Sit-At-Home Order: Ndị mmadụ erubere isi n'iwu nọrọ n'ụlọ na Mọnde a?

Unizik Junction dị Awka, Anambra steeti
Nkọwa foto, Unizik Junction dị Awka, Anambra steeti Jenụwarị 31, 2022

Sit-at-home ọ na-aga n'ihu n'ala Igbo taa bụ Mọnde, Jenụwarị 31, 2022?

Foto onye ntaakụkọ anyị setere na Unizik Junction dị n'Awka , Isi obodo Anambra gosiri na ndị mmadụ na-agara onwe ha mkpa ha.

Anyị ka ga-enwetere gị foto nakwa onyonyo etu akụkụ ala Igbo ndị ọzọ dị na Mọnde a.

N'Ebonyi,

Abakiliki
Nkọwa foto, Okporoụzọ Abakiliki dị n'Ebonyi steeti

N'Ebonyi steeti, ndị mmadụ na-agagharị n'Abakiliki bụ isi obodo Ebonyi steeti ebe enwere ọtụtụ ụgbọala na ọgbatumtum na-agagharị ebe niile.

Ụlọahịa, ụlọakụ, ahịa mepere n'ụtụtụ taa bụ Mọnde.

Abakiliki
Nkọwa foto, Okporoụzọ Abakiliki dị n'Ebonyi steeti

N'Umuahia,

Ebe ndị mmadụ na-aba ụgboala njem emepeghị mana ụgbọala na-agara onwe ha n'okporoụzọ.

Ndị mmadụ nwere ụlọahịa ekweghị emepe maka ha amaghị ihe nwerike ime ụlọahịa ha.

Okporoụzọ dị n'Umuahia
Nkọwa foto, Ahia dị n'okporụzọ Ikot Ekpene dị n'Umuahia
Ahia dị n'okporụzọ Ikot Ekpene dị n'Umuahia
Nkọwa foto, Ahia dị n'okporụzọ Ikot Ekpene dị n'Umuahia
Ụfọdụ ụlọahịa dị n'okporoụzọ Ikot Ekpene dị n'umuahia

Ebe foto si, BBC

Nkọwa foto, Ahia dị n'okporụzọ Ikot Ekpene dị n'Umuahia

N'Enugu,

Okporoụzọ dịka "Ogui road" nke Enugu ka tọgbọọ chakoo.

Okporoụzọ Ogui dị n'Enugu na Mọnde Jan.31, 2022

Etu sit-at-home nke Mọnde si malite n'ala Igbo

Cheta na otu indigenous People of Biafra apụtala ugboro ugboro kwuo na ha akagbuola ya bụ sit-at-home ha tinyere n'August 9, 2022 kwa Mọnde ọbụla.

Ipob kwuru na ha tinyere ya bụ atụmaatụ iji kwado onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu nọ na mkpọrọ Department of State Service kamgbe ọnwa June 2021.

Ugbua Ipob kwuru ka ndị mmadụ na-anọ n'ụlọ naanị mgbe Kanu ga-apụta n'ụlọikpe ịzara ọnụ ya.

A nwụchiri Kanu na mba Kenya ma kpọghachite ya Naịjirịa na June 2021, kamgbe ahụ ọ na-azara ọnụ ya n'ụlọikpe maka ebubo iyi ndụ egwu na ihe ndị ọzọ gọọmenti Naịjirịa boro ya.

Gini bụ Ipob?

Ipob pụtara 'Indigenous People of Biafra'.

Ọ bụ otu na-azọ ka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụrụ obodo nke aka ya.

Mana gọọmentị Naịjirịa akpọọla ha otu na-eyi ndụ egwu, ma kwuo na o megidere iwu mmadụ isonye n'otu ahụ.

Otu a manyela ọtụtụ iwu n'ala Igbo gụnyere ndị mmadụ kwụsị iji anụ nama ndị ugwu eme mmemme, ndị ọchị ehi si n'ala Igbo kwapụ, ụlọakwụkwọ kwụsị ịbụ abụ ọdinaala Naịjirịa, nnọrọ n'ụlọ wdgz.

Onye bụ Nnamdi Kanu?

Nnamdi Kanu bụ onye hibere otu Ipob n'afọ 2009, ọ bụkwa ya bụ onyeisi otu ahụ ugbua.

Ọ bụ onye Afaraukwu dị n'Umuahia, Abia steeti, n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, mana o nwekwara akwụkwọ gosiri na ọ bụ onye mba Briten.

Kanu bụ onye ama na-ekwu okwu megide ọchịchị Naịjirịa ma na-akpọ oku ka e nwee ntuliaka ebe ndị Ọwụwa Anyanwụ ga-ekwu ma ha achọrọ ịnọgide na Naịjirịa.

Gọọmentị Naịjirịa jichiri Nnamdi Kanu nke mbụ n'afọ 2015, malite ikpe ya ikpe n'ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị Naịjirịa.

N'afọ 2017, Kanu gbapụrụ ọsọ na Naịjirịa, n'ihi na o kwuru nd ndị agha wakporo ụlọ ya ma chọọ igbu ya.

Mana ndị ọrụ nchekwa nwuchikwara ya ọzọ na mba Kenya n'ọnwa Jun afọ 2021, kpụlata ya Naịjirịa.

Ikpe ya malitekwara ọzọ n'ọnwa Sepụtemba afọ 2021.