Gịnị mere Labour Party achịtaghị aja na ntuliaka Okpuruọchịchị Abia Steeti?

Ebe foto si, Alex Otti/Labour Party/Facebook
Dịka Labour Party (LP) nọ n’ọchịchị Gọọmentị Abia Steeti, ọtụtụ ndị tụrụ anya na ha ga-eme ọfụma ma a bịa na ntuliaka Okpuruọchịchị nke steeti ahụ.
Mana mpụtara ntuliaka a nke ụlọọrụ Abia State Independent Electoral Commission (ABSIEC) kpọpụtara gosiri na LP emerighi ọbụnarị otu Okpuruọchịchị; ajụjụ a bụrụ gịnị kpatara nke a?
BBC Igbo kpọtụụrụ onye Onyeisioche Labour Party na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ Ceekay Igara, o kwuru na ụlọọrụ haziri ya bụ ntuliaka kụrụ afọ n’ala n’usoro ha ji hazie ya.
O kwuru na a tụghị vootu n’ebe dị iche iche n’Abia Steeti mana ụlọọrụ ABSIEC wepụtara mpụtara ntuliaka n’ebe ndị ahụ.
O kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ tụrụ vootu mana na akụrụngwa e ji eme ntuliaka abịaghị ọsịsọ n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ, nke so metụta ntuliaka ahụ.
Igara gara n’ihu kwuo na pati ha bụ Labour ga-anọkọ mee nyocha banyere ntuliaka a tupu ọ na-ewepụta ozi ha n’uju.
Otu onye ntaakụkọ nọ n’Abia Steeti na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ihe o cheere mere ka LP ghara ịchịta aja na ntuliaka a bụ n’ihi esemokwu dị n’etiti ha n’Abia.
O kwuru na n’izuụka ole ma ole gara aga na ndị uweojii nwuchiburu Ceekay Igara n’ebubo iṅomi mmadụ, ibute ọgbaghara na ndị ọzọ.
Ndị uweojii kwuru na onye boro ya ebubo ndị a bụ onye na-arụ ọrụ dịka Onyeisioche LP n’Abia Steeti, bụ ọtụtụ kwenyere na ọ bụ site na ntuziaka Gọvanọ Alex Otti.
O kwuru na nke a mere ka Pati ahụ kewaa abụọ; ụfọdụ ndị dọnyere Gọvanọ Otti ebe ndị ọzọ dọnyere Igara ukwu.
Ọ gara n’ihu kwuo na n’ihi nke a na Gọvanọ Otti akwadoghi Labour Pati azụ n’oge a na-ahazi ntuliaka ebe kepukepu na-ekwu na ọ kwadoro ndị ZLP.
Mana o nweghi ihe akaebe ọbụla gosiri na Gọvanọ Otti kwadoro ZLP maọbụ Pati ọzo n’oge ntuliaka Okpuruọchịchị Abia Steeti
Etu ZLP si zakọrọ ọkwa ọchịchị na ntuliaka Okpuruọchịchi Abia Steeti

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Zenith Labour Party (ZLP) kachasị nwete ọkwa ọchịchị na ntuliaka Okpuruọchịchị Abia Steeti e mere n’ụbọchị Satọde 25 Nọvemba 2024.
ZLP nwetere mmeri n’Okpuruọchịchị iri na ise (15) n’ime Okpuruọchịchị iri na asaa (17) dị na steeti ahụ ebe Young Progressive Party (YPP) meriri n’abụọ fọrọ afọ.
Nke a bụ dịka Ọkammụta Chima George bụ onyeisi Abia State Independent Electoral Commission (ABSIEC), ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka si kwuo.
George gara n’ihu kwuo na ntuliaka ahụ nke Pati ruru iri na abụọ (12) sonyere na ya, gara ọfụma ka e si tụọ anya ya na-enweghi ọgbaghara ọbụla
Na ntuliaka ahụ, ZLP meriri n’Okpuruọchịhị Isiala Ngwa North, Ikwuano, Arochukwu Isiala Ngwa south Isuikwuato, Ohafia, Bende na Umunneochi.
Ndị ọzọ gụnyere Obingwa, Ukwa East, Umuahia South, Umuahia North, Ukwa West, Aba North na Aba South.
Okpuruọchịchị abụọ ebe YPP meriri bụ Osisioma na Ugwunagbo.
A ka na-eche mpụtara ntuliaka ọkwa Kaụnselọ bụ nke a na-atụ anya n’oge na-adịghị anya.
Mgbe gọvanọ Alex Otti tụrụ vootu ya

Aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti atụọla vootu nke ya na ntụliaka Okpuru ọchịchị Abịa steeti.
Otti tụrụ vootu ahụ n'ogige ntụliaka ya bụ Unit 017 Ahiafor Umuru-Umuehim Nvosi dị n'Okpuru ọchịchị Isialangwa South.
Oge ọ tụrụ vootu ahụ bụ mgbe o jiri nkeji iri na itolu gaa elekere iri na abụọ nke etiti ụbọchị (12:19pm).

Ọnọdụ ndị n’ọchị, ndị n’akwa emejupụtala ntụliaka Okpuru ọchịchị Abịa steeti

Ụfọdụ mmadụ egosila iwe na enweghị afọ ojuju na ntụliaka Okpuru ọchịchị na-aga n’ihu ugbua n’Abịa steeti n’ihi ngwa ntụliaka e butere n’azụ oge na mpaghara ụfọdụ tinyere ntụliaka na-amaliteghị n’oge.
N’ogige ntụliaka 0013 dị n’Itaja Obuohia Olokoro, enweghị onye hụrụ ndị ọrụ ABSIEC na ngwa ntụliaka dịka ọ gachara elekere atọ ntụliaka malitere.
Ọnọdụ ahụ mere ka ka ndị chọrọ ịtụ vootu na-abịa ma na-alakwa.
N’ụfọdụ mpaghara ndị ọzọ dịka na Saint Joseph Primary School Ụmụahịa, ntụliaka amaliteghị n’ihi na ahụghị akwụkwọ ndekọ okwe vootu bụ ‘result sheet’.
Oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, onye ji aha otu Peoples Democratic Party (PDP) azọ ọkwa Onyeisioche Umuahia South bụ Barr Peter Asagwara kwara arịrị ma boo ebubo na ahụghị akwụkwọ ndekọ okwe vootu n’ọtụtụ ogige ntụliaka.
N’otu aka ahụ, e nwere ndọghachiazụ na Wọọdụ 7 Amasa Ntigha dị n’Okpuru ọchịchị Isiala Ngwa North dịka ụgbọala buuru ngwa ntụliaka gbafuo.
Ka o sinadị, onye omeiwu etiti na-anọchiteanya Isiala Ngwa North na South bụ Ginger Onwusibe etoola ụzọ udo ntụliaka ahụ si aga gburugburu Abịa steeti.
Lee ka ntụliaka Okpuru ọchịchị si aga n'Abịa steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ụbọchị taa bụ Satọde 2 Nọvemba 2024 ka a ga-ahazi ntụliaka Okpuru ọchịchị n'Abịa steeti.
Ntụliaka ahụ ga-adị n'ime wọọdụ otu narị na iri asatọ na anọ (184) dị na steeti ahụ dịka a ga-eji ya họpụta ndị isioche Okpuru ọchịchị iri na asaa (17) na ndị nnọchiteanya 'councillor' ha.
A tụrụ anya na pati iri na itoli (19) ga-esonye na ntụliaka ahụ.
Ọkankụzi George Chima bụ Onyeisioche ụlọọrụ na-ahazi ntụliaka na steeti ahụ, Abia State Independent Electoral Commission (ABSIEC) kwuru na ntụliaka ahụ bụ nke agaghị enwe nrụrụaka ọbụla.
Ka o sinadị, Gọọmenti Abịa steeti amachiela ngagharị ndị mmadụ maọbụ ụgbọala n'oge ntụliaka ahụ iji hụ na e nwere ezi nchekwa ma hụkwa na e gbochiri ọnọdụ tigbuo zọgbuo.
Dịka gọọmenti steeti ahụ siri kwuo, mmachi ahụ ga-amalite n'ime ndeeri ụbọchị Fraịde 1 Nọvemba ma kụrụ ọnụ n'elekere anọ nke mgbede n'ụbọchị Satọde 2 Nọvemba 2024.









