Kaycee Madu: Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Kaycee Madu, nwa afọ Igbo e mere Minista na ahụ maka ikpe na mba Canada

Ebe foto si, Kaycee Madu/Twitter
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekeleela nwafọ Igbo nwetara ọkwa Minista na-ahụ maka ikpe nke na mpaghara Alberta dị na mba Kanada bụ Kaycee Madu maka ya bụ ọkwa o nwetara.
Nwafọ Igbo Imo steeti bụ Kaycee Madu nwetara ọkwa Minista Ikpe na mba ahụ dịka ọ nọchiri anya Doug Schweitzer bụ onye jibu ọkwa ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
N'ozi ekele ya nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu wepụtara, Buhari kwuru na ya bụ ihe mere bụ "ihe nrịbama" nke gosiri na ụmụ afọ Naijiria na-achakee n'ụzọ dị iche iche ebe ọ bụla ha gara.
Ihe ise i kwesịrị ịma maka Kelechi Madu
- Kelechi Madu a ma dịka Kaycee bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị mba Kanada, banyere ọkwa dịka onye nnọchiteanya mpaghara Edmonton-South West n'ụlọomeiwu Alberta dịka o merichara na ntuliaka e mere n'afọ 2019.
- Ọ bụbụ Mịnịsta na-ahụ maka mpaghara Alberta tupu ọbanye ụlọomeiwu ịnọchite ha
- Madu gụrụ akwụkwọ maka iwu na mahadum, 'University of Lagos' bụ ebe ọ nọ nweta nzere LL.B ya.
- Ya na ezinaụlọ ya zọpụrụ njem gawa Kanada n'afọ 2005 bụ ebe ọ nọ rụọ ọrụ ma mechaa banye ndọrọndọrọ ọchịchị na Edmonton South West dị na Kanada.
- Ya na nwunye ha bụ Emem ji ụmụ atọ, Adannaya, Chisom na Ugonna.
Akụkọ ga-amasị gị:






