"Ndị niile nwere ụlọ maọbụ ala n’Enugwu ga-ebido ịkwụ gọọmenti akatamkpo ụgwọ ala kwa afọ"

Ụlọ niile nọ n'Enugwu Steeti ga na-akwụ gọọmentị ụtụala kwa afọ

Ebe foto si, Peter Mbah

Malite n’ọnwa Juun 2024, onye nwere ala maọbụ ụlọ n’Enugwu ga -akwụ ego ụtụ a kpọrọ “Land Use Charge” na Bekee nke gọọmenti Enugwu kwuru ha ga-eji rụọ ọrụ.

Onye kwupụtara nke a bụ Emmanuel Ekene Nnamani, onyeisioche ụlọọrụ na-anakọta ụtụ dị iche icche n’Enugwu a kpọrọ ‘Enugu State Internal Revenue Service’ (ESIRS).

Mazi Nnamani gwara BBC na ọ bụ ụlọ niile dị n’Enugwu kpọmkwem ga-akwụ ụtụ ahụ, ma ndị bi n’Enugwu mepere emepe ma ndị bi n’ime ime obodo.

Dịka o siri kọwaa, ndị nwere ụlọ maọbụ ala arụbeghi ụlọ na ya ga-akwụrịrị ya bụ ụtụ.

Lee ego ndị mmadụ ga-akwụ n'ụtụala a

Onye ọbụla nwere ụlọ n’Enugwu kwadobe ịkwụ gọmenti ọkpụrụkpụ egọ “Land Use Charge”

Iji maa atụ, ụlọ ọbụla dị n’ogige Ogui Rd na New Haven ga-akwụ puku naịra iri asaa na asatọ (N78,000) ebe ndị bi na “Independence Layout ga-akwụ (N230,000) n’isi ụlọ ọbụla kwa afọ.

N’aka nke ọzọ, ndị bi na Zoo Estate ga-akwụ (320,000), ụlọ niile e ji ere maọbụ emepụta ngwaahịa ga-akwụ ụtụ dị nnukwu karịa nke mmadụ bi na ya.

Iwu Naịjirịa ọ kwadoro ụtụala a?

Onyeisioche ụlọọrụ a na-ana ụtụ kwuru na iwu Naịjirịa kwadoro onye ọbụla rụrụ ụlọ ịkwụ ya bụ ụtụ kwa afọ n’isi ụlọ ya.

Ọ kọwara ụtụala a maliterela kamgbe ọtụtụ afọ steetị ndị dịka Legọs steeti, Oyo, Ogun na ndị ọzọ, ma kwuo na steeti dịka Imo, Anambra na Ebonyi na-amalitekwa nke ha nwayọọ nwayọọ.

Gịnị ga-eme onye dara iwu a?

Onye ọbụla nwere ụlọ n’Enugwu kwadobe ịkwụ gọmenti ọkpụrụkpụ egọ “Land Use Charge”

Nnamani kwuru na ya na ndị ọrụ ya ga na-agagharị ugbua na-eme mkpọtụ, agwa ndị mmadụ maka ụtụ a.

“Anyị na-eme ka ndị Enugwu mara maka ụtụ ahụ na redio, TV nakwa na soshal midịa. Anyị na-ejikwa ndị na-akụ ekwe agagharị n’ime obodo ịgwa ndị mmadụ na onye ọbụla dara iwu ahụ ga-anụ ụda ya.

Ntaramahụhụ dịịrị onye ọbụla nwere ụlọ n’Enugwu jụrụ ịkwụ ụgwọ ya gụnyere na gọọmentị ga-anara ya ụlọ ahụ ma kpụpụ ya n’ụlọikpe na-ahụ maka nnakọ ụtụ.

Ọ bụrụkwanụ ala arụbeghị ụlọ na-ya, gọọmenti ga-ewere ya resị onye ọbụla ji ego ma dị nkwadobe ịkwụ gọọmenti ego ụtụ ‘Land Use Charge’.

Nnamani chetaara ndị Enugwu na ala niile bụ nke gọọmentị, ma nke ndị nna nna nyere ụmụ ha ma nke mmadụ zụrụ ma rụọ ụlọ n’ime Enugwu mepere emepe.

O kwuru na “olileanya anyị bụ na Enugwu steeti ga-enweta opekatampe ijeri naịra iri abụọ (N20bn) site na ‘Land use charge’ n’ime otu afọ.”