Child Pornograghy: Etu aka si kpara nwoke kesara aramara ụmụaka na soshal midia

A kpụpụla otu nwoke n'ụlọikpe maka ikesa ihe onyonyo ebe ụmụakwụkwọ Chrisland School dị na Legọs na-apịtọsị onwe ha na soshal midia.
E boro nwoke a bụ Uche Igwe dị afọ iri anọ ma bụrụ onye na-agbasa ozi na Redio ebubo ọnụ abụọ mana ọ gọrọ na aka ya dị ọcha.
A gbapụtara ya n'ụlọ nga ebe e bugharịrị ikpe ahụ gawa n'ụbọchị 13 nke ọnwa Juun.

Ebe foto si, Chrisland School/Website
Cheta na Gọọmentị Legọs Steetị dọrọ aka na ntị na onye ọbụla a hụrụ na-ekesasị ụdịrị ihe onyonyo ebe ụmụaka na-apịtọ onwe ha ga-aga nga afọ iri na anọ.
A ka na-eme nnyocha banyere ihe onyonyo ahụ butere ọgbaghara nakwa mmechi ụlọakwụkwọ a n'ọnwa Eprelụ.
Mana gọọmentị mechara gbapeekwa ụlọakwụkwọ ahụ.
Ihe mere ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Praịmarị n'Enugwu ji agba abụbụ ọrụ

Ebe foto si, Getty Images
Odo Theopilus bụ onyeisi otu jikọtara ndị nkuzi a kpọrọ Nigeria Union of Teachers n'Enugu gwara BBC Igbo na ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Prịamarị n'Enugu steeti amalite abụbọ ọrụ taa bụ Tuzde 10 Mee, 2022.
Ọ sị na ndị nkuzi a sị na a kwụbeghị ha ụgwọ ọnwa ọpekatampe nke gọọmentị etiti hibere bụ puku naịra iri atọ kemgbe ọnwa Febụwarị 2020.
Odo kwuru na ndị nkuzi ekpbiela na ha agaghị akwụsị abụbụ ọrụ a ruo mgbe akwụzụrụ ha ya bụ ụgwọ.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Enugu State Universal Basic Education (ENSUBEB) bụ Nkiru Onuora gwara BBC Igbo na ọ nweghị ihe ha ma maka abụbọ ọrụ a maọbụ atụmatụ ọbụla yiri ya.

Cheta na gọọmentị Naịjirịa hibere iwu ka a malite ịkwụ ndị ọrụ Bekee ụgwọ ọnwa ọpekatampe puku naịra iri atọ (N30,000) n'afọ 2019/2020.
Onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka ụgwọ ọnwa a kpọrọ National Salary, Incomes and Wages Commission (NSIWC) bụ Ekpo Nta kwuru n'ọnwa Febụwarị 2022 na Gọọmenti etiti ga-ata ndị ọrụ Bekee na-akwụghị ndị ọrụ ha ụgwọ opekatampe nke gọọmentị Naịjriịa dịka iwu 'National Minimum Wage Act 2019' siri dị.
INEC agaghị agbanwe maọbụ dọtịa usoro ntuliaka 2023

Ebe foto si, INEC
Onyeisi ngalaba 'Independent National Electoral Commission' (INEC) bụ Mahmood Yakubu ekwuola ọzọ na ha agaghị agbati oge ha tinyere maka usoro ntuliaka nke afọ 2023.
Nke a na-abịa dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche na-arịọ INEC ka ha gbatịkwuo oge ha tinyere maka iji mee ntuliaka ime ụlọ.
N'ọgbakọ nke INEC na ndị isi pati dị icheiche mere n'Abuja n'ụbọchị Tuzde, Yakubu dọrọ aka na ntị ka ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị gbaa mbọ rube isi n'atụmatụ nke INEC wepụtarala.
Yakubu kọwara sị: "Ihe omume niile gbasara ntuliaka 2023 nwere mmekọrịta, otu dabeere na nke ọzọ."
"Nke ọbụla a na-emeghị oge e tinyere ya, ọ ga-emetụta nke ọzọ, ma mee ka INEC na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị nọrọ n'ọnọdụ gbagharịa."
"Nke a ga-eme ka ihe mebie karịa etu e chere, ya mere, INEC agaghị agbanwe usoro ntuliaka 2023."
Cheta na n'izu ụka gara aga ka INEC gwara otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche na ha nwere naanị otu ọnwa iji chịkọta onwe ha ọnụ ma mee ntuliaka imeụlọ ha.
INEC kwuru na mpụtara ntuliaka imeụlọ nke ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị kwesịrị ịkụrụ ọnụ tupu ụbọchị









