Anyị enweghị atụmatụ ịkpọbata ndị gbara ọsọ ndụ n’Ehime Mbano – Gọọmenti Imo steeti

Akụkọ ndị kachasị mkpa na mbaụwa n'ọnwa Sepụtemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Michael Ilediagu

  1. Mba Izrel agbaala US ama maka ịwakpo Lebanon n’ala, mmịrị ma n’elu

    Mba Izrel ezunyela US ohi ụka maka ịwakpo Lebanon n’ala, mmịrị ma n’elu

    Ebe foto si, EPA

    Otu onye ọrụ na gọọmenti Amerịka ekwuola na mba Izrel zunyere ha ohi ụka banyere mgbe ha ga-awakpo Lebanon.

    Onye ahụ gwara ndị nta akụkọ CBS na mba Izrel nwereike ịmalite ịwakpo Lebanon ma n'ala, ma n'elu, ma na mmịrị n’oge adịghị anya.

    Mana osote onyeisi ndị Hezbollah kwuru na ha adịla njikere ma kwadoo maka mgbe mba Izrel ga-awakpo ha.

    N'otu aka ahụ, Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na mba Izrel bụ Yoav Gallant agwala ndịagha ha nọ nso n’akụkụ Lebanon ka ha kwadoo maka ịwakpo Lebanon.

    Ndị ọchịchị Lebanon na-ekwu ugbua na mmadụ ruru otu puku (1000) anwụọla kemgbe izuụka abụọ gara aga ebe ihe karịrị nde mmadụ bụzi ndị gbapụrụ n’ụlọ ha na-enweghị ebe obibi.

    Anyị ga-abọ ọbọ ihe Izrel mere anyị - Houthis na Yemen

    Ndị Yemen aṅụọla ịyị kwuo na ha ga-abọ ọbọ ogbunigwe ndị Izrel tụrụ be ha n’ụbọchị ụka.

    Mba Izrel kwupụtara na ha tụrụ ogbunigwe ihe ruru ugboro iri na asaa (17) ma gbarie ọtụtụ ihe na Yemen bụ nke mmadụ ise nwụrụ n’ime ya ebe mmadụ ruru iri ise na asaa merụrụ ahụ. Ndị Izrel na-akọwa na ogbunigwe ahụ ha tụrụ bụ imegwara mwakpo niile ndị Houthi na-awakpo mba Izrel.

  2. Anyị enweghị atụmatụ ịkpọbata ndị gbara ọsọ ndụ n’Ehime Mbano – Gọọmenti Imo steeti

    Anyị enweghị atụmatụ ịkpọbata ndị gbara ọsọ ndụ n’Ehime Mbano – Gọọmenti Imo steeti

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmenti Imo steeti ekwuola na ihe onyonyoo na-efegharị n’ikuku na Gọọmenti Etiti Naịjirịa na-achọ ihiwe ogige ndị gbara ọsọ ndụ maka ndị mgbago ugwu n’Okpuru ọchịchị Ehime Mbanọ abụghị eziokwu.

    Ọ bụ kọmịshọna mgbasaozi na nhazi ọrụ Imo steeti bụ Declan Emelumba kwupụtara nke a n’ozi o wepụtara n’ụbọchị Sọnde 29 Septemba 2024.

    Ọ kọwara na ihe Gọọmenti Imo steeti hiwere na Nsu dị n’Okpuru ọchịchị Ehime Mbano nke steeti ahụ bụ ebe a na-akụziri ndị ntorobịa si mpaghara South East ọrụaka dị iche iche nke na-abụghị maka ụmụafọ Naịjirịa si mpaghara ndị ọzọ.

    Emelumba kwuru na ọ bụ ndị iro Naịjirịa megharịrị ihe onyonyoo sitere n’ụlọorụ na-ahụ maka ndị gbara ọsọ ndụ bụ National Refugees Commission iji bute ọgbaaghara n’etiti ndị Igbo na mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ.

    N’okwu nke ya, onye bụbu sịnetọ na-anọchite anya Imo North n’ụlọ omeiwu sịnetị bụ Frank Ibezim kwuru na ya gara n’ogige mahadum National Open University of Nigeria (NOUN) dị na Nsu na nso nso a.

    Ọ sịrị na ọ bụ ya na nnukwu onye kọmịshọna na-ahụ maka ndị gbara ọsọ ndụ na nnukwu onye enyemaaka onyeisiala na-ahụ maka ọrụ obi ebere na mbelata ụbịam soro gaa nje m ahụ.

    Ibezim gara n’ihu kwuo na ihe onyonyoo ndị gbara ọsọ ndụ a gbakwunyere n’onyonyoo nke onwe ya oge ahụ ọ gara ya bụ njem bụ nke e mere iji bute nsogbu na ọgbaaghara.

    N’otu ozi o binyere aka na ya, Ibezim kwuru na akụkọ ahụ na-ekwu na a chọrọ ịkpọbata ndị gbara ọsọ ndụ ka ha biri n’ogige ọmụmụ ihe NOUN dị na Nsu abụghị eziokwu.

    Cheta na otu ihe onyonyoo fesara n’ikuku na nso nso a ma na-ebo ebubo na Gọọmenti Imo steeti chọrọ ịkpọbata ndị mgbago ugwu gbara ọsọ ndụ n’Okpuru ọchịchị Ehime Mbano dị na steeti ahụ.

  3. Etu Odum si dọgbuo nwoke na-elekọta ya n'ogige anụmanụ nke Ogun steeti

    odum n'ọhịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweoji n’Ogun steeti ekwuola na ọdụm gburu otu nwoke aha ya bụ Babaji Daule dị afọ ịrị atọ na ise bụ onye na-elekọta Odum.

    Babaji bụ onye a zụrụ azụ maka ịkpa ma nekọta ọdụm n’ọba akwụkwọ a kpọrọ Olusegun Obasanjo presidential library (OOPL) bụ nke nwekwara ọdọ anụmanụ.

    Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweoji na Ogun steeti bụ Omolola Odutola sị kwuo “anyị nwetara ozị n'abalị ịrị abụọ n’itoolu nke ọnwa Sepụtemba afọ 2024 maka Babaji Daule dị afọ ịrị atọ na ise bụ onye ọdụm gburu”.

    OOPL kwuru na nwoke ahụ na-elekọta ọdụm na-ege ndị bịara n’ụlọ anụmanụ ahụ ntị ma na-achọ ịgọsị ha ka ọdụm sị eri nrị.

    Mana o chefuru na ya agbachịghị ụzọ nke ọma nke mere ọdụm ahụ jiri wakpo ya ma gbuo ya.

    Ha kwuru na ha na-eme nyocha ọzọ maka mkpamkpa ahụ ka ha kọchara ndị uweoji ihe mere.

    Cheta na nke a na-eme n’ihe na-erubeghị otu afọ mahadum Obafemi Awolo dị na Ile-Ife, Osun steeti kwuputara na ọdụm nwakporo onye ọrụ ha ma gbuo ya n’ọnwa Febuwarị afọ a.

  4. Gọmentị amachiela ọtụtụ ụlọakwụkwọ adigboroja n’Enugwu

    Otu ụlọakwụkwọ agbachiri

    Ebe foto si, Enugu state Government

    Gọmenenti Enugwu amachiela ọtụtụ ụlọakwụkwọ adịgboroja dị na steeti ahụ maka ime ihe na-esoghị n’iwu.

    Kọmịshịọna na-ahụ maka agụmụakwụkwọ na steeti ahụ bụ ọkammụta Ndubueze Mbah mere ka a mata nke oge ha gachara hụ ọnọdụ ọtụtụ ụlọakwụkwọ.

    Ndubueze kwuru na ngagharị ahụ ha mere bụ nyocha dị oke mkpa ha ji chọpụta ọlụakwụkwọ na-eme ihe na-adịghị n’iwu.

    Ọ kwuru na ha machiri ọtụtụ ụlọakwụkwọ oge ha chọpụtara na ha na-ada iwu e ji eguzobe ụlọakwukwọ, dịka iji ndị nkuzị adịgboroja nwere na-enye ụmụakwụkwọ ọzụzụ.

    “Ọnwa anọ anyị nyere ndị nwere ụlọakwụkwọ ka ha mee ihe dị n’iwu agaara”. Ndubueze gara n’ihu kwuo na gọmentị na agba mbọ ịkwalite ọnọdụ agụmụakwụkwọ na steeti ahụ maka ọdịmma nke ụmụ akwụkwọ nakwa ndị Enugwu niile.

    “Anyị ga-etinya anya n’ụdịrị akwụkwọ ụmụaka anyị na-agụ nakwa ọnọdụ ha ji agụ ya. Nke a bụ maka ọdịmma ha”.

    Lee ụlọakwụkwọ gọmenti Enugwu machiri:

    • Evangel School: ụlọakwụkwọ nke a dị n’ime ụlọ ụka. Oge ndị ọrụ gọọmentị gara ụlọakwụkwọ ahụ, ndị nkuzi gbara ọsọ kpọrọ ụmụaka zoo ha n’ụlọ mposi.

    • Ivory Education Centre dị na Owerri Road, Asata, bụ ebe ọzọ a machiri maka na ha na-ekuziri ụmụakwụkwọ ihe n’ụlọ dị nkanka.

    • Eastview Nursery and Primary School dị na Railway Quarters, Njemanze.

    • St. Michael Nursery and Primary School, dị na Asata.

    • St. Bartholomew Nursery, • Primary, and Secondary School, Asata

    • Olive Grove Nursery and Primary Academy, Njemanze.

  5. Mmadụ 17 anwụọla oge a gbara egbe aghara aghara

    Ndị uweojii South Africa

    Ebe foto si, Getty Images

    Agbagbuola mmadụ iri na asaa (17) oge a gbara egbe aghara aghara n'otu ime obodo dị na Saụt Afrịka.

    Ndị uweojii kwuru na ha ga-amalite ime nnyocha iji chọpụta ndị aka ha dị n'ihe ọdachi ahụ.

    Ha gbakwunyere na njinji ahụ kpọtụrụ n'ọnụmara abụọ dị n'obodo Lusikisiki nke dị n'ọwụwa anyanwụ Cape.

    E gburu ụmụnwaanyị iri na abụọ (12) na otu nwoke n'otu ebe ma gbuokwa ụmụnwaanyị atọ na otu nwoke n'ebe nke ọzọ.

    Dịka ndị uweojii sịrị kwuo, mmadụ iri na asatọ (18) ndị ọzọ nọ n'ezigbo ọnọdụ ọjọọ n'ụlọọgwụ.

    Ka o siladị, Minista ndị uweojii na kọmịshọna ga-agwa ọhanaeze okwu n'elekere mbụ nke ehihie n'ụbọchị Satọde 28 Septemba 2024.

    Ụfọdụ ụlọmgbasaozi dị na Saụt Afrịka kwuru na ndị zutere ihe ọdachi ahụ bụ ndị agbataobi obodo Nyathi, Ngobozana dị na Lusikisiki.

    Akụkọ kwuru na ndị ahụ a gbara egbe zukọtara n'ụlọ ebe ha na-akwado ịga mmemme akwamoozu tupu awakpoo ha n'abalị Fraịde 27 Septemba 2024.

    Ụlọmgbasaozi Dispatch Live kwuru na onye mayor obodo Ingquza Hil bụ Nonkosi Pepping sịrị na "ndị ojiegbe batara, gbaa egbe aghara aghara ma gbagbuo onye niile. Ụmụnwaanyị na ụmụaka so na ndị ha gburu."

  6. Atọhapụla nwoke kachasị nọọ n’ụlọnga na mba Japan

    Atọhapụla nwoke kachasị nọọ n’ụlọnga na mba Japan

    Ebe foto si, Reuters

    Ụlọikpe Japan atọhapụla nwoke gbara afọ iri asatọ na asatọ (88) kachasị nọọ n’ụlọnga a mara ikpe ọnwụ oge ha chọpụtara na ihe akaebe e ji maa ya ikpe bụ adịgboroja.

    Iwao Hakamada nọ kemgbe afọ iri anọ na isii (46) na-eche ọnwụ ya bụ onye e kwuru aka ya dị n’ebubo igbu nna ya ukwu, nwunye ya na ụmụ abụọ n’afọ 1968.

    Na nso nso a ka a nabatara arịrịọ ikpegharị ya ikpe dịka a na-enyo enyo na ọ dị ka ndị mere ya nnyocha tinyere ihe akaebe mere ikpe jiri maa ya n’ihi ebubo igbu mmadụ anọ.

    Afọ iri anọ na isii ahụ ọ nọrọ n’ụlọnga emetụtala ọnọdụ akparamaagwa Hakamada etu adịghị mma dịka o nweghị ike ịga ụlọikpe n’ụbọchị a tọhapụrụ ya.

  7. A dọọla Trump aka na ntị na Iran na-eyi egwu igbu ya

    A dọọla Trump aka na ntị na Iran na-eyi egwu igbu ya

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ọrụ nchekwa mba Amerịka adọọla onye bụbu Onyeisiala mba ahụ bụ Donald Trump aka na ntị gbasara egwu Ịran na-eyi imemila ya.

    Otu na-achụrụ Trump nta vootu mere ka ọ mara gbasara egwu Ịran na-eyi iwepụ ndụ ya n’ihi mbọ ha na-agba ibute ọgbaaghara na nkewa na mba Amerịka.

    Ha akọwaghị ozi ahụ n’uju dịka ọ na-edoghị anya ma egwu ahụ ha kwuru Ịran na-eyi ọ bụ nke ọ hụrụ ka ọ bụ nke e kwurula okwu gbasara ya oge gara aga.

    Gọomenti Ịran ekwughị okwu ozugbo gbasara ebubo ahụ oge a gbara ha ajụjụ mana Tehran agọpụla onwe ya n’oge gara aga gbasara ebubo itinye ọnụ n’okwu metụtara mba Amerịka.

    Ka osiladị, Trump depụtara n’akara ọbaozi X ya sị “Ịran na-eyi nnukwu egwu megide ndụ m. Ịran agbaala mbọ ma ha enwetaghị m, mana ha ga-agbakwa mbọ ọzọ.”

  8. Gịnị mere Onyeisiala Tinubu jiri chọọ ịgbanwe ndị Mịnịsta ya?

    Onyeisiala Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook

    Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu

    Ozi onye ndụmọdụ onyeisiala na mgbasa ozi bụ Bayo Onanuga kwuru na Onyeisiala Bola Tinubu chọrọ ịgbanwe ma wegharịa ụfọdụ ndọ ọrị mịnịsta ya.

    Bayo Onanuga kwuru na ya amaghị oge mgbanwe a ga-eme mana onyeisiala Tinubu ekpebiela ịgbanwe ụfọdụ ndị mịnịsta ya.

    Cheta na onyeisiala Tinubu duru ndị mịnịsta 42 n’iyi ọrụ n’ọnwa Ọgọst 2023.

    Mana ajụjụ dị ụmụafọ Naịjirịa n'ọnu bụ ‘Gịnị mere Onyeisiala Bola Tinubu jiri chọọ ime mgbanwe a”?

    Nke bụ eziokwu bụ na-mgbanwe ndị mịnịsta bụ ihe na-emekarị n’ọchịchị n’ụwa niile gbaa gburugburu.

    Na nso nso a, onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto gbanwere ndị mịnịsta ya dịka ndị ntorobịa mere ngagharịiwe maka oke ọnụ ahịa nri na ajọ ọnọdụ akụnaụba mba ahụ.

    Nke a bụ dị mkpe ime iji hụọ na ndị ọrụ gọọmenti na-arụ ọrị iji mee ka obodo dị mma.

    Ndị okwu doro anya na-ekwu na ọ bụ nke a ka Onyeisiala Bola Tinubu chọrọ ime iji nweta mgbanwe n’ọchịchị ya.

    Onye mara nke ekwe na-akụ banyere ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Eugene Abels kwuru na “Tupu ị zọọ ọkwa onyeisiala, ọ dị mkpa na ị maara ihe ọrụ ị chọrọ ọrụ maka ọdịmma ndị obodo, ọ bụ ihe na-egosi na ị nwere ezi ebunobi maka ndị ị chọrọ ịchị”.

    Ọzọ dịka ibe ya bụ na ọ bụrụ na Onyeisiala kwuo na ọ chọrọ ịgbanwee ndị ọrụ mịnịsta ya, nke a gosịrị na ọ na-ege ndị ọ na-achị nti.

    Oge onyeisiala duru ndị mịnịsta n’iyi ọrụ, ọ gwara ha ọtụtụ ihe ọ na-atụanya ya n’aka ha, nke gụnyere ịrụ ọrụ maka ọdịmma ndị Naịjirịa nakwa ihe ndị ọzọ.

    Onye bụbu onyeisi ụlọọrụ NPA bụ Hadiza Bala Usman ma bụrụkwa onye ndụmọdụ onyeisiala n’ihe gbasara nchịkọta ọchịchị, bụ onye ụlọọrụ ya na-maka etu ndị mịnịsta si rụọ ọrụ.

    Ọ bụ ụlọọrụ ya ga-atule ọrụ niile mịnịsta ọbụla rụrụ nakwa ego ole ha ji rụọ ọrụ iji hụ na enweghi ihe nrụrụaka ọbụla.

    Ọ bụ nchọpụta a ka onyeisiala ga-ele anya wee mara mịnịsta kwesịrị ka a kụọrọ ya aka nakwa mịnịsta kwesịrị ka a si ya ‘ka ọ dị’

    Anyị amaghị oge mgbanwee a ga-eme mana nke doro anya bụ na onyeisiala Bola Tinubu ga-agbanwe ụfọdụ ndị ọrụ mịnịsta gọọmenti ya.

  9. Ntụliaka Gọvanọ Edo Steeti: INEC enyela Monday Okpebholo asambodo mmeri

    Monday Okpebholo nke pati APC turu ugo na ntụliaka Gọvanọ Edo steeti

    Ebe foto si, Monday Okpebholo/Instagram

    Nkọwa foto, Monday Okpebholo nke pati APC turu ugo na ntụliaka Gọvanọ Edo steeti

    Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) enyela Monday Okpebholo nke pati All Progressive Congress (APC) asamobodo mmeri dịke onye turu ugo na ntụliaka Gọvanọ e mere n'Edo Steeti ụbọchị Satọde 21 Septemba, 2024.

    Ụlọọrụ INEC nyere ya asambodo ahụ taa n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja.

    Cheta na INEC kpọpụtara Monday Okpebholo dịka onye meriri na ntụlịaka ahụ ma jiri vootu ruru 291,667 merie ogbo ya bụ Asue Ighodalo nke Peoples Democratic Party (PDP) onye nwetara vootu 247,274.

    Dịka mgbakọ INEC na ntụliaka ahụ, Olumide Akpata nke Labour Patị (LP) nwetara vootu dị 22,763 ma gbaa onye nke atọ na ntụlịaka Gọvanọ ahụ.

    Monday Okpebholo nke APC nwetara mmeri n'okpuru ọchịchị ịrị n’ime ọkpuru ọchịchị ịrị na asatọ dị n'Edo Steeti,

  10. Ụlọikpe amaala ndị omekome wakporo ụlọakụ dị n’Offa, Kwara steeti ikpe ọnwụ

    Ihe oyoyo CCTV gosiri ndị omekome ahụ wakporo ụlọakụ ahụ

    Ebe foto si, SCREENGRABS FROM CCTV

    Nkọwa foto, Ihe oyoyo CCTV gosiri ndị omekome ahụ wakporo ụlọakụ ahụ

    Ọkaikpe Haleema Salma nke ụlọikpe dị elu na Kwara steeti amaala ndị omekome ise wakporo ụlọakụ dị na mpaghara Offa, n’ime steeti ahụ ikpe ọnwụ.

    Ọkaikpe Haleema kwuru na nyocha gosiri na mmadụ ise ahụ enweghi ikike inwe udiri ngwa agha ha ji wakpo ụlọakụ ahụ.

    Ụlọikpe ahụ makwara ha ikpe maka ịkpankata ịzụ ori nakwa ịjịkọ aka gbuo mmadụ bụ nke nwere ntaramahụhụ dịka iwu Naịjirịa siri kwu.

    Cheta na ndị uweojii kwuputara n’akara soshal mịdịa X na ha wuchiri ndị omekome abụọ n’ime ndị ahụ wakporo ụlọakụ ahụ dị n’Offa ma gbuo mmadụ ruru iri na asaa (17).

    Ndị omekome ahụ wakporo ụlọakụ ahụ n’ọnwa Mee, afọ 2018.

    Ndị omekome ahụ a mara ikpe ọnwụ

    Ebe foto si, Nigeria Police

    Nkọwa foto, Ndị omekome ahụ a mara ikpe ọnwụ
  11. Ọrịa otoro agbagbuola mmadụ 10 n'Ebonyi Steeti

    Ndị butere ọrịa otoro na-enweta nleta n'ụlọọgwụ n'Ebonyi steeti

    Ebe foto si, Minsitry of Health Ebonyi State

    Nkọwa foto, Ndị butere ọrịa otoro na-enweta nleta n'ụlọọgwụ n'Ebonyi steeti

    Mmadụ iri anwụọla site n'ọrịa otoro a maara dịka Cholera n’asụsụ Bekee n'Ebonyi steeti dịka ọrịa ahụ na-efesa n'ime obodo Ndibokote, Ezza Inyimagu dị n’okpuruọchịchị Izzi nke steeti ahụ.

    Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dọkịta Moses Ekuma gwara BBC Igbo na ihe ruru mmadụ iri abụọ (20) butere ọrịa ahụ n’enweta nleta n’ụlọọgwụ ugbua dịka ndị ọrụ ahụike na-agba mbụ igbochi nfesa ọrị otoro na steeti ahụ.

    Ekuma gara n’ihu kwuo na e nwere ụlọọgwụ nleta atọ n’ime ndị ahụ dị n’okpuruọchịchị Ezza maka ndị bu ọrịa otoro.

    Ọ kpọrọ oku ka onye ukwu na onye nta gbaa mbọ chekwaba ma dobe ogige ya ọcha iji gbochie nfesa ọrịa ahụ ma kpọọ oku ka onye ọbụla hụrụ ihe ngosi ọrị otoro gbara ga ụlọọgwụ maka nyocha na nleta.

    Ndịọrụ ahuike n'Ebonyi steeti

    Ebe foto si, Minsitry of Health Ebonyi State

    Nkọwa foto, Ndịọrụ ahuike n'Ebonyi steeti
  12. Amalitela emume oliliozu ụmụakwụkwọ 21 ọkụ gbagburu na Kenya

    Ihu ụlọakwụkwọ Hillside Endarasha Primary School

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ihu ụlọakwụkwọ Hillside Endarasha Primary School

    A nọrọ taa b Tọzde 26 Septemba 2024 kaara ụmụakwụkwọ 21 ahụ nwụrụ oge ọkụ gbara ụlọalwụkwọ ha Hillside Endarasha Primary School na mba Kenya.

    Cheta na ọkụ gbara ụlọakwụkwọ Hillside Endarasha Primary School ụbọchị Tọzde 5 Septemba, 2024 ma gbabrie ụmụakwụkwọ 21 nke mere na-amataghịzi ha.

    Ndị enyi na ezịnaụlọ ha gbakọrọ taa iji kwanyere ụmụaka ahụ ugwu ikpeazụ. Akụkọ kwuru na a ga-anọ taa lie ozu ụmụaka 9 n’ime ha ebe a ga-eli mmadụ ụbọchị Fraịde 27 Septemba ebe ụmụaka abụọ ka a ga-eli ụbọchị Satọde 28 Septemba.

    Ọkụ ahụ gbara ụlọakwụkwọ Hillside Endarasha Primary School emeela ka ọtụtụ jụọ ajụjụ maka nchekwa ụmụakwụkwọ n’ụlọakwụkwọ na mba Kenya.

    Gọọmenti ekwuola na ha amalitela ime nyocha iji hụ na ụlọakwụkwọ dị na mba ahụ na-eso usoro gọọmenti hibere maka nchekwa ụmụakwụkwọ.

  13. Gọọmenti Benin awuchiela ụmụnwoke atọ maka ebubo ịkwatu ọchịchị n'ike

    Onyeisiala mba Benin Patrice Talon oge ya na onyeisiala mba France Emmanuel Macron n'afọ 2021

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Benin Patrice Talon oge ya na onyeisiala mba France Emmanuel Macron n'afọ 2021

    Ndị ọrụ nchekwa na mba Benin awuchiela ụmụnwoke atọ a na-ebo ebubo na ha chọrọ ịkwatu ọchịchị n’ike na mba ahụ.

    Mmadụ atọ ahụ gụnyere onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka egwuregwu bụ Oswald Homekyna na Col Djimon Dieudonne Tevoedjre, onye bụbu onye na-ahụ maka nchekwa onyeisiala Patrice Talon.

    Akụkọ kwuru na e jidere Oswald Homeky ka ọ na-enyefee onyeisi ndị ọrụ nchekwa Republican Guard bụ Elonm Mario ihe ruru akpa ego isii.

    Ndị ọrụ nyocha kwuru na ha chọpụtara na Col Djimon Dieudonne Tevoedjre natara akaazụ iji kwado ịkwatu ọchịchị n’ike ụbọchị Fraịde 27 Septemba, 2024.

    Onye nke ọzọ bụ onye onye ji ego achụ ego bụ Olivier Boko onye bụ enyi onyeisiala Patrice Talon. A na-ekwu na ọ bụ onye chọrọ ibanye na ndọrọndọrọ ọchịchị..

    Ndị ọkaiwu Boka na ndị nkwado ya katọrọ nwuchi ya ma kpọọ oku ka gọọmenti tohapụya.

    Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ nyocha na-aga n’ihu iji chọpụta ndị ọzọ aka ha dị n’atụmatụ ahụ.

  14. Etu ọnwụ otu nwaanyị si malite mkparịtaụka maka mkpagbu ụmụnwaanyị n’ụlọọrụ n'India

    Ndị ọrụ n'India na-ekwu na ha na-arụ nnukwu ọrụ ebe a naghị akwụ ha ụgwọ kwesịrị

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ n'India na-ekwu na ha na-arụ nnukwu ọrụ ebe a naghị akwụ ha ụgwọ kwesịrị

    Ọnwụ nwaada Anna Sebastian Perayil, akpalitela mkparịtaụka maka ajọ ọnọdụ na mkpagbu ụmụnwaanyị n’ụlọọrọ na mba India.

    Anna Sebastian Perayil gbara afọ 26, bụ onye ọrụ mgbakọ ego (Chartered Accountant) n’ụlọọrụ na-ahụ maka mgbakọ ego Ernst & Young (EY)

    Ọ nwụrụ n’ọnwa Julaị, 2024, ka ọnwa anọ gasịrị ọ malitere ọrụ n’ụlọọrụ ahụ.

    Nne na Nna ya kwuru na ọ bụ ọnọdụ ọrụ dị ukwuu n’ụlọọrụ Ernst & Young (EY) metutara ọnọdụ ahụike ya ma gbuo ya.

    Mana ụlọọrụ Ernst & Young (EY) gọnarịrị ebubo ahụ ma kwuo na Perayil rụrụ ọrụ dịka o kwesịrị dịka ndị ọrụ ndị ọzọ.

    Ọnwụ Perayil emeela ka e nwee mkparịtaụka banyere ọnọdụ ụlọọrụ na-etinye ụmụnwaanyị na mba India.

    Mkparịtaụka a malitere oge akwụkwọ nne Perayil degara ụlọọrụ Ernst & Young (EY) pụtara ihe na soshal midia n’izuụka gara aga.

    N’akwụkwọ ozi ahụ, nne Perayil kọwara ajọ ọnọdụ ụlọọrụ Ernst & Young (EY) tinyere nwa ya nke gụnyere ịrụ ọrụ ruo abalị nakwa ngwụcha izuụka. Ọ gara n’ihu rịọ ụlọọrụ ahụ ka ha lebanye anya n’ọnọdụ na usoro ha ji arụ ọrụ ma buwe ahụike ndị ọrụ ha ụzọ.

    Akụkọ kwuru na ọtụtụ ụlọọrụ na-etinye uche naanị na-mmpụta ma ghara itinye uche n’ọdịmma na ọnọdụ ahụike ndị ọrụ. A na-ekwu na ego ndị ọrụ na mba India perempe.

    Otu onye rụburu ọrụ n’ụlọọrụ EY katọrọ usoro ha ji arụ ọrụ ma kwuo na a na-akọ ndị ọrụ ọnụ ma ọ bụrụ na ha arụsịghị ọrụ ike.

  15. Ndị agha ewepula nwaanyị onye agha boro ndị isi ya ebubo ịmetọ ya n'ụzọ mmekọ

    Ndị agha Naịjirịa ebe ha na-anabata onyeisi ha dịka omenala ha si dị

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa bụ Onyema Nwachukwu ekwuola na ha ewepula otu nwaanyị bụ onye agha boro ndị isi ya ebubo ịmetọ ya n'ụzọ mmekọ.

    Nwaanyị onye agha ahụ boro ebubo n'akara Tiktok ya n'ọnwa Jenụwarị afọ a na ụfọdụ ndị isi ya na-echigbu ya ma na-eme ndụ ya ko o sie ike.

    Ebubo ndị ọzọ o boro ya bụ ịgba ya ọgwụ ọ na-amaghị aha ya nakwa ịwepu ya na be ya ma kpọchie ya n'ụlọọgwụ na-agwọ ọrịa ụbụrụ ebe ọ chọghị ịnọ.

    O kwuru na e mere ya ihe a niile mgbe ọ gbajọrọ ọchịchọ onyeisi ya ka ha nwee ọyị.

    Mana Onyema kwuru na ejiri nwayọ wepu nwaanyị ahụ n'aha ọnọdụ ahụike ya dịka emechara nyocha banyere ebubo ndị o boro ndị isi ya atọ.

    Ha kwuru na ha chọpụtara na ndị isi ya emeghi ihe nwaanyị ahụ si na ha mere na kama na o nwere nsogbu ahụike ụbụrụ.

    "O ka ga-anara ụgwọ ezumike nka ndụ ya niile nakwa uru ndị ọzọ ndụ ya niile" ka Nwachukwu kwuru n'ozi ọ gbasara ndị ntaakụkọ.

  16. Onyeisiala Tinubu ajụla ibinye aka n’iwu ga-agbatị afọ ọrụ nke ndị ọrụ n’ụlọ omeiwu

    Tinubu ajụla ibinye aka n’iwu ga-agbatị afọ ọrụ nke ndị ọrụ n’ụlọ omeiwu

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Naịjirịa, Bola Ahmed Tinubu ajụla ibinye aka n’iwu chọrọ ịgbatị afọ ole ndị ọrụ n’ụlọ omeiwu ga-anọ tupuu ha alaa ezumike nka.

    Iwu ahụ chọrọ ka e tinye afọ ọzọ n’elu afọ ole ndị ọrụ n’ụlọomeiwu sịneti nakwa ndị nnọchịteanya dị na steeti iri atọ na isii dị na Naịjirịa ga-arụ ọrụ tupu ha alaa ezumike nka.

    Iwu ahụ chọrọ ka e bulie afọ ndị ọrụ ahụ site n’afọ ịrị atọ na ise (35) ruo afọ ịrị anọ (40).

    Ọzọ bụ ka e mee ka afọ ha ji ala ezumike nka site na afọ iri isii (60) ruo afọ iri isii na ise (65).

    Mana oge onyeisi ndị Sịneti bụ Godswill Akpabio na-agụpụta ozi si n’ụlọọrụ onyeisiala, Bola Tinubu, o kwuru na onyeisiala ajụla ibinye aka n’iwu ahụ.

    N’ihe Godswill Akpabio gụpụtara ka Tinubu kwuru “ka m lechara anya ma tulee uche nke ọma gbasara iwu a, a jụrụ m ịbinye aka na ya”.

    Tinubu ji ohere ahụ kelee ndị ụlọomeiwu nakwa ndị mepụtara atụmatụ iwu ahụ.

    Cheta na iwu ahụ malitere na sịneti nke asaa, mana sịneti nke asatọ etinyeghị ọnụ na ya.

    Mana o mechara nwee ihe mkpọbiụkwụ oge sịneti nke itoolu nabatachara ya, tupu sịneti nke iri anabata ya ọzọ ma mee ka ọ bụrụ iwu ma zigara ya onyeisiala Naịjirịa bụ onye jụrụ na ya agaaghị abinye aka n’ime ya.

  17. Ọtụtụ puku mmadụ agbapụla n’ụlọ ha dịka 558 nwụrụ na mwakpo Izrel mere na Lebanon

    Ọtụtụ ụgbọala ndị na-agbaọsọ nọ n'ahịrị n'okporoụzọ banyere Beirut

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ọtụtụ ụgbọala ndị na-agbaọsọ nọ n'ahịrị n'okporoụzọ banyere Beirut

    Ọtụtụ mmadụ na mpaghara ọdịda mba Lebanon agbapụla n’ụlọ ha dịka mba Irel na-aga n’ihu na mwakpo ha na-eme na Hezobollah.

    Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na Lebanon bụ Firass Abiad, kwuru na mmadụ 558 nwụrụ ebe ihe karịrị 1,500 meruru ahụ ụbọchị Mọnde 23 Septemba site na mwakpo ahụ ha kọwara dịka nke a na-ahụbeghị ụdịrị ya kemgbe afọ 1990.

    Firass Abiad gwara ndị ntaakụkọ na ndị ọrụ ahụike rụrụ ọrụ iji nye ndị meruru ahụ nleta ma kwuo na ndị ọrụ ahụike chọrọ nkwado.

    O kwuru na ha na-atụanya na mwakpo nke ka njọ agaghị eme

    Ụlọọrụ IDF kwuru na Hezbollah gbara ọtụtụ ogbunigwe na mpaghara ugwu Izrel mana Izrel gbochiri ya tupu o ruo ogige ahụ.

    Mwakpo dị n’oke ala mba abụọ akawanyego njọ kemgbe ọ malitere n’ọnwa Ọktoba 7.

    Hezbollah kwuru na mwakpo ahụ ga-aga n’ihu ruo mgbe a kwụsịrị ọgụ a na-anụ na Gaza

  18. A chọtala ozu mmadụ 30 na-ere ere n'ime ụgbọ na mmiri mba Senegal

    Ndị mmadụ na-ejikarị ụdịrị ụgbọ a agafe rue Canary Islands

    Ebe foto si, AFP

    Opekatampe ihe ruru ozu mmadụ 30 abụla ihe a chọtara n'ime ụgbọ nọọrọ onwe ya na mmiri mba Senegal dịka ndị agha mba ahụ si kwuo.

    Ndị na-akụ azụ kọọrọ ndị agha mmiri mba ahụ maka ụgbọ osisi nke ha hụrụ na mmiri dị nso n'isi obodo mba ahụ bụ Dakar dịka ebubatara ya n'ọdọ ụgbọmmiri n'ụbọchị Monde.

    "A malitela ịchọpụta aha na njirimara ndị nwụrụ anwụ mana ọ dịghị ofele maka etu ozu ndị ahụ si ree ere" ka ozi nke ndị agha wepụtara n'akara X ha kwuru.

    Ọnụọgụgụ ndị mbịarambịara si mba Sengal achọ iru mba Spen arịala elu na nso nso a.

    Gọọmentị mba Senegal amapụala atụmatụ afọ iri ga-enye aka belata nke a dịka ọtụtu mmadụ na-anwụ kwa ụbọchị na ya bụ njem enweghi isi.

    N'agbanyeghi na ihe a na-ebute oke ọnwụ, ndị ntorọbịa ka jisike achọ ụzọ ahụ maka ihe isi ike, ụbịam, enweghi ọrụ aka, nakwa ọnọdụ gbagharịa dị na mba ha.

  19. E gbuola mmadụ 100 na Lebanon site na mwakpo mba Izrel

    Anwụrụ ọkụ n'ogige mba Izrel wakporo na Lebanon

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Anwụrụ ọkụ n'ogige mba Izrel wakporo na Lebanon

    Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Lebanon ekwuola na ihe ruru mmadụ 100 anwụọla ebe ọtụtụ narị meruru ahụ dịka Izrel na-aga n’ihu awakpo Hezbollah.

    Izrel kwuru na ha na-aga n’ihu awakpo Hezbollah ma kwuo na ndị bi n’ogige ndịda Lebanon enwetela ozi ekwenti gwara ha ka ha kwapụ n’ogige ahụ ndị otu Iran na-akwado.

    Otu mịnịsta na Lebanon kọwara ozi ahụ dịka nke na-ebụta agha uche, ebe mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Lebanon bụ Yoav Gallant kwuru na nwakpo ahụ ga-aga n’ihu ruo oge ebumnobi ha bụ ịkpọghachita ndị bi na mpaghara ugwu n’ụlọ ha.

  20. Kpochaa ọwa mmiri gị, ide mmiri na-abịa - NiMET

    Ogige ide mmiri mebiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ Nigeria Meteorological Agency (NiMET) ebuola amụma maka oke égbè eluigwe ga-anọ ụbọchị atọ na Naịjirịa, ebe ọ ga-aka njo na Sokoto, Kebbi na Borno steeti.

    Akwụkwọ amụma ahụ nke ha wepụtara ụbọchị Sọnde 22 Septemba kwuru na a na-atụ anya egbeigwe ahụ na Borno, Yobe, Jigawa, Taraba, Adamawa, Gombe, Bauchi, Kano, Katsina, Kaduna, Zamfara, Kebbi na Sokoto.

    Ha gara n’ihu kwuo na a ga-enwe egbeigwe n’ụtụtụ n’Abuja, Niger, Nasarawa, Benue, Plateau na Kwara steeti.

    NiMET kwuru na oke mmiri ga-ezo na Legọs, Enugu, Ebonyi, Imo, Bayelsa, Akwa-Ibom, Cross Rivers nakwa Rivers steeti ma dọọ ndị bi na mpaghara ide mmiri na-emekarị, ka ha kwapụ.

    Cheta na oke Ide mmiri chụpụrụ puku mmadụ n’ụlọ ha na Maiduguri, isi obodo Borno steeti ka ọdọ mmiri Alau Dam tiwara.

    Ckụkọ kwuru na ọtụtụ ndị ihe ahụ metụtara gbagara n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ iji nweta chekwa ka ihe ahụ mere.

    Kọmishọna na-ahụ mgbasaozi na steeti ahụ bụ Usman Tar kpọkuru ndị niile bi n’ogige ọdụ mmiri ahụ tiwara hapụ ebe ahụ iji chekwaa onwe ha na ezinaụlọ ha.

    N'aka nke ọzọ gọọmenti etiti nọrọ n'izuụka gara aga dọọ aka na nti na enwereike inwe ide mmiri site na mmepe Lagdo Dam dị na mba Cameroon.