Water Scarcity: Gọọmenti Enugwu ekwuola ihe mere mmiri ha kwere na nkwa anaghị agba

Ebe mmiri ga-na agba n'Enugwu
Nkọwa foto, Ebe mmiri ga-na agba n'Enugwu

Ndị ala-adị-mma n’ezu ohi paipụ na akụrụngwa eji etinye mmiri ọṅụṅụ n’ala na-akpa ike di egwu ugbua n’Enugwu.

Gọmentị Enugwu wepụtara ozi kọwaa na ha n'emebisi ọtụtụ ihe n’ime gburu gburu Enugwu nke mere na mmiri ọṅụṅụ pọmpụ agbabeghị n’uju otu okwesiri.

Cheta na ọchịchị Gọvanọ Peter Mbah kwere ndị Enugwu Nkwa na mmiri ọṅụṅụ ga na-agbazị ebe niile ka ọ gachara ụbọchị 180 ọ rigoro n’ọchịchị.

Iji mezuo nkwa ya, gọvanọ Peter Mbah mere mmemme ịgbape ya bụ pọmpụ mmiri na ụbọchị 25th Nọvemba 2023.

Site oge ahụ rute ugbua, ọtụtụ ndị bi n’Enugwu kwuru na ha enwebeghị mmiri, mana gọmenti kọwara na ha ka nọ n’ọrụ ili paipụ ndị tara nchara ma dọọkwaa paipụ rue ebe ndị orubeghi mbụ.

Ọ bụzị na ya bụ ọrụ iweta mmiri ebe ndị orubeghi ka a nọzi ugbua n’Enugwu tupu akụkọ na ndị omokome n’ezugasi akụrụngwa mmiri a na-apụtazị.

Ndị ohi gara n'ihu Holy Ghost Cathedral Enugwu zuo ohi paipụ ma mebisia Igwe ọrụ

Ihu Holy Ghost Cathedral Enugwu, ebe ndị ohi zuru paipụ mmiri ma mebisia akụrụngwa ndị ọzọ
Nkọwa foto, Ihu Holy Ghost Cathedral Enugwu, ebe ndị ohi zuru paipụ mmiri ma mebisia akụrụngwa ndị ọzọ

Ode akwụkwọ gọmentị Enugwu bụ Ọka mmụta Chidiebere Onyia gwara ndị nta akụkọ na ndị omekome gara ebe ndị ọrụ n’eli paipụ mmiri n’ogige Holy Ghost Cathedral Enugwu gaa zue ngwa ọrụ ha ma mebisia nke fọrọ afọ.

Mkpa mkpa ahụ mere na isi ụtụtụ ụbọchị ịse nke ọnwa Eprelụ afọ 2024 ka ọ kụrụ elekere abụọ nke isi ụtụtụ.

Ha kụrisiri akụrụngwa ma zuo ohi paipu eji enye mmiri ndị ọrụ debere ebe ahụ.

Gọmenti Enugwu gara n’ihu kọwaa na enwela ọtụtụ mgbe ndị omekome n’ezu ma na emebi ihe gọmenti dobere.

Ihe ndịa gụnyere, paipe mmiri, okporo ụzọ, ụlọ gọmenti, ụgbọala ma ọ bụ ihe ọbụla bụ nke gọmenti nwe.

Iji gbochie ụdị ọdachi a n’ọdịnihu, ha ewepụtala otu gbanụ gbanụ ga na echekwa ma n'ejide ndị ọbụla mebiri ihe gọmenti ma ọ bụ zuo ya n’ohi.

Gọmenti Enugwu ewepụtala otu gbanụ gbanụ ga echekwa ma nwude onye ọbụla zuru ma ọ bụ mebie ihe gọmenti

Otu gbanụ gbanụ ga-na echekwaba paipụ mmịrị na akụrụngwa gọmenti Enugwu steeti ọbụla.

Ebe foto si, ENSG

Nkọwa foto, Otu gbanụ gbanụ ga-na echekwaba paipụ mmịrị na akụrụngwa gọmenti Enugwu steeti ọbụla.

Ọrụ otu gbanụ gbanụ ahụ dịka Ọka mmụta Chidiebere Onyia siri kwuo bụ ichekwaba ihe ọbụla gọmenti rụrụ, ma jide onye ọbụla mebiri ya dika iwu obodo siri kwuo.

Ndị nọ na otu gbanu gbanu ahụ gụnyere ndị ọrụ National Security and Civil Defence Corps bụ NSCDC n’aha ịchafụ, ndị ọrụ ụwe ojii nakwa ọtụtụ ndị nkiti.

Ọrụ ha ga-amalite ozigbo ozigbo.

Iwu ha ga-eji rụọ ọrụ ha bụ “ Criminal Code Cap 30 Laws “ nke Enugwu Steeti.

Nkea pụtara na onye ọbụla zuru ihe gọmenti dobere ma ọ bụ mebie akụrụngwa gọmenti ga-atakụta ya aja makana aka gọmenti ga-akpara ma tụọ ya nkpọrọ.

'Anyị ahụbeghị mmiri pọmpụ gọọmenti Enugwu kwuru na ọ gbawala, ndị na-agbabu akwụsịla' - Ndị Enugwu

Mmiri n'Enugwu

Ụkọ mmiri ka na-anyụkwa ndị mmadụ ịkpakwụ n’ụfọdụ ebe n’Enugwu.

Ndị bi na gburu gburu Abakpa na Emene Enugwu etiela mkpu na ha ahụbeghi ya bụ mmiri pọmpụ gọomenti Enugwu kwuru na o bidola gbawa ebe niile.

Gọọmenti Enugwu mere mmemme mbido ya bu mmiri ọgbụgba ụbọchị 25 nke ọnwa Nọvemba n'afọ 2023 dịka o mechara ụbọchi 180 days gọọmenti Peter Mbah batara n’ọkwa.

Site mgbe ahụ ruo ugbua, ọtụtụ ebe a rụpụtara e si eku ya bụ mmiri ka tọgbọrọ chakoo.

'Anyị ahụbeghị mmiri pọmpụ kamgbe gọọmenti Enugwu kwuru na ọ gbawala' - Ndị Abakpa

Ebe a na-agba mmiri
Nkọwa foto, A rụchabeghi pọmpụ ụfọdụ ebe e wepụtara maka ịụ̀ba mmiri

Nchọpụta gosiri n'Abakpa ka ọ ka njọ, na Federal Housing, ebe e dobere maka iku mmiri anaghị agba, n'akụkụ nke green land ọ ka bụkwa otu ihe ahụ.

Na Bus stop Edinburg, ọnụ mmiri ahụ na-agbabu na mbụ anaghịzị agba, otu ahụkwa ka ọ dị n'ahịa Artisan nakwa ọtụtụ ebe.

Ndị bigasi na mpaghara dị icheiche tiri mkpu na ọṅụ ha nwere ka gọọmenti Enugwu gbapechara ya bụ mmiri adaala mba n’ihi na ha ahụghịzị mmiri.

Maazi Donald Ike bi n'Ugbo Paul Abakpa Nike kwuru ka gọọmenti cheta ndị Abakpa n’ihi na ha ahụbeghị mmiri cha cha kamgbe e kwuru na ọ gbawala.

“Naani ihe anyi hụrụ na gburu gburu Abakpa bụ na ha ka na-arụnye ogige mmiri ahụ, mana ebe ha rụchara anaghikwu agba agba. Ọ dị ka anyị bụ ndị bi n'Abakpa esoghi n’Enugwu”.

Water taps
Nkọwa foto, Mmiri ọgbụgba bụ nsogbu ndị Enugwu nwere

Oriakụ Evangeline Odoh rịọrọ gọọmenti Peter Mbah ka ọ mara na ndị Abakpa n'ebe ndị ọzọ ka na-atakwa ahụhụ mmiri n’Enugwu.

Ọrụ mmezi ụfọdụ ebe ahụ gọọmentị wepụtara a ga-na eku mmiri ka na-agakwa n’ihu.

Cheta na gọọmenti Peter Mbah kwere ndị Enugwu nkwa na mmiri pọmpụ ga na-agba ebe niile ka o mere abalị 180 ya bara n’ọchịchị.

Iji mezuo nkwa ya, ụbọchi 25 nke ọnwa Nov afọ 2023, Peter Mbah gbapere ya bụ mmiri, nke mere na ọtụtụ ebe gbawara ozigbo ozigbo.

Mana ugbua ka ọnwa abụọ gara, ọtụtụ ndị bị n'Enugwu na-ekwuzi na pọmpụ ogbe ha akpọchiela, ha wee na-ajụ gọmenti, ọ gini ji nkịta ọnwụ?