Gọmentị Enugwu akwatuola ụlọ e ji atọ ndị mmadụ n’Owerre Court, Agwu

Ebe foto si, Enugu state's Govt House
Gọmentị Enugwu steeti site n’ụlọọrụ Enugu Capital Territory Development Authority (ECTDA) akụkpọọla ụlọ ha kpọrọ ụlọ ndị ntọ ji akpamkpa n’Owerre Court dị n’okpuru ọchịchị Awgu na steeti ahụ.
BBC Igbo họtara n’ụlọeru ahụ gọmentị Enugwu kụkpọrọ dị na etiti ụzọ ma na-aghọta na ọ bụ ebe ndị ntọ na-edose ndị ha tọọrọ ma bụrụkwa ebe ha dọwara ngwa agha dị icheiche.
Oge a gbara onyeisi ndị ECTDA bụ Sunday Anya ajuju ọnụ ka ọ gwara ndị nta akụkọ sị “ihe unu na-ahụ ugbua bụ agha gọọmentị Enugwu na-ebuso mpụ na ndị omekome n’Enugwu”
“Anyị bịara ebe a ka anyị kwatuo ụlọ e ji eme mpụ na arụ dị icheiche n'Enugwu ọkachasị na mpaghara a.”

Ka anyị sị chọpụta ihe na-eme n’ụlọ ahụ - Anya
Sunday Anya kwuru sị “n’abalị 25, nke ọnwa Julaị afọ 2024 ka ndị ntọ tọọrọ otu nwoke n’Enugwu, kpụrụ ya kpochie ya n’ụlọ a.
Ha manyere n’ike ka ya na ndị ezinaụlọ ya kpaa ma kwunyere ndị ntọ ahụ akatamkpo ego”.
“Mana Gọmenti Enugwu hụrụ ihe niile na-eme na mpaghara ahụ sịte n’igwe nnyocha anyị ji ahụ ihe na-eme n’Enugwu”.
“Nke a mere ndị ọrụ nchekwa jiri nwuchie n’ebe ahụ ma jide ndị niile ha hụrụ sọ eme ntọ ahụ, mana onyeisi ha gbara ọsọ n’ụbọchị ahụ”
“Anyị chụwara onyeisi isi ndị ntọ ahụ banye n’Ebonyi steeti, nke mere o ji gbalaga, gaa na Legos bụ ebe anyị nọ nwere jide ya ma kpụlata ya n’Enugwu”.
Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ otu ndị ahụ rụrụ ụlọ ha ji-atọ ndị mmadụ n’Ogbeke dị n’ime Nike ma rụkwaa ụdịrị ụlọ ahụ n’Abakpa bụ nke gọọmentị kwatuchara.

Ihe anyị ga-eme onye e jị ụlọ ya nwere na-atọ ndị mmadụ - ECTDA
Sunday Anya bụ onyeisi ọrụ n’ECTDA dọrọ ndị niile nwere ụlọ ka ha gbaa mbọ ka ndị omekome hara iji ụlọ ha mere ọdụ ma ọ bụ ebe ha ji akpa mkpamkpa.
Na okwu ya “ihe a bụ ịdọ aka na ntị dịara ndị niile nwere ụlọ; Gọmentị Enugwu agaghị anaba mmadụ ị sị na ya anọghị nsọ, na ya nọ na mba ofesi ma ọ bụ na ọ bụ nwanne ya nabatara ndị jị ụlọ ahụ atọ ndị mmadọụ”.
“Oge ọbụla mpụ ma ọ bụ arụ mere na ụlọ gị dị ntọ, ịgbụ ọchụ na ihe ndị ọzọ megidere iwu; mara na gọọmenti Enugwu ga-ejide gị ma kụkpọsịa ụlọ ahụ”.
Gịnị ka Gọmenti Enugwu ga-eji ala ahụ mee ugbua?


Ebe foto si, Govt house, Enugu
N’okwu Sunday Anya “Gọmenti Enugwu bụzị onye ala ụlọ a anyị kwaturu ugbua.”
“Gọmentị Enugwu nwereike ị ji ala ahụ rụpụta ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ ma ọ bụ ihe ga-abara obodo niile uru”.
Cheta na Gọọmentị Enugwu steeti, site n’akwụkwọ ozi odeakwụ steeti ahụ bụ Ọkammụta Chidebere Onyia binyere aka kemgbe ọnwa ọgọst mara ọkwa na ha ga-ebido na-akụkpọsị ụlọ ọbụla e ji mee ntọ na steeti ahụ.









