Ihe isi mere ‘Sperm’ ụmụnwoke ugbua anaghịzị arụ ọrụ etu ha sibu arụ

Ọtụtụ agwa nakwa etu ndị mmadụ si ebi ndụ na-emetụta uhe n'ahụ nwoke ma mee ya ọ ghara ịrụ ọrụ nke ọma

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ agwa nakwa etu ndị mmadụ si ebi ndụ na-emetụta mmepụta uhe n'ahụ nwoke ma mee ya ọ ghara ịrụ ọrụ nke ọma

Nnyocha egosila na uhe (Sperm) ụmụnwoke na-anyụpụtazị ugbua anaghị ebu ibu etu ọ dị n’ebe oge afọ 50 gara aga dịka a hụrụ na ibu nnyụpụta uhe n’ụwa ugbua dara ruo pasentị iri ise na otu.

Ihe a bụ isi sekpụ ntị na nchọpụta e mere na mahadum Hebrew University of Jerusalem na mba Israel nakwa na mahadum Mount Sinai School of Medicine nke mba Amerịka.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ha chọpụtara na n’ebe afọ 1970 na ụmụnwoke na-anyụpụta mkpụrụ uhe ruru nde 101 na ngụkọ otu militire mmiri uhe bụ ‘Semen’ na Bekee mana ugbua ụmụnwoke na-anyụpụtazị naanị ihe dịka mkpụrụ uhe nde 49.

 Nnyocha gosikwara na uhe ụmụnwoke na-anyụpụta ugbua anaghịzị arụ ọrụ etu ha kwesiri.

Moacir Rafael Radael bụ otu onye ọrụ ahụike bụ onye ọkaibe banyere ntụrụ ime kwuru

“Mkpụrụ uhe a na-anyụpụtazi ugbua anaghi agba ọsọ etu ha kwesiri gbakwuru akwa nwaanyị na-anụpụta n’ime ahụ ya.”

Ọnọdụ a abụrụla ihe oke egwu nye ndị ọrụ ahụike nke metụtara ụmụnwoke ndị ụwa niile.

Ọ bụ gịnị na-akpata ndatu a n’ime ahụ ụmụnwoke ugbua? Lee ihe ndị ọkachamara n’okwu ahụike chọpụtara:

Ihe ndị ọzọ na-akwanyekwa ọkụ n’ọnọdụ a gụnyere okpuru okwu abụọ.

Nke mbụ bụ na ọnọdụ enweghi nye nwaanyị nwa bụ ihe dị ọbara ihe ruru pasentị 10 ruo 30 ndị mmadụ.

Nke abụọ bụ na ndị mmadụ anaghịzị alụ nwunye n’oge nke bụ na ha na-eche mgbe ha nọzị n’okenye tupu ha amalite ịmụ ụmụ, agwa dị etu na-eme ka ụmụnwoke ghara inwe ike tụba nwunye ha ime n’ihe ikike ha adatuola nke ukwuu, nke a so n’ihe Miranda kwuru.

Ọnodụ a na-emetụta ụmụnwoke n'akụkụ ụwa gba gburu gburu ugbua.

Mmegharị ahụ na-enyereaka n'ọrụ imezị ime ahụ ụmụnwoke.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mmegharị ahụ na-enyereaka n'ọrụ imezị ime ahụ ụmụnwoke.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Oke ibu:

Ụmụnwoke ibu ibu na-emetụta ihe nọ n’ime mkpụrụ uhe nke bụ na isi akụkụ ahụ na-emepụta uhie bụ testosterone na-adatu n’ụzọ ọjọọ.

Otu dọkịnta ọkachara mara n’okwu a bụ Eduardo Miranda kọwara akpa amụ ụmụnwoke ekwesịghị ị nọ n’ọnọdụ mmkpomọkụ nke mere ọ jị nọrọ n’ezi ahụ mmadụ ma aghara ịnọ n’ime ahụ nwoke.

Ibu ibu na-akpata oke ahụ mkpomọkụ nke na-emepụta akpa amụ nwoke bụ ebe a na-emepụta uhe.

Di World Health Organization (WHO) chọpụtara na pasentị 39 ụmụnwoke n’ụwa buru ibu ebe pasentị 11 n’ime ha buru oke ibu n’ụzọ ọjọọ nke mere ka ndatụ n’ọrụ uhe ụmụnwoke na-arụ ugbua ria elu.

Ọṅụṅụ ọgwụike:

Ọtụtụ ọgwụike nakwa mmanya ndị mmadụ na-aṅụ aghara aghara ugbua dịka Igbo, Sịga, anwụrụ, kokenụ, nakwa ndị ọzọ na-emetụta ihe nwoke jiri bụrụ nwoke. Ọgwụ ndị ọzọ ụmụnwoke na-aṅụkwa na-emetụta ahụike ihe ha jiri bụrụ nwoke bụ ọgwụ ndị mmadụ na-anụ iji gbaa abụba ọkachasị ụmụnwoke na-akpụ ụzụ, ya bụ ọgwụ na-emetụta isi akụkụ ahụ na-emepụta ihe na-eme ka mmadụ bụrụ nwoke nke a na-akpọ ‘testosterone’.

Oke ịṅụ ọgwụ ndị a maka atụmatụ inwenwanye ahụ na-akpọnwụ mkpụrụ amụ ụmụnwoke nke na-emetụta mmepụta uhe n’ahụ ha.

Iyi okpu nna bụ enyi n'oge aramara na-enyereaka na mgbochi ọrịa.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Iyi okpu nna bụ enyi n'oge aramara na-enyereaka na mgbochi ọrịa.

Ọrịa ndị a na-ebute site n’aramara:

Ọtụtụ ọrịa ụmụnwoke na-ebute na mmekọ dịka ọrịa ‘Chlamydia’ na ‘Gonorrhoea’ nwereike ịmetụta akụkụ ahụ na-echekwa uhe a na-empụta n’ahụ nwoke. Ọrịa ndị na-efesasiike ugbua nke bụ na nnyocha WHO gosiri na n’afọ 2020 naanị nde ndị mmadụ 129 butere ọrịa ‘Chlamydia’ ebe nde mmadụ 82 butere ọria Gonorrhoea nke gụnyere ma ụmụnwoke nakwa ụmụnwaanyị. Ọrịa ọzọ nwekwara ike imetụta ihe nwoke jiri bụrụ nwoke nakwa ebe nchekwa uhe ya bụ ọrịa ‘Human papillomavirus (HPV).

Ọtụtụ ụmụnwoke na-edobe kọmpụta ha n'elu mpata ha nke na-eghe mkpụrụ amụ ha ma metụta ọnọdụ ahụike ya.

Ebe foto si, Iwaria

Nkọwa foto, Ọtụtụ ụmụnwoke na-edobe kọmpụta ha n'elu mpata ha nke na-eghe mkpụrụ amụ ha ma metụta ọnọdụ ahụike ya.

Idobe Kọmpụta n’elu mpata:

Dịka e siri kwuo na mbụ, mkpụrụ amụ nwoke kwesiri ịnọ n’ọnọdụ jiri oyi ruo 1C maọbụ 2C kanyere etu ahụ mmadụ siri ekpo ọkụ. Nnycoha Sayensị gosiri na dịka ọtụtụ ndị mmadụ jna-ejizi kọmpụta ndị a na-edobe na mpata arụ arụ bụ ‘Laptop’, mkpomuọkụ ya bụ Laptop na-emetụta mkpụrụ amụ ndị mmadụ ma ‘na-eghe’ ya ka akara. Onye ọrụ ahụikeMiranda kwukwara na agwa ndị ọzọ na-ewu ewu ugbua dịka iji mmiri dị ezigbo ọkụ asa ahụ, iji ekwentị oge ọbụla, iji ngwa teknụzụ ndị ọzọ na-emepụta ikuku a na-akpọ “electromagnetic waves” sokwa akụda ikike uhe ndị mmadụ.

Itinye kemịkal ndị ọzọ dịka 'endocrine disruptors' n’ahụ:

Ọtụtụ kemịkal nakwa ihe ndị eji arụpụta ngwa ndị mmadụ na-eji emegasi ihe n’ụlọ nwere ihe a na-akpọ ‘endocrine disruptors’ n’ime ya. Ụmụ ihe ndị anaghị adị mma n’ahụ ọkachasị dịka na-emepụta uhe nakwa akpa amụ ụmụnwoke.

Ihe ndị gụnyere kemịkal ndị eji egbu anwụ nakwa arụrụ dị icheiche nke a na-akpọ ‘Pesticide’, ọzọkwa bụ plastịk eji arụ ihe ndị mmadụ ji etinye nri nke na-aba n’ahụ ma metụta ime ahụ nwoke nakwa ikike ya itụba nwaanyị ime.

Nleta ahụike mmadụ n'oge dị mkpa na ọkachasị n'okwu banyere ntụrụ ime

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nleta ahụike mmadụ n'oge dị mkpa na ọkachasị n'okwu banyere ntụrụ ime

Gịnị ka anyị ga-emezị ọnọdụ a?

Ọtụtụ ihe ụmụnwoke kwesiri ime ga-amalite na mgbanwe agwa ha nakwa etu ha si ebi ndụ.

Nke mbụ bụ ibelata ọnọdụ ibu oke ibu site na mmegharị ahụ na iri ezigbo nri na-edozi ahụ.

Ọzọ bụ nkwụsị ịṅụ oke mmanya na-aba n’anya, Igbo, ọgwụ ike, sịga, anwụrụ nakwa ọgwụ dị ọzọ na-emetụta ihe nwoke jiri bụrụ nwoke.

Iji okpu nna bụ ihe n’oge aramara ọkachasị ọ bụrụ na mmadụ na-ezute onye na-abụghị onye nke ya dị mkpa n’ọrụ mgbochi ọrịa mmekọ dịka ‘Chlamydia’ nakwa ‘Gonorrhoea’.

Ihe ọzọ dịkwa mkpa ime bụ ihe dọkịnta ndị ọkacha mara n’okwu ntụrụ ime ọ bụrụ na mmadụ mecha ihe ndị a niile ma ghara inwe ike tụba nwaanyị ya ime. Marakwa na nwaanyị na-akwanye nka, itụba ya ime na-aka ara ahụ mana ọ bụrụ na nsogbu anweghị nwa nọrọ n’aka nwoke, ndị ọrụ ahụike na-adụ nnụmọdụ ụmụnwoke ịṅụ ọgwụ pụrụiche nke ‘Vitamin supplements’ iji tinyekwuo ihe na-edozi ahụ nakwa amụ nwoke bụ ‘Antioxidants’.

Nke bụ eziokwu bụ na ọnọdụ enweghiike tụba nwaanyị ime nọ n’ọbara ụfọdụ mana n’ọtụtụ oge ọ na-abụ site n’agwa, ihe ndị mmadụ na-eri, nakwa ihe na-aṅụ nakwa etu ha si ebi ndụ bụ ụzọ na-eme ọnọdụ ahụike ihe ha jiri bụrụ nwoke adatuo. Ịhụ dọkịnta n’oge dị mkpa iji hazịe ọnọdụ tupu aka enwe aghọrọ aka mmadụ.