Gịnị bụ ọrụ Gọọmenti Okpuru ọchịchị na Naịjirịa?

Njirimara otu jịkọrọ ndị isioche okpuru ọchịchị Naịjirịa

Ebe foto si, ALGON Website/BBC

Nkọwa foto, Njirimara otu jịkọrọ ndị isioche okpuru ọchịchị Naịjirịa
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Na nso nso a, ọtụtụ steeti na Naịjirịa emeela ntụliaka Okpuru ọchịchị iji họpụta ndị isioche Okpuru ọchịchị ha dị iche iche.

Steeti ndị a gụnyere Enugwu, Akwa Ibom, Anambra, Riva, Jigawa, Kogi, Imo, Adamawa, Benue steeti na dị ọzọ.

Abịa n’ọchịchị, gọọmenti Okpuru ọchịchị bụ otu ogogo gọọmenti dị oke mkpa n’ihi na ọ bụ ya bụ nke dị ndị obodo nso karịa.

Mana mmadụ ole taa maara ọrụ na ihe gọọmenti Ọkpuru ọchịchị ha kwesịrị ị na-eme maka ọdịmma ha?

Ndị n'ebinye aka na ntụliaka okpuru ọchịchị n'Enugwu na Riva steeti

Ebe foto si, Getty Images/Frank Ndubuisi Mbah/Facebook

Nkọwa foto, Ndị n'ebinye aka na ntụliaka okpuru ọchịchị n'Enugwu na Riva steeti

Ihe iwu kwuru banyere ọrụ gọọmenti Okpuru ọchịchị

Ụlọọgwụ Primary Health Centre dị n'Abia na Enugwu steeti.

Ebe foto si, Primary Health Centre Enugu and Abia State

Nkọwa foto, Ụlọọgwụ Primary Health Centre dị n'Abia na Enugwu steeti.

Dịka iwu Naịjirịa siri kwuo, Gọọmenti Okpuru ọchịchị nwere ọtụtụ ọrụ ha na-arụ iji hụ na ndị obodo nwetara uru ọchịchị onye kwuo uche ya.

Iwu Naịjirịa nyere onyeisioche Okpuru ọchịchị ikike imepụta iwu Bekee kpọrọ 'by-laws' maka nchịkọta Okpuru ọchịchị ya ma rụọ ọrụ dị iche iche.

Ọrụ ndị a gụnyere itinye ọkụ okporoụzọ maka nchekwa, ịrụ ụfọdụ ụzọ dị iche iche n'Okpuru ọchịchị ha, oge ụfọdụ ọ bụ Gọọmenti Okpuru ọchịchị na-eleta ụlọọgwụ dị n’Okpuru ọchịchị nke Beeke kpọrọ ‘primary hospitals’ nke Gọọmenti Steeti rụrụ maka nleta ndị bi n'ime obodo.

N'aka nke ọzọ, Gọọmenti Okpuru ọchịchị na-achịkọta ma hazie ụlọ azụmaahịa nakwazi ụtụ ndị na-azụ ahịa na-atụ, nke a bụ iji mee ka ọnọdụ azụmahịa guzosie ike.

Abịa n'ihe gbasara obodo ịdị ọcha, Gọọmenti Okpuru ọchịchị na-ahụ maka nkpocha na nzacha ma tinye akụrụngwa e ji etinye ure ure n'ebe dị iche iche n'obodo.

Ha na-anakọta ụtụ dị iche iche ma na-enye ikike dị cihe iche dịka ikike ndị ọgbaatumtum, ụgbọala keke nakwa ikike ndị ọzọ.

Ndị na-achụnta vootu n'okpuru ọchịchị di n'Enugwu steeti

Ebe foto si, Dan Anike/Facebook

Nkọwa foto, Ndị na-achụnta vootu n'okpuru ọchịchị di n'Enugwu steeti

Gọọmenti Okpuru ọchịchị na-elekọta akụrụngwa gọọmenti tinyere n'okpuru ọchịchị ha maka ọdịmma ọhanaeze.

Ịhụ maka ọdịmma ndị ọrụ ugbo, ịrụpụta ogige ọgbakọ (Town hall), inye ikike dị iche iche nakwa ịhụ na ụlọọrụ Okpuru ọchịchị na-arụ ọrụ etu o kwesịrị nakwa ihe ndị ọzọ.

N'aka nke ọzọ, abịa na ntụliaka, ọ bụ Gọọmenti Okpuru ọchịchị na-ahụ na e nwere ezi ọzụzụ nye ndị bi n'ime obodo banyere etu e si eme ntụliaka. Oge ụfọdụ, ndị na-azọ ọkwa dị iche iche na-aga n'Okpuru ọchịchị maka achụm nta vootu maka na ha kwenyere na ọ bụ ebe ahụ ga-enye ha ọnụọgụ vootu ha chọrọ iji nweta mmeri.