọgọst 2023

Ebe foto si, IRGC handout / Reuters

Nkọwa foto, Ụgbọ agha mmiri Islamic Revolutionary Guard Corps (IRGC) dị na Abu Musa Island

Ndị ọrụ agha mmiri

Ngwaagha mmiri Iran dị 220 ebe nke Izrel dị 60 dị ka IISS si kwuo

Otu nwoke nọ n’ihu ụgbọmmiri agha ‘Sa’ar 6’ nke Izrel nke German mere nke rutere n’ọdụ ụgbọ mmiri Eilat nke Oké Osimiri Uhie na 16 Eprel 2024.

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, IISS kwuru na ụgbọ agha mmiri Izrel di 60

Mwakpo cyber

Ọ bụ Izrel ka mwakpo cyber ga-aka nwenta

Igwe nchekwa Iran adịchaghị ka teknụzụ nke ndị Izrel.

Ndị ọrụ Israel National Cyber ​​Directorate kwuru na mwakpo cyber kariri karịa ugbua.

Akụkọ kwuru na mwakpo cyber dị 3,380 mere na mwakpo Ọktoba 7 afo 2023.

Onye isi otu Iran Civil Defence Organisation, Brigadier General Gholamreza Jalali kwuru na Iran kwụsịrị ihe mwakpo cyber ruru 200 n'ime ọnwa ole na ole tupu ntuli aka ndị omeiwu.

N'ime ọnwa Disemba, Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ na Iran, Javad Owji, kwuru na otu mwakpo cyber kpatara nsogbu maka ọdụ mmanụ ụgbọ ala n'obodo ahụ.

Onyeisi mba Iran n’afo 2008, Mahmoud Ahmadinejad gara na ụlọ ọrụ Natanz uranium na 8 Eprel 2008 nke dị kịlomịta 300 km na ndịda Tehran

Ebe foto si, Iranian goomentị / Getty Images

Nkọwa foto, N'afọ 2008, onye bụbu onye isi ala Iran Mahmoud Ahmadinejad kwupụtara na ha ga-abawanye mmepụta nke uranium maka ụlọ ọrụ nuklia Natanz.

Ihe iyi egwu nuklịa

Akụkọ na-ekwu na Izrel nwere ngwaagha nuklia nke ha mana ha achọghị imee ka a mara.

A na-ekwu na Iran e nweghị ngwaagha nuklia.

Otu ngwa agha ballistic na otu nwoke guzoro n'akụkụ ya- ngwa agha buru ịbu

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ngwa agha ballistic n'ikpere mmiri nke Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ, ka Iran gbara ogbunigwe na megide Izrel na Satọde.

Geography na igwe mmadụ

Ọnụọgụgụ Iran dị nde mmadụ iri asatọ na itoolu '89 million'. O karịrị nke mba Izrel dị nde mmadụ iri '10million'

Iran nwere ndị agha ruru 600,000 ebe ndị agha Izrel di 170,000 dị ka IISS si kwu.

Ihe fọrọ n'ụgbọelu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mba Amerịka boro Iran ebubo na ha na-enye ndị nnupụisi Houthi ụgbọelu ndị Yemen

Kaadị Iran

Onye ọrụ ihe gbasara mpaghara ọnwụnwa anyanwụ 'bụ Tariq Sulaiman gwara BBC Urdu na agha nwere ike ịbawanye.

Nnyocha mahadum Hibru gosiri na ìgwè mmadụ Izrel achọghị ka Izrel na Iran lụọ ọgụ n'ihi na ọ ga emetụta nyocha n'mahadum ahụ ya na nchekwa obodo.

Otu nkwupụta mahadum ahụ kwuru na emere nyocha a n'abalị 14 na 15 Eprel site na ịntanetị na ekwentị yana nlele mmadụ 1,466 ndị gụnyere ndị Juu na ndị Arab.

Ndị agha nnupụisi Houthi meghere ọnụ ụzọ otu ụgbọ mmiri

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị agha Houthi wakporo otu ụgbọmmiri mba Brịtain na ndị Japan na-Oké Osimiri Uhie na 19 Nọvemba 2023

Kedụ ihe bụ Izrel na Iran ji ndị ọzọ alụchitere onwe ha ọgụ?

Ọ bụ ezie na Izrel na Iran anaghị alụ agha ọbụla ruo taa, mana obodo abụọ a na-abanye n'ọgụ na-akwadoghị.

E gburu ndịagha Iran dị mkpa n'mwakpo a na-enyo na ọ bụ Izrel kwadoro ya.

Ndị otu Hezbollah na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-alụ ọgụ kacha nke Iran na-ebuso Izrel agha site na Lebanọn.

Izrel na ndị mba Ọdịda Anyanwụ kwenyere na Iran na-enye Hamas ngwaagha na ọzụzụ.

Ndị agha Houthi tukwuru na gburugburu otu ọkọlọtọ

Ebe foto si, Ndị agha Houthi / EPA

Nkọwa foto, Ndị agha Houthi na-akwado ọgụ dị n'Oké Osimiri Uhie

A na-ahụta ndị Houthis ndi Yemen dị ka ndi nnọchianya ndịagha Iran. Saudi Arabia kwuru na ogbunigwe ndị Houthi gbara bụ Iran mepụtara ya.

Otu ndị Iran na-akwado nwere nnukwu ike n'Iraq na Syria.

Iran na-akwado gọọmentị Syria ma kwuo na ha ji mpaghara Syria wakpo Izrel.

Nkwupụta ndị ọzọ nke Ahmen Khawaja, Carla Rosch na Reza Sabeti na Chris Partridge