Lee ihe ị kwesịrị ịma maka Monday Okpebholo meriri na ntụliaka Gọvanọ Edo Steeti

Monday Okpebholo meriri Olumide Akpata nke otu Labour Pati na Asue Ighodalo nke Peoples Democratic Party na ntụliaka ahụ e mere ụbọchị Satọde 21 Septemba, 2024 n'Edo steeti.

Ebe foto si, Mondayokpebholocoalition/Instagram

Nkọwa foto, Monday Okpebholo meriri Olumide Akpata nke otu Labour Pati na Asue Ighodalo nke Peoples Democratic Party na ntụliaka ahụ e mere ụbọchị Satọde 21 Septemba, 2024 n'Edo steeti.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Monday Okpebholo nke pati All Progressives Congress (APC) nwetara mmeri na ntụliaka Gọvanọ Edo steeti e mere ụbọchị Satọde 21 Septemba, 2024.

O ji vootu 291,667 nke nọchitere anya pasenti vootu iri ise na otu (51%) merie Asue Ighodalo nke pati Peoples Democratic Party (PDP) onye nwetara vootu 247,274 nke nọchitere anya pasenti vootu iri anọ na atọ (43%) na Olumide Akpata nke otu Labour Pati (LP) nwetara naanị vootu 22,763 (22,763) nke nọchitere anya pasenti vootu anọ (4%) na ntụliaka ahụ.

Monday Okpebholo nwetara mmeri n'okpuruọchị 11 na ntụliaka ahụ. Mana pati PDP na LP akagbuola etu ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) siri hazie ntụliaka ahụ.

Gọvanọ Edo steeti bụ Godwin Obaseki kwuru na ụlọọrụ INEC esoghị usoro iwu kwadoro na ntụliaka ahụ ma kpọọ oku ka ndị Edo ghara ime ngagharịiwe banyere etu INEC si hazie ntụliaka ahụ.

Onye bụ Monday Okpebholo?

Monday Okpebholo bụ onye obodo Udomi dị na Esan Central. Ọ gbara afọ 54 ma bụrụ onye ji ego achụ ego.

Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum University of Abuja ebe o nwetara asambodo Business Administration.

Monday Okpebholo gwara BBC tupu e mee ntụliaka ahụ, na ọ ga-ebu agha megide ọnọdụ enweghị nchekwa (insecurity) na steeti Edo steeti.

O kwuru na a na-akpagbu ndị Edo steeti kemgbe, ma kwuo na mkpagbu ahụ akawanyego njọ na nso nso a.

Tupu ọ zọọ ọkwa Gọvanọ na ntụliaka a, a họpụtara Monday Okpebholo dịka sinetọ na-anọchiteanya Edo central n’ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa na ntụliaka afọ 2023.

Monday Okpebholo ji vootu 12,433 merie mmadụ 11 ndị ọzọ iji tozuo dịka onye ji ọkọlọtọ pati APC zọọ ọkwa gọvanọ steeti Edo.

Ụfọdụ nkwa Monday Okpebholo kwere gunyere:

Ime ka e nwee ezi ụlọọrụ ahụike n’Edo steeti nye ụmụaka, ụmụnwaanyị na onye ọbụla.

Inye ụmụakwụkwọ nkwado ma nye ha ohere ịgụ akwụkwọ n’efu.

Okpebholo kwuru na ọ chọrọ ime ka ndị Edo steeti nwee ọrụ

Ọ gara n’ihu kwuo na ya ga-eji ego Edo State Security Fund kwado ndị ọrụ nchekwa iji nweta nchekwa nye ndị ọrụ ugbo, ndị ahịa na onye ọbụla.

Osote Monday Okpebholo bụ Dennis Idahosa

Lee ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Edo Steeti

Olumide Akpata, Asue Ighodalo na Monday Okpebholo na-azọ ọkwa gọvanọ n'ụbọchị 21 Septemba 2024

Ebe foto si, Olumide Akpata, Asue Ighodalo na Monday Okpebholo/Instagram

Nkọwa foto, Olumide Akpata, Asue Ighodalo na Monday Okpebholo

N'ụbọchị Satọde 21 Septemba 2024, ndị Edo steetị ga-eme ntụliaka iji họpụta Gọvanọ ga-achị steetị ahụ.

Ntụliaka nke a bụ nke a na-ahụta dịka ọgụ na mgba dị n’etiti Gọvanọ na-achị Edo steeti bụ Godwin Obaseki na aka chiburu Edo steeti bụ Adams Oshiomole n'ihi ha abụọ nwere ndị ha họpụtara ma na-akwado. Mmadụ abụọ ahụ na-azọ ọkwa gọvanọ Edo steeti.

Obaseki jiri ọkọlọtọ APC merie ọkwa gọvanọ 2016 ma hapụ APC gbaba PDP n'afọ 2020 ma ji ọkọlọtọ PDP merie ọkwa ọchịchị gọvanọ ọzọ na 2020, ma ka ji ọkọlọtọ PDP ebe Adams Oshiomole na-akwado onye nke APC.

E nwere ọtụtụ otu pati ga-esonye na ntụliaka a mana anya onye ọbụla dị na pati All Progressives Congress (APC), Peoples Democratic Party na Labour Pati.

Akụkọ ga-elebanye anya na ndị na-azọ ọkwa ahụ, pati ha na ihe ị kwesịrị ịma maka ha.

Skip Akụkọ ndị ọzọ banyere Edo steeti. and continue readingAkụkọ ndị ọzọ banyere Edo steeti.

End of Akụkọ ndị ọzọ banyere Edo steeti.

Ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Edo na ntuliaka 2024

Asue Ighodalo

Ebe foto si, Asue Ighodalo/Facebook

Nkọwa foto, Asue Ighodalo nọ n'ogige Oba of Benin

Asue Ighodalo – Peoples Democratic Party (PDP)

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Asue Ighodalo bụ onye ji aha pati PDP azọ ọkwa ahụ na ntụliaka a ga-akpọtụ ụbọchị Satọde 21 Septemba, 2024.

Asue Ighodalo si n’obodo Okaigben, Ewohimi dị n’okpuruọchịchị Esan South East, Edo steeti. A mụrụ ya n’ọnwa Julaị 1959, ọ bụ onye ọkaiwu.

Ọ bụ onye maara ihe ekwe na-akụ banyere akụnaụba dịka ọ bụ onye rụgoro ọrụ n’ọtụtụ ebe.

Asue, dịka ọtụtụ mmadụ si akpọ ya, bụbu onyeisioche ụlọakụ Sterling Bank. Ọ rụburu ọrụ dịka onye otu kọmiti Govanọ Obaseki hibere e ji gozobe akụnaụba steeti ahụ.

Ọ bụ ya ka Gọvanọ Gowin Obaseki họpụtara ka ọ nọchie ya dịka Gọvanọ.

Oge ya na BBC nwere mkparịtaụka, Asue Ighodalo gwara anyị ebumnobi banyere ụmụafọ Edo steeti ma kwupụta ihe mere o jiri chọọ ịbụ gọvanọ.

Lee nkwa o kwere:

A chọrọ m ihụ na ndị Edo steeti nwere ezi ndụ na ihe e ji enyere ndụ aka.

A chọrọ m ị na-enye ụmụafọ Edo steeti ụwa na-atụ n’ọnụ ego mbinye 20,000 – 50,000 nọ ọnwa atọ iji nyere ha aka.

Asue kwere nkwa ịrụ ụzọ dị kilomita 2,000 n’Edo steeti niile n’afọ anọ ya dịka gọvanọ.

Na afọ mbụ m n’ọrụ dịka gọvanọ, a ga m enweta nchekwa ogige ebe obibi ma kụọ osisi ruru 500,000.

Nke kachasị mkpa nwe bụrụ na Asue ga-enweta ezi mmiri n’obodo 500 dị n’Edo Steeti.

Onye bụ osote Asue Igbodalo bụ Osarodin Ogie.

Olumide Akpata – Labour Party (LP)

Olumide Akpata

Ebe foto si, Olumide Akpata/Facebook

Nkọwa foto, Olumide Akpata

Olumide Akpata nọrọ ụbọchị Fraịde 23 Febuwarị, 2024, merie ma turu ugo dịka onye ga-eji aha Labour Pati zọọ ọkwa gọvanọ Edo steeti na ntụliaka ahụ.

A mụrụ Olumide Akpata n’afọ 1972. Ọ bụ onye ọkaiwu mara ihe ekwe na-akụ.

Ọ banyere otu Nigeria Bar Association n’afọ 1993 wee mechaa hibe ụlọọrụ Templars ma mee ya ka ọ bụrụ ọkaibe n’ihe gbarasa iwu.

Ọ bụbu onyeisi otu Nigeria Bar Association ma kwuo na ihe mere ya ji chọọ ịzọ ọkwa gọvanọ bụ maka ezi nchekwube o nwere ebe ndị Edo steeti nọ.

Akpata kwuru na ọ chọrọ ibu agha megide nrụrụaka na-eme n’Edo steeti.

N’okwu ya “Onye ọbụla ji ọkwa ọchịchị bụ onye kwesịrị ịchọ ọdịmma ndị ọ na-achị”.

Lee ụfọdụ nkwa Akpata kwere ndị Edo steeti

  • O kwuru na ya ga-ahazigharị ọnọdụ ụlọọrụ ikpe Edo steeti ma mme ka onye ọbụla nweta ikpe ziri ezi.
  • Akpata kwuru na ya ga-eme ka ọnọdụ ahụike na steeti bụrụ nke e ji ama atụ
  • Ọ gara n’ihu kwuo na ọ ga-enweta nkwado nye ụmụakwụkwọ.
  • O mere ka a mata na gọọmenti ya ga-abụ nke kwụrụ ọtọ ma na-ekwu eziokwu.

E nwere nwaanyị na-azọ ọkwa a?

Key Patience Ndidi

Ebe foto si, Key Patience Ndidi/FACEBOOK

Nkọwa foto, Key Patience Ndidi

Naanị otu nwaanyị na-azọ ọkwa Govanọ Edo steeti na ntụliaka a. Aha ya bụ Key Patience Ndidi nke pati Peoples Redemtion Party (PRP).

E nwere ụmụnwaanyị anọ bụ osote na pati ha. dị icheiche.

Philip Shaibu bụ osote gọvanọ Edo steeti mana ọ chọrọ ị bụ Gọvanọ steeti ahụ mana Gọvanọ Godwin Obaseki busoro ya agha maka esemokwu dị n'etiti ha abụọ. Ụgbụa, Philip Shaibu abanyela otu pati APC ma na-akwado Monday Okpebholo.

Ebe foto si, Philip Shaibu/Facebook

Nkọwa foto, Philip Shaibu bụ osote gọvanọ Edo steeti mana ọ chọrọ ị bụ Gọvanọ steeti ahụ mana Gọvanọ Godwin Obaseki busoro ya agha maka esemokwu dị n'etiti ha abụọ. Ụgbụa, Philip Shaibu abanyela otu pati APC ma na-akwado Monday Okpebholo.

Aha ọzọ wuru ewu na ntụliaka gọnanọ Edo steeti bụ Philip Shaibu onye bụ osote gọvanọ Edo steeti, Godwin Obaseki.

Philip Shaibu zọrọ ka ọ bụrụ onye ga-eji ọkọlọtọ otu PDP zọ ọkwa gọvanọ Edo steeti mana oga ya bụ Gọvanọ Godwin Obaseki gbara isi akwara na Philip Shaibu agaghị anọchie n'ihi esemokwu dị n'etiti ha abụọ.

Nsogbu ahụ malitere ma mee ka ụlọomeiwu Edo steeti chụpụ Philip Shaibu n'ọkwa ya dịka osote gọvanọ Edo steeti.

Ụlọikpe mechara weghachita Philip Shaibu dịka osote Govanọ Edo steeti ma nye iwu ka ụlọọrụ gọọmenti kwụọ ya ụgwọ niile e ji ya kemgbe a chụpụrụ n'ọkwa ya.

Ka ọ dị ugbua, Philip Shaibu abanyela otu APC ma na-akwado Monday Okpebholo ka ọ bụrụ gọvanọ Edo steeti na ntụliaka a.

Akụkọ kọrọ na n’afọ 2016, Adams Oshiomole webatara Godwin Obaseki ka ọ nọchie ya dịka Gọvanọ ka ọkwa ya gwụrụ, agbanyeghi na osote ya bụ Pius Odubu zọrọ ọkwa gọvanọ n’afọ ahụ

Ebe foto si, Obaseki, Oshiomole /Instagram

Nkọwa foto, Akụkọ kọrọ na n’afọ 2016, Adams Oshiomole webatara Godwin Obaseki ka ọ nọchie ya dịka Gọvanọ ka ọkwa ya gwụrụ, agbanyeghi na osote ya bụ Pius Odubu zọrọ ọkwa gọvanọ n’afọ ahụ

N’afọ 2016, Adams Oshiomole webatara Godwin Obaseki ka ọ nọchie ya dịka Gọvanọ ka ọkwa ya gwụrụ, agbanyeghi na osote ya bụ Pius Odubu zọrọ ọkwa gọvanọ n’afọ ahụ.

Obaseki meriri Odubu ma bụrụ onye pati APC họpụtara ka o jiri aha zọọ ọkwa ahụ gọvanọ steeti ahụ.

Obaseki gara n’ihu merie onye ji aha pati PDP zọọ ọkwa ahụ bụ Osagie Ize-Iyamu na ntụliaka ahụ.

N’afọ 2020, Obaseki hapụrụ otu pati APC banye PDP ma zọọ ọkwa gọvanọ ọzọ. O ji vootu 307,955 merie Osagie Ize-Iyamu nke pati APC onye wetara vootu 223,619 na ntụliaka afọ ahụ.

Ka ọ dị ugbua, anya onye ọbụla dị n'Edo steeti maka ntụliaka a nke ọtụtụ na-ekwu bụ nke kachasị kpụrụ ọku n'ọnụ na steeti ahụ.