Etu ọchịchị PDP siri laa ka naị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa

Njirimara pati PDP

Ebe foto si, PDP/X

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

N'afọ 1999 ka Naịjirịa lọghachiri n'ọchịchị onye kwuo uche ya site n'atụmatụ mgbanwe ọchịchị nke Ọchịagha Abdulsalami Abubakar wepụtara.

Ọnọdụ a sochiri dịka onyeagha na-achị Naịjirịa n'oge ahụ bụ Ọchịagha Sani Abacha nwụrụ n'afọ 1998.

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị atọ a ma ama n'oge ahụ a na-eme ntuliaka n'afọ 1999 gụnyere People's Democratic Party (PDP), All Nigeria Peoples Party (ANPP) na Alliance for Democracy (AD).

Pati ndị a sonyere na ntuliaka a haziri n'ọnwa Eprel, 1999 iji họpụta onyeisiala na ndị gọvanọ steeti dị iche iche.

E mechara kwupụta Olusegun Obasanjo bụbu onyeagha chịrị Naịjirịa dịka onye nwetara mmeri na ntuliaka Onyeisiala ahụ.

Obasanjo jiri aha otu Peoples Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa onyeisiala ahụ ma nwetakwa mmeri.

N'oge ahụ ndị gọvanọ niile nwetara mmeri na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụ ala Igbo n'afọ 1999 bụcha ndị otu PDP.

Ha dị steeti ise mejupụtara ala Igbo a maara nke ọma dịka mpaghara Ndịda Ọwụwaanyanwụ Naịjirịa (South East).

Steeti ise ndị a gụnyere; Abịa, Anambra, Ebonyi, Enugwu na Imo steeti.

Njem pati PDP na steeti dị iche iche n'ala Igbo

Malite n'afọ 1999 Naịjirịa lọghachiri n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya ruo n'afọ 2007, a maara mpaghara South East dịka nke PDP na-achị.

Mana bido n'afọ 2007, egwu jiri nwayọ malite ịdagharị dịka pati ndị ọzọ malitere inweta mmeri na steeti dị iche iche n'ala Igbo.

Ugbua, o nweghịzi steeti ọbụla PDP na-achị na mpaghara South East, dịka Enugwu steeti bụ ndị ikpeazụ pụrụ n'usoro ọchịchị pati ahụ.

Abịa steeti

Njirimara Abịa steeti

Ebe foto si, Screenshot

Orji Uzo Kalu gbapere igodo otu Peoples Democretic Party (PDP) n'Abịa steeti site n'iji aha otu ahụ nweta mmeri dịka gọvanọ n'afọ 1999. O jikwa pati ahụ banye n'ọchịchị nke abụọ ya n'afọ 2003.

Theordore Orji weghaara ọchịchị n'aka Orji Uzo Kalu n'afọ 2007, bụ mgbe o ji aha PDP nweta mmeri dịka gọvanọ Abịa steeti. O mechakwara jiri pati ahụ laghachi n'ọkwa nke ugboro abụọ ya n'afọ 2011.

Okezie Ikpeazu buuru oche dịka gọvanọ Abịa steeti n'afọ 2015 site n'iji pati PDP nweta mmeri. O nwetakwara mmeri maka ọchịchị nke ugboro abụọ ya n'afọ 2019 n'otu pati ahụ.

Mana egwu dagharịrị na ntuliaka afọ 2023 dịka Alex Otti nke Labour Party chụpụrụ PDP n'ọkwa, ma banye dịka gọvanọ.

Anambra steeti

Njirimara Anambra steeti

Ebe foto si, Screenshot

Oge ọchịchị onye kwuo uche ya lọghachiri n'afọ 1999, Chinweoke Mbadinuju jiri ọkọlọtọ PDP nweta mmeri dịka gọvanọ Anambra steeti.

Chris Ngige jikwa aha PDP nweta mmeri dịka gọvanọ steeti ahụ na ntuliaka afọ 2003.

Ka o sina dị, egwu dagharịrị n'afọ 2007 dịka Peter Obi jiri ọkọlọtọ pati All Progressives Grand Alliance (APGA) nweta mmeri dịka gọvanọ Anambra steeti.

Peter Obi laghachikwara n'ọchịchị nke ugboro abụọ ya n'afọ 2011 site n'iji pati APGA nweta mmeri.

N'afọ 2015, Willie Obiano ji ọkọlọtọ APGA merie na ntuliaka gọvanọ Anambra steeti ma jirikwa pati ahụ laghachi n'ọchịchị nke ugboro abụọ ya n'afọ 2019.

Chukwuma Charles Soludo weghaara ọchịchị n'aka Willie Obiano n'afọ 2023 dịka o ji pati APGA nweta mmeri dịka gọvanọ Anambra steeti.

Ka ọ dị ugbua, a maara Anambra dịka steeti naanị otu APGA na-achị.

Ebonyi steeti

Njirimara Ebonyi steeti

Ebe foto si, Screenshot

Ndị gọvanọ PDP malitere ịchị Ebonyi steeti n'afọ 1999, bụ mgbe Sam Egwu nwetara mmeri na ntuliaka.

Sam egwu jikwa aha PDP banye n'ọchịchị nke ugboro abụọ ya n'afọ 2003 tupu o bunye Martin Elechi oche ọchịchị.

Martin Elechi buuru oche ọchịchị n'aka Sam Egwu n'afọ 2007, bụ mgbe o jiiri aha PDP nweta mmeri dịka gọvanọ Ebonyi steeti.

N'afọ 2011, Elechi nwetara mmeri nke ugboro abụọ ya dịka gọvanọ Ebonyi steeti n'otu pati PDP ahụ.

David Umahi banyere n'ọchịchị dịka gọvanọ Ebonyi steeti n'afọ 2015, ma mechaa nweta mmeri nke ugboro abụọ ya n'afọ 2019. Ọ bụ ọkọlọtọ PDP ka o ji nwetechaa mmeri niile ahụ.

Ka o sina dị, egwu dagharịrị na ntuliaka afọ 2023, bụ mgbe Francis Nwifuru na-achị steeti ahụ ugbua ji pati All Progressives Congress (APC) nweta mmeri dịka gọvanọ Ebonyi steeti.

Etu a ka Ebonyi siri bụrụ steeti APC na-achị ugbua.

Enugwu steeti

Njirimara Enugwu steeti

Ebe foto si, Screenshot

Enugwu bụ steeti nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa PDP chịrịla ọtụtụ afọ malite na nlọghachi ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 1999 ruo 14 Ọktoba 2025.

N'afọ 1999, Chimaroke Nnamani jiri ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP merie dịka gọvanọ Enugwu steeti.

Nnamani zọkwara ọchịchị nke abụọ dịka gọvanọ na pati PDP n'afọ 2003 ma merie.

Na ntuliaka nke afọ 2007, aka chịburu steeti ahụ bụ Sullivan Chime merikwara dịka gọvanọ n'ọkọlọtọ nke otu pati PDP .

Chime jikwara pati ahụ zọgharịa ọchịchị nke abụọ ya dịka gọvanọ n'afọ 2011 ma merie.

N'afọ 2015, Ifeanyi Ugwuanyi jikwara ọkọlọtọ PDP merie na ntuliaka gọvanọ Enugwu steeti. Ọ gara n'ihu jirikwa PDP zọgharịa ọchịchị nke abụọ ya n'afọ 2019 ma merikwaa.

Na ntuliaka nke afọ 2023, aka na-achị steeti ahụ ugbua bụ Gọvanọ Peter Mbah jiri ọkọlọtọ PDP zọọ ọkwa gọvanọ ma merie.

Ka ọ dị ugbua, nke ahụ gbanwere dịka ọ gbapụrụ na PDP n'ụbọchị Tuzde 14 Ọktoba 2025 ma banye na pati APC.

Imo steeti

Njirimara Imo steeti

Ebe foto si, Screenshot

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'afọ 1999, Achike Udenwa jiri ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị People's Democratic Party (PDP) nweta mmeri dịka gọvanọ Imo steeti.

Udenwa jiwa aha pati PDP ahụ zọọkwa ọchịchị nke abụọ ya dịka gọvanọ n'afọ 2003 ma merie.

Na ntuliaka 2007, Ikedi Ohakim meriri dịka gọvanọ n'ọkọlọtọ nke otu Progressive Peoples Alliance (PPA) bụ nke o mechara pụọ ma banye na pati PDP.

Ọnọdụ a gbanwere n'afọ 2011, dịka Rochas Okorocha meriri ntuliaka n'ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Grand Alliance (APGA) tupu o mechaa banye na pati All Progressive Congress (APC) bụ nke o jiri merie ntuliaka n'afọ 2015.

Nke a gbanwekwara n'afọ 2019 dịka Emeka Ihedioha jiri ọkọlọtọ pati PDP nweta mmeri dịka gọvanọ na steeti ahụ.

Mmeri ahụ anọghị ogologo oge tupu Ụlọikpe Kachasị ewepụ Ihedioha n'ọchịchị ma tinye Hope Uzodimma, bụ onye jiri ọkọlọtọ pati APC zọọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka nke afọ 2019.

Uzodimma nọ n'ọchịchị ugbua, jikwara APC zọgharịa ọchịchị na ntuliaka nke afọ 2023 ma nweta mmeri.