Ugboro ole awakporola ndị nkwado pati dị iche iche n’akụkụ Naịjirịa

Ebe foto si, Twitter
Dịka ntuliaka 2023 ji ọsọ abịa, pati dị iche iche malitere achụmta vootu ha kemgbe ọnwa Sepụtemba mana kwa izuụka, a na-anụ akụkọ gbasara etu ndị ekperima na ndị agboro si awakpo ụfọdụ ndị nkwado pati dị icheiche.
N'ọdị nso a ụdị mwakpo a dịka akụkọ si gosi, emetụtala ndị nkwado Labour Party, ebe ndị otu Peoples Democratic Party enyekwala mkpesa maka ya.
Iji maa atụ, akụkọ pụtara na ngwụcha izu gara aga na ndị agbaro wakporo otu onye Labour Party ebe ọ na-amado akwụkwọ mgbasaozi pati ahụ n’okpuruọchịchị Atakunmosa dị n'Osun steeti ma were mma merụọ ya ahụ.
Rabiu Ismaila bụ onue a sụrụ mma a, nọ n’ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ ugbua.
Nke a na-abịakwa dịka ụfọdụ ndị nkwado pati ahụ n’akụkụ Owode, Igangan nakwa Olopon n’akụkụ Ọdịda anyanwụ Naịjirịa.
Leekwa ebe ndị ọzọ akụkọ mwakpo dapụtarala megide ndị nkwado Labour Party
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Flag Boy na Legọs

Ebe foto si, Obiflagboy/Twitter
Otu nwaamadị a ma ama na soshal media dịka Flagboy nakwa otu ogbo ya danyere n’aka ndị agboro bụ ndị wakporo ha oge ha na-ebugharị ọkọlọtọ Labour Party na mpaghara Oshodi, Legos steeti.
Nke a mere n’ọnwa Ọktoba, 2022.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Benjamin Hundeyin, gbara ama nke a ma kwuo na ha ga-ama imi n’ala nyochapụta ndị mere ihe a ma nye ha ntaramahụhụ dịrị ha.
E kwuru na ndị agboro ahụ tiri mmadụ abụọ a ihe ma chọọ imunye ha ọkụ tupu otu onye agha nọ nso ebe ahụ agbatara ha ọsọ enyemaka.
Victoria Chintex na Kaduna
Ndị ojiegbe wakporo ụlọ otu nwaanyị aha ya bụ Victoria Chintex n'ụbọchị Mọnde, Nọvemba 28, na Kaduna, ma were egbe gbagbuo ya n’ime ụlọ ya.
Nwaanyị a bụ onyeisi ngalaba ụmụnwaanyị na Labour Party n'okpuru ọchịchị ya bụ Kaura na Kaduna steeti.
Amabeghi ndị bụ ndị ojiegbe ahụ nakwa ihe bụ ebumnobi ha, mana onyonyo pụtara n'ịntanetị gosiri ebe nwaanyị ahụ na-agbasa ozi maka Labour Patị.
Chetakwa na enweela ọtụtụ mwakpo ndị ojiegbe na mpaghara dị icheiche na Kaduna.
Ọtụtụ na-arụ aka na ogbugbu Oriakụ Chintex bụ njịkọ ọrụ ya na otu Labour Party, mana ndị uweojii ekwubeghị kpọmkwem ihe kpatara ya.
Ndị ojiegbe ahụ gbakwara di Victoria Chintex egbe, mana ọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mwakpo ndị otu Labour Party n’Enugu
Enugu steeti abụrụla steeti akụkọ mwakpo nakwa nkụsa ọgbakọ ndị otu Labour Party na-esikarị apụta.
Akụkọ mwakpo dapụtara na steeti ahụ n’ọnwa Sepụtemba dịka e kwuru na ụmụ okorobịa wakporo otu ọgbakọ ndị Labour pati n’okpuruọchịchị Nkanu East.
N'ọnwa Ọktoba, akụkọ ọzọ pụtakwara na ndị ojiegbe wakporo ndị Labour pati n’obodo Umuida, nke okpuruọchịchị Igbo-Eze North na steeti ahụ n’Ọktoba.
Ndị ojiegbe a gbara egbe aghara aghara iji chụsaa ndị nọ n’ọgbakọ ahụ ma gbaa ọtụtụ ụgbọala nọ ebe ahụ ọkụ.
Akụkụ Enugwu steeti ndị ọzọ ebe a wakporola ndị Labour Pati n'ọgbakọ ha gụnyere Aninri, Awgu nakwa Oji River.
Gịnị ka gọọmentị na-eme maka nke a

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Na izu gara, onye ndụmọdụ gọọmentị etiti n’ihe gbasara nchekwa bụ Babagana Monguno dọrọ ndị gọvanọ steeti dị iche iche aka na ntị ma kwuo ka ha chee aka ghọrọ ya na ndị ọrụ nchekwa banyere atụmatụ iji ndị agboro akụsa achụmnta vootu ndị pati ọbụla na Naịjirịa.
Monguno kwuru nke a iji saa okwu na ụfọdụ ndị gọvanọ na-ehibe usoro na-egbochi ndị patị ọzọ na-anọghị n’ọchịchị na steeti ime mgbasaozi nakwa achụmnta vootu na steeti ha.
Omụmaatụ, akụkọ pụtara n'ọnwa Ọktoba 2022, etu ndị uweojii si were anwụrụ ose chụsaa ndị nkwado Labour pati na-eme ngagharị nkwado maka Peter Obi n'Abakiliki.
Otu Labour Party katọrọ ụdị aka ike a ma kwuo na ọ bụ mmaja ka a na-amaja ndị nkwado ha, mana Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti kwuru na ọ bụ n'ihi nnupu isi kpatara ndị ọrụ nchekwa ji chụsaa ndị nkwado 'Labour Pati'.
Ọ bụghị naanị Labour Party natarala mwakpo n’oge achụmnta vootu a.
Akụkọ pụtara n’ọnwa Nọvemba na ụfọdị ndị ntorobịa wakporo Atiku Abubakar nke People’s Democratic Party (PDP) oge ọ gara njem ịchụ nta vootu na Maiduguri, Borno steeti.
E kwukwara na ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ ebe a kụsara ọtụtụ ụgbọala ndị nọ ebe ahụ.
Ndị uweojii katọrọ ihe a mere dịka ha kwuru na ha ehibela otu ga-ama imi n’ala nyochapụta ndị mere ya bụ mwakpo.
Akụkọ ọzọ pụtakwara n’otu ọnwa ahụ na ndị agboro wakporo ndị nkwado PDP n’ọgbakọ ha n’okpuruọchịchị Omuma na Rivas steeti.
E kwuru na a wakporo ndị a ebe ha na-amado akwụkwọ mgbasaozi Atiku Abubakar ebe ahụ.
Chetakwa na ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) wepụtara iwu ga-achịkọta achụmnta vootu nke afọ na-abịa abịa.
Otu n’ime iwu ha bụ na ndị pati ọbụla agaghị eji ndị agboro rụọ ọrụ achụmta vootu ọbụla n’akụkụ Naịjirịa.
Ha bụpụtara ịda nha nakwa ntaramahụhụ ga-adịrị pati ọbụla e jidere na-eme nke a.










