You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kenechukwu Okeke: A nwụchiela otu n'ime ndị a na-enyo enyo gburuya - Uweojii Anambra
Ndị uweojii Anambra Steetị sị na aka ha akparala otu n'ime ndị a na-enyo enyo gburu ọkaiwu Kenechukwu Okeke.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na a nwụchiri onye ahụ n'ụtụtụ ụbọchị Fraịde 26 Nọvemba, 2021.
Ikenga sị na nyocha ka na-aga n'ihu ịchọpụ ịma ma aka ya dị ya n'ezie nakwa ndị so ua kpaa arụ ahụ.
Nwụchie na-abịa dịka BBC wepụtara akụkọ etu nwunye na Nne Okeke bụ si kọwaa ka e siri gbuo di nakwa nwa ha n'ọnwa Ọktoba.
Onye gburu nwa m ka na-akpagharị nakwa eyi m egwu - Nne Kenechukwu Okeke
Ọkaiwu gbara ndị mere ngagharịiwe EndSARS akwụkwọ n'ụlọikpe anwụọla ka ọ gbachara afọ 34.
Kenechukwu Okeke nwụrụ n'ụbọchị Oktoba 17, afọ 2021.
Dịka nwunye ya bụ Odinaka Okeke gwara BBC Igbo, Okeke nwụrụ dịka a wakporo ya n'ụlọ ya gbuo ya mma ma mụnye ya ọkụ.
Aha Okeke bụ onye a sị na-akwado Onyeisiala Muhammadu Buhari malitere iwu oge ọ gbara ndị bụ isi a hụrụ kwawa okpu na ngagharịiwe EndSARS akwụkwọ maka ime nke a.
Ọ sị na ọ bụ otu nwoke a kpọrọ Chiadiobi Nnaji ha nyere ụlọ ka o biri n'ọnwa iri gara aga na ndị otu ya bịara wakpoo Okeke, gbuo ya mma ma wụọ ya mmanụ ụgbọala, mụnye ya ọkụ.
Odinaka sị na kemgbe nwoke ahụ kwabatara n'ụlọ ha ka ọ malitere inye ha nsogbu nke mere ha jiri sị ya kwapụ n'ụlọ.
Nwoke ahụ mechara kwapụ n'ụlọ ha ma na-abịakwa enye ha nsogbu ruo ụbọchị ahụ ya na ndị otu ya wakporo Okeke.
"E buuru Okeke gawa ụlọọgwụ bụ ebe ọ nọrọ abalị asaa tupu ọ nwụọ."
Odinaka sị na nwoke a gburu di ya ka na-akpagharị na-enweghi ihe mere ya na-agbanyeghi mkpesa ha mere n' aka ndị uweojii.
Na nkọwa ya, o kwuru na ọ bụ ka ihe mere mechara ka ya ji ghọta na nwaokorobịa ahụ nwere ihe o bu n'obi kwata n'ụlọ ha dịka ha chọpụtara na akara ekwentị na ozi ndị ọzọ o tinyere n'akwụkwọ onye na-ewere ụlọ e nyere ya bụ ozi ụgha.
Ọ sị na ihe ọ chọrọ bụ ka a nwụchie ndị a gburu di ya ma taa ha ahụhụ ruru ha.
Nne Kenechukwu Okeke bụ Virginia Okeke kwara arịrị maka ọnwụ nwa ya ma sị na "Kenechukwu bụ otu nwa m mụrụ".
N'okwu nne ya, "Kemgbe di m nwụrụ n'afọ asa gara aga, Kenechukwu bụ di nyeere m".
Ọ sị na ihe na-akachasị agbawa ya obi bụ na ndị gburu nwa ya ka na-akpagharị na-eyikwa egwu.
Mgbe BBC Igbo jụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Tochukwu Ikenga, ọ sị na ọ maghị maka ya.
Ikenga sị ka e nye ya obere oge ka ọ chọpụta maka akụkọ a ma saa ajụjụ banyere ya mana tupu akụkọ a apụta ọ zabeghi.
Akụkndsị ọzọ ga-amasị gị: