Etu ị si ebi ndụ ga-esi metụta akịrị gị

Onye nwere ọrịa akịrị nọ n'ụlọọgwụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye nwere ọrịa akịrị nọ n'ụlọọgwụ
    • Onye dere ya, Michael Ngene
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ọ bụrụ na ị na-ese sịga, na-aṅụ oke mmaya ma na-eri oke nnu, o nwereike ibutere gị ọrịa kansa akịrị (cancer of the kidney) dịka Dọkịta Obuka Chiamaka Maryann si kwuo.

Nrụrịtaụka BBC Igbo na Dọkịta Obuka Chiamaka Maryann kọwara ọrụ akịrị mmadụ (kidney) na-arụ na ahụ mmadụ na etu ị si ebi ndụ nwereike imetụta akịrị gị.

Dọkịta Chiamaka kọwara na akịrị bụ otu n'ime ọtụtụ anụ ahụ mmadụ mwere ọrụ dị icheiche ọ na-arụ.

N'okwu ya 'Akịrị bụ akụkụ ahụ dị oke mkpa n'ahụ mmadụ. Ọrụ akịrị na-arụ gunyere nnyọcha ihe mmadụ riri n'ọnụ dịka ọgwụ, nri, mmiri ma wepụ ihe na-ekwesighi ị nọ n'ime ahụ mmadụ'.

Ọ kọwara na ọ bụ akịrị na-eme ka mmadụ ghara inwe ọbara mgbalielu. Ọ bụrụ na na mmiri kọrọ n'ahụ mmadụ, ọ bụ akịrị na-ekesa obere mmiri dị gị n'ahụ iji gbochie ọbara mgbalielu.

Ọrụ ọzọ kidney na-arụ bụ ịmepụta vitamin D n'ahụ mmadụ.

Gịnị na-eme ka akịrị kwụsị ịrụ ọrụ?

Onye na-enweta ọgwụ maka ọrịa akịrị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye na-enweta ọgwụ maka ọrịa akịrị

Dọkịta Chiamaka kwuru na e nwere ọtụtụ ihe nwereike ịme ka akịrị mmadụ kwụsị ịrụ ọrụ. Lee ha ebe:

  • Congenital bụ nke a kpọrọ ọrịa polycystic nke e nwereike ịchọpụta ma e mee nyocha ultrasound. Ndị nwere ọrịa a na-enwe ihe ngosi bekee kpọrọ 'renal symptoms'. Nke bụ nke a mmadụ nwereike inweta ma ọ bụrụ na-enwere onye ezinaụlọ bu ya.
  • Acquired bụ nke ọ bụ oke ịṅụ mmanya, gburugburu gị, ite ude ọcha, ude na-ewepụ nje ihu na ude na-eme ka mmadụ ghara ịka nka nke e ji hydroquinone mepụta.
  • Ọ gara n'ihu kwuo na 'Ọbara mgbalielu bụ ihe ọzọ kachasị eme ka akịrị kwụsị ịrụ ọrụ, ọ kachasị ma ọ bụrụ na onye anaghị aṅụ ọgwụ etu o kwesịrị'. Ọ dọrọ aka na nti ka onye nwere ọbara mgablielu ghara ị na-eri oke nnu.
  • Enweghị mmiri n'ahụ mmadụ (Dehydration) nwereike ime ka akịrị kwụsị ịrụ ọrụ.
  • Ọrịa sickle cell
  • Ị ṅụ ọgwụ NSAIDs nwereike ime ka akịrị kwụsị ịrụ ọrụ. Ọgwụ gunyere ọgwụ ibuprofen, naproxen, diclofenac na ndị ọzọ.
  • Ọrịa shuga nwereike ime ka akịrị kwụsị ịrụ ọrụ n'ahụ mmadụ.
  • Ọrịa HIV nwereike ime ka akịrị mmadụ ghara ịrụ ọrụ.

Kedụ etu i si ebi ndụ ga-esi metụta ndụ akịrị gị?

Ndị nọ na mmemme egwu na-aṅụ mmanya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị nọ na mmemme egwu na-aṅụ mmanya

'Ọ bụrụ na ị bụ onye na-aṅụ oke mmanya, na-ese anwụrụ, nke a nwereike ibutere gị ọrịa kansa akịrị', ka Dọkịta Chiamaka kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na 'Ịri oke nnu na ihe e ji esi nri na-atọ oke ụtọ nwere sodium nwereike ịmetụta akịrị gị'.

'Anyị na-agwa ndị nwere ọrịa kidney ka ha belata ịta anụ maka na ọ bụ akịrị adịghịzi ike ịnyọcha ihe etu o kwesịrị', ka ọ gbakwụnyere.

N'aka nke ọzọ, Dọkịta Chiamaka mere ka a mata na ude ọcha, ude na-ewepụ nje ihu, ude na-eme ka mmadụ ghara ịka nka (anti-aging cream) nwereike ịmetụta akịrị mmadụ.

Ọzọ bụ ịṅụ ọgwụ dọkịta ahụike enyeghị gị.

'Anyị na-agwa ndị mmadụ ka ha ghara ị na-azụ ọgwụ n'aka ndị na-ere ọgwụ n'opkoroụzọ nakwa n'ụgbọala maka na ha abụghị ndị nwere ntozu inye gị ọgwụ'.

Dọkịta Chiamaka kwuru na 'Anaghị aṅụ mmiri, anaghị eri ezigbo nri na nri zuruoke nwereike imetụta akịrị mmadụ'.

Mmadụ e nwereike ịnwụ ma akịrị ya kwụsị ịrụ ọrụ?

Dọkịta na-eleta onye nwụrụ nọ n'ọba ozu ụlọọgwụ

Ebe foto si, Getty Images

Dọkịta Chiamaka kwuru na akịrị kwụsịrị ịrụ ọrụ anaghị eme ka mmadụ daa n'ike ma nwụọ,

'Ọ bụ nkopu mkpụrụ obi nwereike ime ka mmadụ daa n'ike nwụọ'.

N'okwu Dọkịta Chiamaka 'Akịrị na-anaghị arụ ọrụ anaghị eme ka mmadụ daa n'ike wee nwụọ kama na ọ bụrụ na mmadụ nwere ọrịa akịrị nke nọ n'ogogo ise (level 5) nke bụ na akịrị ya akwụsịla ịrụ ọrụ, nke a nwereike imetụta obi onye ahụ.

Oke ọbara mgbalielu nwereike ibute obi nkopu nke na-eme ka mmadụ daa n'ike ma nwụọ.

Anyị na-agwa ndị na-eme egwuregwu dịka bọọlụ, ịgba ọsọ nakwa egwuregwu ndị ọzọ ka ha ga mee nyocha obi ha.

'Oge ụfọdọ mmadụ dara n'ike nwụọ, nyocha na-egosi na onye ahụ nwere ọrịa dị ya n'ahụ nke ọnaghị eleta etu okwesịrị', ka dọkịta kwuru.

Kedụ ihe ngosi ọrịa akịrị?

Ọrịa akịrị bụ ọrịa nwereike imetụta nwoke na nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Nke a ma ama bụ mbeleta mamịrị. 'Onye nwere ọrịa akịrị na-enwe nsogbu ịnyụpụta mamịrị maọbụ mamịrị ya adị ntakịrị.

Ọ bụrụ na onye ahụ chọpụtaghị ya n'oge, ụkwụ onye nwereike ịzaa. Nke bụ maka na ahụ onye ahụ anaghị ewepụ mmiri dị ya n'ahụ o kwesịrị iwepụ.

Ọzọ bụ enweghi ike iku ume ọfụma, ịkwa ụkwara, ịgbọ agbọ, enweghị ike ịrahụ ụra ọfụma n'abalị.

Ọgwụgwọ ọrịa akịrị

Dialysis bụ otu ụzọ e ji agwọ ọrịa akịrị. Nke a bụ oge a na-eji machine mịpụta onye ahụ ọbara dị ya n'ahụ ma nyọcha ya iji wepụta ihe ọbụla na-ekwesighi. Ọ bụrụ na ọrịa onye ahụ erubeghi ogogo ise (stage 5), o nwereike inweta ọgwụgwọ.

Ụzọ ọzọ bụ itinye akịrị ọzọ dị ndụ iji mechie nkw nwụrụ anwụ e wepụrụ ewpụ nke a bụ nke bekee kpọrọ 'kidney transplant'. Tupu e mee nke, a ga-eme nyocha iji mara ka akịrị ọhụrụ ahụ ọ ga-arụ ọrụ n'ahụ onye tupu e tinye ya.

Ọ bụrụ na mmadụ nwee ọrịa akịrị, e nwereike inye ya ọgwụ na-emepụta ọbara n'ahụ mmadụ iji.

Dọkịta Chiamaka kwuru na ọ bụrụ na mmadụ chọpụta ihe ngosi yiri ọrịa akịrị, ọ dị mma ka onye ahụ gakwuru dọkịta ahụ iji nweta ndụmọdụ ma chọpụta ihe ọ ga-eme iji mee ka ọ ghara ịkawanye njọ.