Gọvanọ ndị ọzọ kwesịrị iṅomi etu Peter Mbah si arụ ọrụ n'Enugwu Steetị - Onyeisiala Tinubu

Tinubu na Peter Mbah
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onyeisiala Naijiria bụ Bola Ahmed Tinubu ekwuola ka ndị gọvanọ ọzọ ṅomie etu gọvanọ Peter Mbah nke Enugwu Steeti si arụ ọrụ

O kwuru nke a n'ụbọchị Satọde 4 Jenụwarị 2025 mgbe ọ gara njem nleta n'Enugwu Steetị bụ ebe ọ gbapere ọtụtụ ọrụ dị iche iche gọọmentị Enugwu rụrụ.

Ọ wụchiri n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere mbụ nke ehihe ma si ebe ahụ gawa ebe dị iche iche a rụgasịrị ọrụ, gụnyere ụlọakwụkwọ "Smart school" dị na GTC Enugwu nakwa ebe ndị ọzọ.

Dịka Onyeisiala Tinubu na-agbape ụfọdụ ọrụ ndị a, ọ kwara na ọ bụ n'ihi ọrụ ọma ọ hụrụ gọvanọ Mbah na-arụ mere o jiri bịa njem nleta a ma gwaa ndị gọvanọ ọzọ ka ha ṅomie ya.

Ọ gara n'ihu kwuo "Peter Mbah bụ ezigbo enyi m. Makana onye ọbụla na-arụ ezigbo otụ bụ enyi m"

"Maazị Peter Mbah si n'agalaba ndị kwụụrụ onwe ha bụ "private sector" wee bata n'ọchịchị ma na-eme ọfụma. O gosiri na anyị kwesiri inyekwu ndị si na ngalaba 'private sector' ohere ka ha bata na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

ọ gbapere ọtụtụ okpọrọ ụzọ, na ebe ezumezu .

Ụfọdụ ọrụ ndị Onyeisiala Tinubu bịara gbapee n'Enugwu

Ụfọdụ ọrụ ndị ọzo Onyeisiala Tinubu gbapere na njem nleta ya a gụnyere,

  • Ụlọakwụkwọ (Smart Green Schools) iri atọ a rụrụ ọhụrụ
  • Ụlọọgwụ nlekọta ahụike iri isii
  • Okporoụzọ obodo dị iri itolu
  • Ụlọ ezumezu a kpọrọ "Enugwu International Conference centre".
  • Ọdọ ndị nchekwa a kpọro Command and Control centre -nwere ọtụtụ ụgbọala ndị nchekwa ruru otu narị na iri ise.
Ụlọọrụ Command and Control Centre dị n'Enugwu steeti
Ụgbọala ndị ọrụ nchekwa

Ọhanaeze Ndigbo na-atụ anya na Tinubu ga-atọhapụ Nnamdi Kanu

Njirimara Ọhanaeze Ndigbo na Tinubu

Ebe foto si, BBC, Tinubu/X

Ọhanaeze Ndigbo kwuru na ha ji obi ha niile anabata Onyeisiala Bola Tinubu maka njem ọrụ ọ na-aga n'Enugwu steeti.

N'ozi odeakwụkwọ mgbasaozi Ọhanaeze Ndigbo bụ Alex Ogbonnia wepụtara n'aha onyeisioche ha bụ Nze Ozichukwu Chukwu, o kelere onyeisiala maka ihibe ụlọọrụ South East Economic Commission, nhọpụta Vice Admiral Emmanuel Ikechukwu Ogalla dịka onyeisi ndịagha mmiri, nhọpụta David Umahi dịka Minista na-ahụ maka ọrụ nakwa ụmụafọ Igbo ndị ọzọ ọ họpụtara n'ọkwa dị iche iche.

Ha jikwa ohere ahụ rịọ Tinubu ka o nye iwu maka ntọhapụ Nnamdi Kanu bụ onyendu IPOB iji nwee ike nweta obi ndị Igbo nakwa ụmụafọ Naịjirịa ndị hụrụ ihe ọma n'anya.

Ọhanaeze Ndigbo gara n'ihu kelee aka na-achị Enugwu steeti bụ Peter Mbah maka atụmatụ ọrụ ndị ọ na-arụ na steeti ahụ ma keleekwa aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma maka ihe na-enyere ụgbọelu aka ifedata n'abalị ọ rụnyere n'ọdọụgbọelu Sam Mbakwe Airport dị n'Owere.

Onyeisiala Tinubu ga-awuchi Enugwu steeti taa

Peter Mbah na Tinubu

Ebe foto si, Peter Mbah, Tinubu/X

Gọọmentị Enugwu steeti e kwuputala na onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ga-abia Enugwu steeti n'ụbọchị taa bụ Satọde 4 Jenụwarị 2025 maka ịgbape ụfọdụ ọrụ mgbanwe gọọmenti steeti ahụ rụrụ.

Aka na-achị Enugwu steeti bụ Gọvọnọ Peter Mbah kwuru nke a n'akara sosha midịa ya.

Mbah kwuru na ọrụ mgbanwe steeti ahụ gụnyere ụlọakwụkwọ (Smart Green Schools) iri atọ a rụrụ ọhụrụ, ụlọọgwụ nlekọta ahụike iri isii, okporoụzọ obodo dị iri itolu ya na ụgbọala ndị nchekwa dị otu narị na iri ise nakwa ihe ndị ọzọ dị iche iche.

O kwuru na ọrụ ndị a bụ iji gosipụta ma mezuo nkwa gọọmentị steeti ahụ kwere n'ihe gbasara agụmaakwụkwọ, ahụike, ọganihu na nchekwa obodo.

Ọ gara n'ihu kwuputa na obi dị ndị Enugwu steeti ụtọ ịnabata onyeisiala Naịjirịa na steeti ahụ.