PDP BOT meeting: Udo bụ ihe kacha mkpa - Wike

Ebe foto si, Governor Nyesom Wike
Aka na-achị Rivas steeti bụ Gọvanọ Nyesom Wike, ekwuola na udo bụ ihe kacha mkpa n'okwu gbasara nsogbu ha na-enwe na pati ha bụ Peoples Democratic Party (PDP).
O kwuru nke a ka ya na ndị isi a hụrụ kwaba okpu na pati ahụ a kpọrọ Board of Trustees (BOT) mechara nzukọ ime ụlọ n'obi gọọmentị ya na Pọtakọt, Rivas steeti, n'ụbọchị Tuzde, Ọktoba 4, 2022.
Gọvanọ Wike kwuru sị "Ihe kacha mkpa bụ ka udo dịrị. Anyị dị n'otu. Enwere m olileanya na anyị ga-edozi esemokwu anyị n'ihi na adị m ndụ.
"Naanị onye dị ndụ nwere olileanya. Anyị ekwuola ya ugboro ugboro na anyị agaghị esi na PDP pụọ. Anyị nwere nkwenye na a ga-edozi ihe na-esere anyị."
N'otu aka ahụ, Adolphus Wabara na-arụ dịka onyeisioche otu BOT pati PDP, kwukwara na olileanya dị site na nkata ha kpara na ya bụ nzukọ.
O kwuru sị "Anyị akabeghi okwu a ọnụ, ikpe udo adịghị mfe, mana anyị egeela ya ntị mara ebe o si abịa.
"Ezinụlọ a ka bụ otu. Udo ga-adị n'oge adịghị anya."
Ihe dị ọkpụrụkpụ merela kemgbe esemokwu a malitere
- Walid Jibrin, bụbu onyeisi BOT ahụ bu ụzọ wụsa ọwa, dịka ọ sị na n'ezie ọ dịghị mma ka onye ji PDP azọ ọkwa onyeisiala na onyeisi pati ahụ si otu mpaghara.
- A họpụtara Adolphus Wabara dịka onye na-arụ dịka onyeisi BOT
- Gọvanọ Wike na ndị nkwado ya gụnyere Chief Olabode George, Sinetọ Jonah Jang na Gọvanọ Seyi Makinde, kwuputere n'ụbọchị 20 nke ọnwa Septemba 2022, na ha enweghi mmasị iso n'otu ndị na-ahazi achụmnta vootu Atiku Abubakar na-anọchite anya PDP na ntuliaka 2023.
- Wike na ndị otu ya ahụ ekweghikwa aga nzukọ ụbọchị e hibere ya bụ otu achụmnta vootu n'ụbọchị 28 nke ọnwa Septemba 2022; iwe ha bụ na mmadụ abụọ si n'otu mpaghara (ndị Ugwu) ekwesịghị ịnọ n'isi pati ahụ.
Iwe m ebe Atiku nọ - Wike

Ebe foto si, Abubakar Atiku/Nyesom Wike
Gọvanọ Nyesom Wike zọro ọkwa ife ọkọlọtọ PDP na ntuliaka 2023, kwuburu na obi adịghị ya mma n'akụkọ nke na-efegharị banyere ya na Atiku Abubakar bụ onwe nwetara ọkọlotọ ahụ na ntuliaka PDP nwere n'abalị 27 nke ọnwa Mee afọ 2022.
N'ozi o wepụtara n'ụbọchị Fraide, Wike kwuru na o nweghị mgbe Atiku maọbụ ndị na-etiri ya mkpu bịara be ya maọbụ kpọọ ya n'ekwentị sị ya ghara.
O boro ebubo na kama nke a, na Atiku gbara nkịtị ndị otimkpu ya na-akparị ya n'akwụkwọ akụkọ nakwa ebe ndị ọzọ.
O kwuru na oge rue, na ya ga-akọrọ ụwa ihe nile mere kpọmkwem iji gbaa eziokwu n'anwụ na asị nile a tụgidere m."
Wike kwuru na okwu Atiku kwuru ka o nwetara mmeri nakwa mgbe ọ kpọpụtara Osote ya rụrụ ya afọ ma kwụkwọ na ọtụtụ ihe Atiku na ndị otimkpu ya kwuru n'akwụkwọ akụkọ bụ asị ka a tụgidere ya.
Ọ sịrị, "O nweghị onye na-eche ezigbo echiche ga-asị na ihe o kwuru ụbọchị ahụ bụ ihe dị mma."
"Kwa ụbọchị ndị na-eso ya na-apụta ekwu okwu ọjọọ banyere m."
"Kemgbe Mee 29, o nwebeghị onye bịakwutere m ikwu maka ihe mere na ntuliaka."
"Atiku Abubakar biara n'ụlọ m si m kwado ya, ọ bụ na Atiku Abubakar amaghịzị ebe ụlọ m dị ugbua?"
"Naijiria ga-amata ihe mere na ntuliaka imeụlọ ahụ."
"Aga m apụta kwuo ihe nile, ọ bụghị igobi ndị ntaakụkọ."

Ebe foto si, Nyesom Wike
N'okwu na Atiku zitere Bukola Saraki bụbụ Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu ka ọ bịa rịọ Wike, Wike zara sị, "Ọ bụghị eziokwu. Saraki bịakwutere m, ma ajụọ ya ma ọ bụ Atiku zitere ya, ya asị mba."
O kwuru na ọbụladị akụkọ na onyeisioche pati APC kpọrọ ya n'ekwentị bụ akụkọ ụgha.
"Ana m agụ n'akwụkwọ akụkọ mana o nweghị onye bịakwutere m si na ọ bụ Atiku."
Wike onye kwuru na ntuliaka 2023 abụghị ntuliaka imeụlọ pati kwuru na oge rue, na a ga-ama ndị hụrụ Naijiria n'ọnụ, na ndị hụrụ ya n'ezie.
Ebe nsogbu malitere

Ebe foto si, Atiku Abubakar/Facebook
Kemgbe abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Mee, afọ 2022 (May 28, 2022) bụ ụbọchị akpọpụtara Atiku dịka onye meriri na ntuliaka imeụlọ otu PDP maka onye ga-azọrọ pati ha ọkwa onyeisiala, o were ewu na ọkụkọ anya na mmekọrịta enyi na enyi nke Atiku na Wike adaala mmiri.
Atiku ji 371 vootụ 371 were merie, ebe Wike gbara onye nke abụọ dịka o nwetara vootu 237.
Na-agbanyeghị na komiti PDP hiwere ka ha tụnye Atiku alo onye ọ ga-eji eme Osote họrọ Wike, Atiku gara họrọ Aka na-achị Delta Steeti bụ Ifeanyi Okowa dịka Osote.
Nke mere ka ndị na-akwado Wike na pati PDP dịka Samuel Ortom Governọ Benue steeti nakwa Ayo Fayose bụbụ gọvanọ Ekiti steeti gbarụọ ihu ha.
Ortom kwuru na ọ dị mkpa ka Atiku gaa rịọ Wike ka obi ya tajụọ.
Kemgbe ahụ, ọtụtụ akụkọ apụtaala n'akwụkwọ akụkọ nke na-ekwu na Atiku zigara ndị gara rịọ Wike.









