APC azakọrọla mmeri na ntụliaka Okpuru ọchịchị Imo steeti

Ọkolọtọ pati APC

Ebe foto si, @OfficialAPCNg

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) enwetala mmeri n'ime Okpuru ọchịchị iri abụọ na asaa (27) e nwere n'Imo steeti.

Ha nwetakwara mmeri n'ime wọọdụ narị atọ na ise (305) e nwere na steeti ahụ n'oge ntụliaka Okpuru ọchịchị a haziri n'ụbọchị Satọdee 21 Septemba 2024.

Ụlọọrụ Imo State Independent Electoral Commission (ISIEC) kpọpụtara mpụtara ntụliaka ahụ n'isi ụlọọrụ ha dị n'Owerri n'ụbọchị Sọnde 22 Septemba 2024.

Ka o siladi, Onyeisioche ISIEC bụ Charles Ejiogu ekwupụtaghị ọnụọgụ vootu pati ndị sonyere na ntụliaka ahụ nwetara kama ọ sịrị na ya ga-ewepụta ozi niile gbasara ntụliaka ahụ n'uju oge na-adịghị anya.

Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP amalitela ime ngagharịiwe n’Edo steeti

Ndị otu PDP na-eme ngaghariiwe n'ihu ụlọorụ INEC dị n'Edo steeti

Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) na-eme ngagharịiwe n’akụkụ ebe a na-akpọpụta okwe ntụliaka Gọvanọ Edo steeti.

PDP na-akatọ okwe ntụliaka ndị INEC na-akpọpụta ma kwuo na ha anabataghị ya.

Mana ka o siladị, ọ bụ onye APC bụ Monday Okpebholo kacha nwete vootu na ndị niile a kpọpụtara ugbua.

Davido na-agwa ndị Edo: ‘Unu ehikwela ụra’, leekwa ka nke Enugwu na Imo si gaa

Ụmụ Edo steeti, unu arakwana ụra’ – Davido

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụ Edo steeti, unu ehikwela ụra’ – Davido

Onye na-akụ egwu a ma ama dịka Davido nke ezegbo aha ya bụ David Adeleke agwala ndị Edo steeti ka hara ihi ụra dịka a na-agu vootu ha tụrụ.

Davido mere ka a mata nke n’akara X soshal mịdịa ya bụ ebe ọ nọ na-arụtụ aka n’ihe mere Osun Steeti oge e mere ntụlịaka maka gọvanọ steeti ahụ.

“Ọ bụ oge ahụ ka ha ji egwu nwayo... na Osun steeti anyị araghị ụra ihe ruru abalị atọ.. Unu kulie na-erubeghị oge e ji arahụ ụra. Uche unu ga-adị ya ruo na ihe niile eruo n’isi njedebe”.

Olumide Akpata ji LP azọ ọkwa gọvanọ adaala n’ogige ebe ọ tụrụ vootu

Olumide Akpata ji LP azọ ọkwa gọvanọ adaala n’ogige ebe ọ tụrụ vootu
Nkọwa foto, Olumide Akpata ji LP azọ ọkwa gọvanọ adaala n’ogige ebe ọ tụrụ vootu

Ka e bidoro ịgụ vootu a tụrụ na ogige ụfọdụ n’ime ebe ruru 4,519 bụ ebe a nọ tụọ vootu; Olumide Akpata bụ onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Patị (LP) dara n’ogege ebe ọ tụrụ vootu bụ PU11, Wọọdụ 06, Oredo.

Lee vootu a gụpụtara n’ebe ahụ:

PDP - 41

LP - 32

APC - 19

Ka Gọvanọ Mbah na-eto ntụlịaka gọmentị okpuru ọchịchị a na-eme taa, ndị APC na-akatọ ya

Ka Gọvanọ Mbah na-eto ntụlịaka gọmentị okpuru ọchịchị a na-eme taa, ndị APC na-akatọ ya

Ebe foto si, Gọvanọ Enugwu Steeti

Nkọwa foto, Ka Gọvanọ Mbah na-eto ntụlịaka gọmentị okpuru ọchịchị a na-eme taa, ndị APC na-akatọ ya
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ka ntụlịaka ịhọpụta ndị isi oche n’opkuruọchịchị iri na asaa dị n’Enugwu na-aga n’iru, aka na-achị steeti ahụ bụ Peter etoola ka ntụlịaka ahụ sị aga.

Peter Mbah bụ onye gara tụọ vootu na Owo Wọọdụ dị n’okpuruọchịchị Nkanu East kwuru na ndị mmadụ pụtara n’igwe tụọ vootu.

O kwuru na ozi ya wetere bụ na ịtụ vootu na-aga nke ọma na mpaghara dị icheiche n’Enugwu.

N’okwu ya “Ịhazị ntụlịaka a bụ nnukwu ihe nrụbaama n’ọchịchị anyị. Ọ bidoro n’oge ma nye ndị mmadụ ohere ịtụ vootu ka ha sị chọọ. Anụrụ m na ihe niile na-aga udo”.

Mana ka Gọvanọ Mbah na-eto ntụlịaka ahụ, ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressive Congress (APC) na-akatọ ya ma na arụaka n’ihe kpọrọ wuruwuru.

Mana n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru APC bụ Titus Ezeagu kesara ndị nta akụkọ, ha kwuru na Enugu State Independent Electoral Commission (ENSIEC) wepuru aha ndị ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị were na-azọ ọkwa.

“Ndị ENSIEC gbanwere ndị niile anyị tinyere ga-eji otu ndọrọndọrọ ọchịchị anyị zọọ ọkwa ma tinye aha ndị anyị amaghị”.

APC kwuru na weputara ndị ga-azọ ọkwa na gọọmenti okpuru ọchịchị iri na asaa nakwa wọọdụ 260 dị n’Enugwu.

Titus Ezeagu kwuru na ha akpụpụla ENSIEC ụlọikpe ka akwụsị ma kagbuo ntụlịaka ahụ e mere taa.

Ihe niile ị kwesịrị ịma maka ntụliaka Enugwu, Imo na Edo steeti

Ndị na-atụ vootu

Ebe foto si, Getty Images

N'Edo steeti mmadụ atọ ndị gbara ọkpụrụkpụ na-azọ ọkwa aka na-achi steeti ahụ bụ Asuerinme Ighodalo nke otu Peoples Democratic Party (PDP), Okpebholo Monday nke otu All Progressives Congress (APC) na Olumide Akpata nke otu Labour Party (LP).

Dịka e si tụọ anya, ọtụtụ mmadụ ga-apụta n'Enugwu na Imo steeti iji họpụta ndị ga-anọchite anya ha n'Okpuru ọchịchị dị iche iche dịka ndịisioche na ndị nnọchiteanya (councillor) ebe ndị Edo ga-ahọpụta Gọvanọ ga-achị ha n'ime afọ anọ na-abịa n'ihu.

Ụlọorụ Enugu State Independent Electoral Commission (ENSIEC) ga-ahazi ntụliaka Enugwu, Imo State Independent Electoral Commission (ISIEC) ga-ahazi nke Imo steeti ebe ụlọorụ Independent National Electoral Commission (INEC) ga-ahazi nke Edo steeti.

Akụkọ ndị a kachasị gụọ ugbua

Ndị mmadụ apụtala maka ntụliaka Okpuru ọchịchị Enugwu steeti

Ndị mmadụ apụtala maka ntụliaka Okpuru ọchịchị Enugwu steeti

Ntụliaka e ji ahọpụta ndị ga-abụ ndịisioche Okpuru ọchịchị iri na asaa (17) dị n’Enugwu na-aga n’ihu taa bụ Satọde 21 Septemba 2024.

A ga-eji ya bụ ntụliaka họpụtakwa ndị nnọchiteanya Concillor bụ ndị omeiwu nke ime ime obodo, bụ ndị ha na onyeisioche ga-arụ ọrụ.

BBC Igbo gagharịrị n’ime Okpuru ọchịchị Enugwu North, Enugwu South and East wee hụ na ndị mmadụ pụtara bịa binye aka n’akwụkwọ.

Na New Haven Primary School, Okpara Square, St Michael’s Primary School Asata nakwa ebe ndị ọzọ, ndị mmadụ nọ na-ebinye aka n’akwụkwọ.

Ndị mmadụ apụtala maka ntụliaka Okpuru ọchịchị Enugwu steeti
Ndị mmadụ apụtala maka ntụliaka Okpuru ọchịchị Enugwu steeti
Ndị mmadụ apụtala maka ntụliaka Okpuru ọchịchị Enugwu steeti
Ndị mmadụ apụtala maka ntụliaka Okpuru ọchịchị Enugwu steeti

Ahazighi ntụliaka n'ụfọdụ wọọdụ n'Imo steeti

Ogige ntụliaka n'Imo steeti

Ntụliaka Okpuru ọchịchị Imo steeti na-ada aja aja ka ọ dị ugbua dịka ọtụtụ ogige ntụliakaelu tọgbọrọ chakoo.

N'ebe ụfọdụ onye ntaakụkọ BBC kpagharịrị dịka Akpakama Ugiriọka Ward na Central School Obollo dịcha na Mbanọ, enweghị ndị ọrụ ntụliaka a hụrụ ebe ahụ.

Ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa boro ebubo na ndị ọchịchị mere nrụrụaka iji hụ na ọ bụ naanị ndị pati ha nwetara mmeri.

Onye ji aha otu African Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa Onyeisioche Isiala Mbanọ bụ Collins Osuagwu kwuru na enwebeghị ngwongwo e ji ahazi ntụliaka ha hụrụ n’agbanyeghị na ụlọorụ na-ahazi ntụliakaelu kwuru na ha ekesaala ya.

N’okwu nke ya, onye ji aha Peoples Democratic Party azọ ọkwa onye omeiwu councillor maka Ugiriọka ward bụ Emmanuel Chuks Ihie boro ebubo na e buuru ngwongwo e ji ahazi ntụliaka na wọọdụ ya gawa Amarakụ.

Ọ gara n’ihu boo ndị ọchịchị ebubo ime nrụrụaka n’usoro nhazi ntụliaka ahụ iji hụ na ọ bụ naanị ndị pati ha nwetara mmeri.

Ụfọdụ mmadụ pụtara na wọọdụ ahụ ibinye aka mana ahụghị ndị ọrụ Imo State Independent Electoral Commision bụ ụlọọrụ na-ahazi ntụliaka ahụ.

Ogige ntụliaka n'Imo steeti
Ogige ntụliaka n'Imo steeti

LP, PDP, APC: Lee oge ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ tụrụ vootu n’Edo steeti

Olumide Akpata

Olumide Akpata (LP):

Olumide Akpata ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party azọ ọkwa aka na-achị Edo steeti tụrụ vootu ya n’ogige ntụliaka 011, wọọdụ 06 New Benin, Okpuru ọchịchị Oredo dị na steeti ahụ.

Asue Ighodalo

Asue Ighodalo (PDP)

Asue Ighodalo bụ onye ji ọkọlọtọ PDP tụrụ vootu ya n’ogige ntụliaka 03, wọọdụ 1 dị na Idiro Okaigben, Ewohimi, Okpuru ọchịchị Esan Saụt East.

O ji akara Instagram ya too ka ndị mmadụ siri pụta n’igwe maka ntụlịaka ahụ ma gwa ndị INEC ka ha jisieike mee ihe ka ọ dị mma.

Monday Okpebholo

Monday Okpebholo (APC)

Monday Okpebholo bụ onye ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC tụkwara vootu nke ya n’Udomi Primary School 1, Irrua.