Anyị agaghị agbakọta okwu mkpezi azụ - Ndị gọvanọ G5 nke PDP

Ebe foto si, GovWike
Ndị gọvanọ ise n'ime Peoples Democratic Party (PDP) na-akpọ onwe ha G5, ekwuola na ha agaghị agbakọta okwu gbasara mkpezi esemokwu dị na pati ha azụ.
Ndị gọvanọ a gụnyere Nyesom Wike nke Rivas steeti, Seyi Makinde - Oyo, Samuel Ortom - Benue, Okezie Ikpeazu - Abia na Ifeanyi Ugwuanyi - Enugu, kwuru nke a ka ha batara Legọs n'ụbọchị Sọnde, 18 nke ọnwa Nọvemba, 2022, ebe ha nọ hibe otu ha kpọrọ 'Integrity Group'.
Ka ha mechara ọgbakọ imeụlọ ha bịara, Jonah Jang bụbu gọvanọ Platu steeti, gwara ndị ntaakụkọ okwu, ebe ọ nọ kwuo na ha agaghị agbakọta okwu gbasara mmezi esemokwu dị na pati ha azụ.
Jang sị "Na nzukọ a, anyị atụleela nsogbu dị na pati anyị. Anyị ekpebiela ịkwụdo na mkpebi ndị anyị mere na nzukọ nke anyị mere na Pọtakọt. Anyị na-ekwukwa ọzọ na ohere maka mmezi esemokwu dị na pati anyị ka dị."

Gọvanọ Makinde kwuputere tupu e mechaa nzukọ ahụ, maka nhibe otu ha kpọrọ 'Integrity Group', dịka o kwuru na ọ bụ otu ahụ bụ ndị bụ na e nwere ndọrọndọrọ n'ime PDP.
O kwuru sị "Anyị nọ ebe a n'ụtụtụ a ime nzukọ ndị Integrity Group n'ime pati anyị bụ PDP. Ị nụla maka G5 nke bụ ndị gọvanọ ise na PDP.
"G5 bụ maka Integrity Group. Ị ga-ahụta anyị bụ ndị gọvanọ ise nọ n'ọkwa ugbua, dịka ihu ndọrọndọrọ a (na-eme na PDP) mana ndị ndu nakwa ndị okenye pati a ị na-ahụ ebe a bụ ndị kwadoro ihu ndị ahụ ị na-ahụ.
"Anyị nọ na mpaghara Ọdịda Anyanwụ n'ụtụtụ a ilebanye anya na nsogbu dị na pati anyị, iṅogharị ebe anyị nọ ma lekwaa anya n'ihe ga-eme na ntuliaka na-abịa."
Ndị ọzọ bịara ya bụ ọgbakọ bụ nke e mere n'ụlọ Bode George bụbu osote onyeisi otu pati ahụ, gụnyere Donald Duke bụbu gọvanọ Krọs Riva steeti, Ayo Fayose bụbu gọvanọ Ekiti steeti, Sinetọ Mao Ohuabunwa, Sinetọ Nasif Suleiman nakwa Taofeek Arapaja bụ osote onyeisioche PDP, na Ichie Dan Orbih.
Ọgbakọ a na-abịa ka ọnwa abụọ ha mechara mkpebi na Pọtakọt na ha agaghị esonye n'achụmnta vootu maka ọkwa onyeisiala nke Atiku Abubakar ji ọkọlọtọ ha azọ, gachara.









