Canada Truck Protests: Ndị uweojii amịpụtarala ndị na-eme ngagharịiwe anya

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii amalitela iji ike chụpụ ndị na-eme ngagharịiwe na mba Kanada kamgbe izuụka atọ gara aga.
Ndị na-anya nnukwu ụgbọaala 'truck' malitere ngagharịiwe a n'ihi iwu ọhụ kwuru na onye ọbụla ga-agbarịrị ọgwụmgbochi covid19 na mba ahụ.
N'ụbọchị Fraịde ka ndị uweojii malitere iji aka ike achụsasị ndị ahụ na-eme ngagharịiwe.
Ha mere nke a n'ihi na ụlọikpe enyela iwu ka ndị ahụ na-eme ngagharịiwe gbasasịa, mana ha jụrụ ajụ.
Ndị uweojii abupula ụgbọala 'truck' ruru 21, ma nwuchikwaa ụfọdụ ndị gbara isi akwara na ha agahị apụ n'ụzọ.
Ka ọ dị ugbua, o nweghị onye ọbụla e merụrụ ahụ, mana a ga-akpụpụ ndị a nwụchiri n'ụlọikpe.

Ebe foto si, Getty Images
"Otu onye so eme ngagharịiwe aha ya bụ Kevin Homaund gwara ndị ntaakụkọ na ya agaghị akwụsị.
"Nnwereonwe adịghị mfe inweta," Homaund kwuru.
"Gịnị ọzọ ka ha ga-eme karịa ịtụ anyị ịga n'aka ma tukpuo anyị na mkpọrọ?"
Onyeisi ndị uweojii steeti Ottawa bụ Steve Bell kwuru na ya bụ ngagharịiwe megidere iwu n'ihi na ụlọikpe enyela iwu ka ọ kwụsị.
Bell ekwughị kpọmkwem mmadụ ole ndị uweojii nwuchirila, o kwughịkwa mgbe ọrụ ha n'ebe ahụ nwere ike ịkwụsị.
Ihe gọọmentị Naịjirịa kwuru maka ngagharịiwe a

Ebe foto si, Getty Images
Cheta na n'izuụka gara aga ka gọọmentị Naịjirịa ji ngagharịiwe a na-aga n'ihu na Kanda tunyere ngagharịiwe e mere na Naịjirịa n'afọ 2020, a kpọrọ 'End SARS protest'.
Mịnịsta mgbasaozi Naịjirịa bụ Lai Mohammed, rụtụrụ aka etu gọọmentị Kanada si akatọ ngagharịiwe ahụ, mana ha kwadoro nke e mere na Naịjirịa.
Ọ katọkwara ụlọọrụ 'Twitter' maka etu ha si enyere Kanada aka ịkwụsị ya bụ ngagharịiwe, mana n'oge nke Naịjirịa, ọ bụ ha-akwanye ya ọkụ.
"Anyị na-arụ ọrụ site n'ụtụtụ ruo abalị ruo mgbe ọ ga-akwụsị," ka Bell kwuru.












