Ihe anyị ma maka akụkọ sị na 'gateman' ụlọakwụkwọ tụwara ụmụakwụkwọ atọ ime n'Anambra steeti

Ebe foto si, Screengrab
Ndịisi ụlọụka Anglikan na Dayọsis Oka bụ ndị nwe ụlọakwụkwọ Queens' Convent, Ọka, Anambara Steeti ekwuola na akụkọ na-efegharị nke kwuru na onye nche ụlọakwụkwọ ahụ tụbara ụmụakwụkwọ atọ ime bụ, "asi si ọkụala mmụọ".
Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ebo ebubo na otu onye nche ụlọakwụkwọ ahụ tụwara ụmụakwụkwọ atọ nọ na SS 2 ime .
Akụkọ ahụ gara n'ihu boro ebubo na n'ihi ihe nwokorobia ahụ a sị bụ onye Akwa-Ibom mere, na otu n'ime ụmụakwụkwọ ọ tụwara ime gbaliri ịkwụ ụdọ site n'isi n'ụlọelu wutuo mana ụmụakwụkwọ ibe ya na ndị nkuzi gbobidoro ya.
Mana ọnụ na-ekwuru dayosis ahụ bụ Odogwu Emeka Odogwu gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo n'ekwentị ụbọchị Fraide na ya bụ akụkọ bụ "Asị si ọkụ ala mmụọ."
O kwuru n'ozi mgbasaozi o binyere aka ma wepụtara na ụmụakwụkwọ na ndị nche anọ nọ n'ụlọakwụkwọ ahụ enweghị ihe ọbụla jikọrọ ha.
Ọ sịrị, "Akụkọ ị hụrụ na-efegharị bụ nta akụkọ na-agbasọghị ụzọ ziri ezi(journalism without conscience)."
"Kedụ ka mmadụ ga-esi dee akụkọ na onye nche tụwara ụmụakwụkwọ atọ ime na-akpọtụghị Bishọp maọbụ onyeisi ụlọakwụkwọ jụọ ha."
"Ụmụakwụkwọ Queens' Convent nọ ezumike, ha ga-amalite akwụkwọ n'izuụka na-abịa."
"Tupu ha mechie akwụkwọ tem gara aga, o nweghị ihe yiri ihe a ndị a kwụrụ ụgwọ na-efesa akụkọ ọjọ megide ụlọakwụkwọ a mere."
Ọ gara n'ihu kọwaa na ụlọakwụkwọ ahụ nwere ndị nche anọ; agadi abụọ na ndị okorobịa abụọ bụ ndị ụlọọrụ nche FEDA Securities tinyere ebe ahụ.
"E nweghị ihe jikoro ha na ụmụakwụkwọ kama ha na anọ n'ihu ọrụ ha(duty post.)"
"A machikwara ụmụakwụkwọ anyị ịga n'ụzọ ama ụlọakwụkwọ nakwa ịhụ ha na ndị nche. O nweghị ihe jikọrọ ha na-ebe ụmụakwụkwọ bi."
N'okwu na otu nwata akwụkwọ o metụtara chọrọ ịkwụ ụdọ, O kwuru na o nweghị ihe dịka ya mere ma kwuo ka ndị na-ebo ebubo ahụ kpọpụta ụmụakwụkwọ atọ ahụ ha sị a tụwara ime.
O kwuru na ụlọakwụkwọ ahụ nwere ndị nkuzi ọ bụ ọrụ ha ilekọta ụmụakwụkwọ site n'ụtụtụ rue n'abalị na Klassị,'ama egwuregwu nakwa ebe obibi ha .












