Lee akụkọ ụgha na-efegharị gbasara ndị a ma ama na-azọ ọkwa Onyeisiala

Ka chi na-efo kwa ụbọchị, ka akụkọ ụgha dị icheiche na-efesa, ọ kachasị na soshal midịa, gbasara ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka a ga-enwe n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.
Ngalaba nnyochapụta akụkọ ụgha nke BBC emebuola akụkọ gosiri etu ndị a ma ama na soshal midia si anara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ego iji na-ekesa akụkọ ụgha ndị a.
Lee ụfọdụ n'ime akụkọ ụgha ndị a nakwa ndị na-ekesa ha:
Peter Obi nyere otu CAN N2b - Ụgha

Ebe foto si, screengrab
N'ọdị nso a ka akụkọ malitere ifegharị na onye na-azọ ọkwa Onyeisiala na 'Labour Party' bụ Peter Obi nyere ndị otu 'Christian Association of Nigeria' ijeri naịra abụọ ka ha wee kwadoo ya.
Akụkọ ahụ gosiri akwụkwọ ozi si n'aka otu ụlọụka a kpọrọ 'Dominion Centre International' dị n'Owerri, imo steeti, nke otu onye ụkọchukwu aha ya bụ Frank Onwumere binyere aka na ya.
Mana nnyocha gosiri na onweghị ụlọụkọ dị otu ahụ n'Owerri. Otu onye ụkọchukwu aha ya bụ Frank Onwmere apụtakwala kwuo na aka ya adịghị n'Akwụkwọ ozi ahụ.
Otu CAN n'onwe ha ekwukwaala na onweghị mgbe ha natara ego ọbụla n'aka Peter Obi.

Ebe foto si, Screengrab
Ọtụtụ ndị a ma ama, nke gụnyere Bashir Ahmed, bụ onye enyemaka mgbasa ozi Onyeisiala Muhammadu Buhari, nakwa Mịnịsta nta maka ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Festus Keyamo, kesara akụkọ a.
N'agbanyeghị ihe mgba ama niile gosiri na akụkọ ahụ abụghị eziokwu, ọtụtụ ndị tinyere ya na soshal midia ha ekwebeghị ewepụ ya.

Tinubu na-alụ nwaanyị ọhụrụ na Katsina - Ụgha

Ebe foto si, Screengrab
Akụkọ ọzọ fesakwara n'ọdị nso a bụ nke na-ekwu na onye na-azọ ọkwa onyeisiala na pati 'All Progressives Congress' bụ Bola Tinubu, na-achọ ịlụ nwaanyị ọhụrụ na Katsina Steeti.
Akụkọ a kwuru na Tinubu na-eme nke a iji nweta nkwado ndị mpaghara Ugwu n'ihi na ha ga-ahụta ya dịka ọgọ ha.
Mana ngalaba achụmnta vootu Tinubu wepụtara akwụkwọ ozi iji katọọ akụkọ ahụ ma kpọọ ya nnukwu asị.
"Asiwaju na-aṅụrị n'alụmdi na nwuye ya na Senator Oluremi Tinubu, nke Chukwu ji ọtụtụ ụmụ gọzịe. Ọ naghị akwado ịlụ nwaanyị ọzọ, ma ọbụ onye okpukperechi Christ ma ọ bụ onye Alakụba," akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

Peter Obi na-aṅụ beer - Ụgha

Ebe foto si, Twitter
N'ọnwa Jenụwarị otu foto fesara na soshal midia nke gosiri ebe Peter Obi na-eri nri, karama mmanya 'beer' abụọ dị n'ihu ya.
Onye kesara foto a bụ onye pati APC a ma ama aha ya bụ Adamu Garba.
Ndị mmadụ hụrụ foto ahụ ihe karịrị ugboro puku 757, ebe ndị kesara ya na Twitter ruru otu puku.
Mana foto ahụ bụ adịgboroja. Ndị nkwado Peter Obi tinyekwara foto e ji wee rụpụta ya bụ foto ụgha na twitter ka ụwa hụrụ.

Tinubu ji ntụ ọgwụ ike n'aka - Ụgha

Ebe foto si, Twitter
Onyonyo Bola Tinubu fesakwara na soshal midia n'afọ 2022, nke na-egosi ebe o ji obere akpa abụọ etinyere ntụ ọcha n'ime ya.
Foto ahụ na-akọwa na ntụ ọcha ahụ bụ ọgwụike, mana ya bụ foto bụ adịgboroja.
Onweghị mgbe ọbụla ejidere Tinubu maọbụ kpọpụ ya ụlọikpe maka ibu ọgwụ ike.

A chọtara nnukwu ego n'ụlọ Tinubu - Ụgha

Ebe foto si, Screengrab
Ụlọorụ ntaakụkọ a na-akpọ 'Vanguard Hausa' na facebook kesara akụkọ kwuru na ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa chọtara nnukwu ego e zoro n'ụlọ Bola Tinubu.
Akụkọ a kwuru na ndị ọrụ nchekwa jichiri ego ahụ dịka ndị otu Tinubu chọrọ iji nnukwu 'trailer' asatọ bupụ ya.
Mana akụkọ ahụ abụghị eziokwu. ụlọọrụ ntaakụkọ Vanguard nke a ma ama na Naịjirịa ekwuola na ha enweghị ngalaba asụsụ hausa.
Onweghịkwanụ mgbe ndị ọrụ nchekwa kwuru na ha hụrụ ego ọbụla n'ụlọ Tinubu ma ya fọkwa ijichi ya.










