You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ebonyi State Police: Etu e siri gbuo nwunye m, jichie m na mkpọrọ n'ụzọ ezighị ezi - Ọkaiwu
Otu jịkọrọ ndị ọkaiwu a kpọrọ Nigeria Bar Association (NBA) ngalaba nke Ebonyi steeti edegarala Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Garba Aliyu akwụkwọ mkpesa rịọ ya ka o nyochaa ọgbụgbu e gburu nwunye onye otu ha dịka ndị uweojii jichiri di ya na mkpọrọ ha.
E gburu Oriakụ Amechi Gloria Enyi bụ nwunye Ọkaiwu Shedrack Enyi Amaechi n'ụlọ ha dị na #1 Enyi Street Nkaliki Road n'Abakaliki n'abalị 26 nke ọnwa Novemba, afọ a.
Otu a kwuru nke a n'ozi mgbesa nke otu ahụ dere n'abalị 26 nke ọnwa Novemba 26, afọ 2021, nke ha zigara Kọmishọna uweojii nke ndị isi otu ahụ gunyere onyeiusioche ha bụ Ọkaiwu UC Igba bụ onyeisi ha binyere aka.
Otu ahụ sịrị na "DPO nyere iwu ka a tụnye onye otu anyị na mkpọrọ na Satode abalị 20 nke ọnwa Novemba, bụ ebe ọ nọ rue Monde abalị 22 nke ọnwa Novemba 2021 oge e gburu nwunye ya".
Otu ahụ chọrọ ka onyeisi ndị uweojii steeti ahụ jụọ DPO Ikechukwu Okoro, IPO Geoffrey Aghachi, Insp. Emmanuel Lawrence na nwunye bụ ndị bi n'ụlọ onye otu ha na-elekọta ihe ha maa maka ọnwụ Enyi nakwa nkpochi di ya.
Mana Komishona Alyu kwuru na ya enwetabeghị ozi maka ọnwụ nwaanyị ahụ nke ya na anata ozi mkpesa otu ndị Ọkaiwu steeti ahụ.
Ọkaiwu Amaechi gwara ndị ntaakụkọ na nsogbu ya malitere n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Nọvemba, mgbe nwunye onye uweojii Emmanel Lawrence bụ ndị bi n'ụlọ ọ na-elekọta anya kpụpụrụ ya n'aka ndị uweojii.
Na nkọwa ya, ihe butere okwu bụ na nwaanyị ahụ malitere ịzụ ọkụkọ n'ụlọ ahụ nke megidere ọtụtụ ndị ọzọ bi ebe ahụ mana ọ gwara ya wepụ ụlọ ọkụkọ ahụ.
Nwaanyị ahụ kpọọrọ ya ndị uweojii bụ ndị kpọchiri ya na mkpọrọ mana o ji puku naịra iri gbapụta onwe ya.
Amaechi sị na ya wepuru okwu ahụ site n'aka ndị uweojii CPS gawa n'isiụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ebonyi maka na anọghị na-eso ya dịka o kwesịrị.
Ọ sị na nke ahụ were onye DPO nke CPS bụ Ikechukwu Okoro na ndị ọrụ iwe nke mere o jiri sị na ọ ga-emesi ya ike.
Ọ sị na DPO ahụ zipuru ndị otu ya ha bịa nwuchie ya ọzọ n'ụbọchị Satọde 20 Nọvemba 2021 ma kpọchie ya na mkpọrọ ọzọ.
Ọ sị na mgbe nwunye ya bịara n'ụtụtụ Sọnde 21 Nọvemba inye ya nri na ndị uweojii naara nwunye ya akara ekwenti ya.
Na mgbede Sọnde ahụ, ọ sịrị ka e nye ya ekwentị ka ọ kpọọ nwunye maọbụ onye ga-abịa gbapụta ya, ndị uweojii ụmụnwaanyị abụọ nọ n'ọrụ sịrị ya na IPO Geoffrey Aghachi ji ekwentị ya lawa.
Ọ sị na ọ bụrụ na ndị uweojii gara n'ụlọ ya n'abalị Sọnde ahụ were mma sụgbuo nwunye n'ụlọ.
Amaechi sị na ihe mere o ji sị na ọ bụ ndị uweojii gburu nwunye bụ maka na e nweghi etu mmadụ ga-esi banyenwuo n'ụlọ ya maka na ọ bụ naanị ya na ezinaụlọ ya bi.
Na ọ bụ na Sọnde ahụ ka ha ji akara ekwentị ya kpọọ nwunye ya n'ekwentị, nke mere ha jiri banyenwuo n'ụlọ ya gbuo nwunye ya.
Ọ sị na ọ bụ echi ya bụ ụbọchị Mọnde ka DPO Okoro bịara n'ụlọmkpọrọ gwa ya maka ọnwụ nwunye ya mgbe ha tinyechara ozu ya n'ụlọozu.
Ọ gara n'ihu kwuo na nwa ya nwaanyị dị afọ itoolu nọ mgbe e gburu nwunye ya sị na ọ bụ otu onye kpara arụ ahụ.
Ọ sị nwa ya rịọrọ onye ahụ ka ọ ghara igbu nne mana onye sị ka nwata ghara ile ya anya mgbe ọ na-egbu nne ya.
Amaechi na-akpọku Kọmishọna uweojii n'Ebonyi bụ Aliyu Garba na ndị ọrụ na-eru n'okwu ka ha chọpụta ndị a gburu nwunye ya.
Mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Loveth Odah, ọ sị na ọ nụbeghi maka akụkọ ahụ.