Retrograde Ejaculation: 'Ọrịa shuga gbochiri m ịnyụpụta 'sperm' ma mụ na nwunye m nwee mmekọ'
Otu nwoke akwaala arịrị maka enweghi ike anyụpụtanwu uhe (sperm) n'oge mmekọ ya na nwunye ya n'ihi ọrịa shuga.
Nwoke sị na uhie anaghị apụta ya n'ahụ ma ya na nwaanyị dinaa kama na ọ chọpụtaghị ruo mgbe ọ lụrụ nwaanyị.
Ọ sị na ọ bụ nwunye sịrị ya na ọ dịghị ya ka o nwere uhe ọ nyụbara n'ahụ mgbe ha nwere mmekọ.
Na nke a mere o jiri gaa gbọọ ncha ma chọpụta na onweghi uhe ọbụla ọ na-anyụpụta n'ahụ ya.
Ọ sị na ọ gaara ụlọọgwụ e mee nyocha dị iche iche ma chọpụta na o bu ọrịa shuga nke ọjọọ ya.
Kirie ihe ọ sị na ọ gabigara n'uju.