Hamas kwuru na ha ga-atọhapụ ozu ndị e ji eji nke gụnyere ezinaụlọ Bibas

Onye ngagharị iwe ji akara na-akpọ oku ka a tọhapụ Shiri Bibas na ụmụ ya Kfir na Ariel

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụmụaka Bibas bụ Kfir na Ariel ndị Hamas tọọrọ gaa Gaza
    • Onye dere ya, Gabriela Pomeroy
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị Hamas kwuru na ha ga-enyefe mba Izrel ozu mmadụ anụ ndị e ji eji n'ụbọchị Tọzde 20 Febụwarị. Ozu ndị ahụ gụnyere ụmụaka abụọ ndị otu ndịagha Palestine jidere.

Onye na-ahụ maka mgbasaozi otu ahụ bụ Khalil al-Hayya kwuru na ozu ndị ahụ gụnyere ezinaụlọ Bibas bụ Shiri na ụmụaka ya bụ Kfir na Ariel dị ọnwa itoolu na afọ anụ oge ndị Hamas tọọrọ ha oge ha wakporo mba Izrel na 7 Ọktoba 2023.

Ndị Hamas na-ebo ebubo na mmadụ atọ n'ime ha nwụrụ mgbe Izrel tụrụ ogbunigwe mana ndị Izrel ekwubeghị ma nke a ọ bụ eziokwu.

O kwuru na ndị Hamas tọhapụrụ nna ụmụaka ahụ bụ Yarden na mbido ọnwa a.

Al-Hayya gara n'ihu kwuo na ndị Hamas ga-atọhapụ mmadụ isii ndị ọzọ e ji eji dị ndụ ụbọchị Satọde.

N'aka nke ọzọ, ndị Izrel ga-atọhapụ ụmụnwaanyị niile na ndị erubeghị afọ iri na itoolu anwụchiri kemgbe ọnwa Ọktoba.

Ha ga-ekwekwa ka e buru akụrụngwa na-ekpocha ihe gafee na Gaza site n'okeala ha na Ijipụt.

Al-Hayya kwuru na otu ahụ kwetara inyefe ozu mmadụ anọ ndị eji na mkpọrọ ụbọchị Tọzde 20 Febụwarị nke gụnyere ozu ndị ezinaulọ Bibas.

Ndị Hamas kwuru n'ọnwa Nọvemba 2023 na ndị ahụ nwụrụ mgbe ndị Izrel tụrụ ogbunigwe mana ha enyeghi ihe akaebe.

Otu onye ọchịchị Izrel gwara Reuters na a ga-enyocha ozu ndị ahụ iji mara ha tupu akpọọ ha aha.

Mana ozi ndị ezinaụlọ Bibas wepụtara kwuru: "N'ime awa ole na ole gara aga, anyị nọ n'ọgba aghara n'ihi nkwupụta ọnụ na-ekwuchitere Hamas maka atụmatụ iweghachi ozu Shiri anyị, Ariel na Kfir na Tọzde a dịka ha na-atọhapụ ndị eji eji.

Omer Shem Tov, 22

Ebe foto si, Hostages and Missing Families Forum

Nkọwa foto, A tọọrọ onye Izrel bụ Omer Shem Tov dị afọ iri abụọ na abụọ mgbe a na-eme emume Nova Festival na 7 Ọktoba 2023. Ezinaụlọ ya na-atụ anya na-aga atọhapụ ya na Satọde.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ha kwuru na ha enwetabeghị ozi si n'aka ndị ọchịchị banyere akụkọ kwuru na ndị Hamas ga-enyefe ozu ndị nke ha.

"Ruo mgbe anyị nwetara ozi doro anya, njem anyị akwụsịbeghị."

Hamas akpọọla aha ndị Izrel abụọ n'ime mmadụ isii ha ga-atọhapụ n'ụbọchị Satode.

Ha gụnyere Avera Mengistu na Hisham al-Sayed bụ ndị ejidere n'afọ 2014 na 2015 dịka ha gafere Gaza na nke onwe ha. Gọọmentị Izrel ekwuola na mmadụ abụọ ndị ahụ nwere nsogbu ahụike uche n'oge ahụ.

Ọtụtụ ndị ezinaulọ ndị e ji eji kwuru na ndị ha hụrụ n'anya so na ndị ekwesịrị ịtọhapụ n'ụbọchị Satọde.

Ha bụ Omer Shem Tov dị afọ iri abụọ na abụọ, Eliya Cohen dị afọ iri abụọ na asaa, na Omer Wenkert dị afọ iri abụọ na atọ, bụ ndị ejidere mgbe a na-eme emume Nova Festival na 7 Ọktoba 2023 ya na otu onye dị afọ iri anọ bụ Tal Shoam atọọrọ na Kibbutz Be'eri.

N'okpuru usoro mbụ nke nkwekọrịta ịkwụsị ọgụ, Hamas kwetara ịtọhapụ ndị mmadụ iri atọ na atọ eji eji. Na ngbanwe, ndị Izrel kwetara ịtọhapụ ihe dịka ndị mkpọrọ Palestine mmadụ otu puku na narị itoolu.

Mkparịtaụka maka ịga n'ihu imezu ihe dị n'usoro nke abụọ nke nkwekọrịta ahụ - a ga-ahapụ ndị e ji eji fọdụrụ dị ndụ ya na-ịhụ n'agha ga-akwụsị kpamkpam – nke kwesịrị ịmalite na mbido ọnwa a mana amalitebeghị ya.

Hamas ekwuola na ọ dị njikere ịtọhapụ ndị niile e ji eji n'otu oge na nkeji nke abụọ nke nkwekọrịta ịkwụsị ọgụ nke ha na Izrel.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị Hamas mere ka o doo anya na imezu ịtọhapụ ihe karịrị mmadụ iri isii ndị eji eji dabere na ndịagha Izrel iwepụ aka na Gaza na nkwekọrịta maka iwete agha na njedebe.

Hamas jụkwara ọchịchọ ndị Izrel maka ịchụpụ na iwepụ ya na Gaza.

Mịnịsta mba Izrel na-ahụ maka mmekọ mba ofesị bụ Gideon Saar kwuru na mkparịtaụka nke a ga amalite n'izu a.

O kwuru na Izrel agaghị ekwe ka ndị Hamas maọbụ ndị nnupụisi ọzọ weghaara Gaza mana ndị Izrel were ike ịgbatị mkparịntaụka maka nkwụsị ọgụ a ma ọbụrụ na okwu amịtaghị mkpụrụ.

Saar kwuru, "Ọ bụrụ na anyị ga-ahụ na enwere mkparịtaụka bara uru nke nwere ike ịnweta nkwekọrịta (mgbe ahụ) anyị ga-eme ka oge a rụọ ọrụ ogologo oge."

E ji ihe ruru mmadụ iri asaa na atọ na Gaza ugbu a nke gụnyere ndịagha Izrel na ndị nkịtị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Nke gụnyere ụmụamaala mba Thai na Nepalese.

Ndị Hamas jidere ihe dịka mmadụ narị abụọ na iri ise na otu (251) mgbe ọ wakporo Izrel na 7 Ọktoba 2023, gbuo ihe dịka mmadụ otu puku na narị abụọ (1,200).

Izrel zaghachiri na mwakpo ndịagha ruru ọnwa iri na ise nke gburu ndị Palestine mmadụ 47,460, dịka ụlọọrụ ahụike ndị Hamas na Gaza si kwuo, ma bibie ogige dị nso n'oke osimiri.