Enugu steeti: Lee ihe na-esere ECTDA na EEDC

Ebe foto si, EEDC
Ụlọọrụ na-enye ọkụ latrịk bụ Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) na ndị ọrụ gọọmenti Enugwu steeti na-ahụ maka mmepe isi obodo a kpọrọ Enugu Capital Territory Development Authority (ECTDA) enweela nghọtaghie gbasara ọrụ ndị EEDC.
N’akwụkwọ ozi EEDC depụtara nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Emeka Ezeh zịgaara ndị ntaakụkọ, ha kwuru na gọọmenti Enugwu steeti ji EEDC ụgwọ ruru otu ijeri naịra (N1billion).
Emeka Ezeh dere n’ozi ahụ sị “anyị bịara ọrụ n’ụtụtụ tata hụ na ECTDA amachiela ụlọọrụ anyị; were igodo kpọchie ya”.
“Ihe a gbagwojuru anyị anya maka na enweghi etu ha sịrị kpọtụrụ anyị na mbụ”
“Ndị ọrụ nchekwa n’ụlọọrụ anyị gwara anyị na ọ bụ n’isi ụtụtụ mgbe o jiri ihe dịka ọkara gaa elekere mbụ (1:30am) taa ka ndị ECTDA bịara kpọchie ụlọọrụ anyị ma gwa ha na ọ bụ gọvanọ gwara ha”.
“Ha jikwa igodo kpochie ụlọọrụ anyị dị n’Abakpa, Awkunanaw na Ogui”.
“Enweghi ozi si na ECTDA kọwara ihe kpatara ihe ha mere”.
“Mana anyị na-eche na ọ bụ maka na anyị gwara ndị jị anyị ụgwọ na bido n’ụbọchị Tuzde 11 Juun 2024 bụ taata ka anyị ga-amalite ịwepụ ọkụ ha”.
“Gọọmenti Enugwu ji EEDC ụgwọ ruru otu ijeri naira (N1billion). Ọ dị mkpa na ndị mmadụ maara na anyị tinyere mita n’ọtụtụ ụlọọrụ gọọmenti Enugu. Nke a abụghị ego ndị na-enweghi mita”.
“E ji EEDC ụgwọ ruru otu narị ijeri naịra na asatọ (N108 billion) nke mere anyị ji malite ịwepụ ọkụ ndị ji anyị ụgwọ”.
Ihe Gọọmenti Enugwu steeti kwuru gbasara ebubo EEDC

Ebe foto si, EEDC
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Gọọmenti Enugwu apịasuola ụlọọrụ Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) n’ihi okpookpo ụgwọ ọkụ latrik nakwa etu ha siri kopụ ọkụ ụlọọrụ gọọmenti dị iche iche na steeti ahụ ma kọwaa ya dịka nke na-adịghị n’iwu.
Nke a dị n’ozi gọọmenti Enugwu zigaara onyeisi ụlọọrụ EEDC n’ụbọchị Tuzde 11 Juun 2024 site n’aka odeakwụkwọ steeti ahụ bụ Chidiebere Onyia.
Ozi ahụ kọwara ebubo EEDC bọrọ na Gọọmenti Enugwu ji ụgwọ ruru otu ijeri naịra na ụma atọ (N1.3bn) dịka okwu ụgha ma kwuo na ewezuga na gọọmenti mere ngwangwa kwụọ ụgwọ ọkụ latrik EEDC ziteere ya maka ọnwa Mee, na ọ kwụchaala ụgwọ ọkụ latrik maka ọnwa abụọ ndị ha ji ụgwọ ya na mbụ.
Gọọmenti Enugwu kpọrọ oku ka EEDC bipụta ụgwọ niile ahụ ọ sị na ya ji ka ndị nnyocha maara nke ekwe na-akụ lebara ya anya.
Ọ kpọkwara EEDC oku ka ha gbapụ ọsọ tinye igwe mita n’ụlọọrụ gọọmenti niile dịka ọ dị n’iwu NERC.
Ọ gwara EEDC ka o hichapụ ozi ahụ o bipụtara ma tighachi ọkụ latrik n’ụlọọrụ gọọmenti ndị e kopụrụ oku ha.












