Mba Izrel agbaala US ama maka ịwakpo Lebanon n’ala, mmịrị ma n’elu

Ebe foto si, EPA
Otu onye ọrụ na gọọmenti Amerịka ekwuola na mba Izrel zunyere ha ohi ụka banyere mgbe ha ga-awakpo Lebanon.
Onye ahụ gwara ndị nta akụkọ CBS na mba Izrel nwereike ịmalite ịwakpo Lebanon ma n'ala, ma n'elu, ma na mmịrị n’oge adịghị anya.
Mana osote onyeisi ndị Hezbollah kwuru na ha adịla njikere ma kwadoo maka mgbe mba Izrel ga-awakpo ha.
N'otu aka ahụ, Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na mba Izrel bụ Yoav Gallant agwala ndịagha ha nọ nso n’akụkụ Lebanon ka ha kwadoo maka ịwakpo Lebanon.
Ndị ọchịchị Lebanon na-ekwu ugbua na mmadụ ruru otu puku (1000) anwụọla kemgbe izuụka abụọ gara aga ebe ihe karịrị nde mmadụ bụzi ndị gbapụrụ n’ụlọ ha na-enweghị ebe obibi.
Anyị ga-abọ ọbọ ihe Izrel mere anyị - Houthis na Yemen
Ndị Yemen aṅụọla ịyị kwuo na ha ga-abọ ọbọ ogbunigwe ndị Izrel tụrụ be ha n’ụbọchị ụka.
Mba Izrel kwupụtara na ha tụrụ ogbunigwe ihe ruru ugboro iri na asaa (17) ma gbarie ọtụtụ ihe na Yemen bụ nke mmadụ ise nwụrụ n’ime ya ebe mmadụ ruru iri ise na asaa merụrụ ahụ. Ndị Izrel na-akọwa na ogbunigwe ahụ ha tụrụ bụ imegwara mwakpo niile ndị Houthi na-awakpo mba Izrel.





















