You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kenechukwu Okeke: Aka ndị Igbo adịghị n'akwụkwọ nwamadị a gbara ndị so mee nbgagharịiwe SARS
Otu a kpọrọ 'Otu 'Conference of Igbo Youth Professional Worldwide' sị agọnarịla Kenechukwu Okeke maka ịkpụpụ ndị so mee ngagharịiwe EndSARS n'ụlọikpe.
N'ozi onyeisi otu a bụ Maduabuchi Nwodo wepụtara sị na nwoke a abụghị onye otu ha, na-amaghị onye ọ bụ na mpaghara Ọwụwanyanwụ.
Ọ sị na ndị kwadoro ka Okeke gbaa akwụkwọ a bụ ndị na-achọghị ọdịmma ndị Naịjirịa, chọrọ imebi aha onyeisiala n'ihu mbaụwa.
Otu a gwara ndị Naịjirịa gbaa Okeke na ndị nkwado ya nkịtị na agwa abụghị ihe Naịjirịa chọrọ ugbua.
Lee ndị Kenechukwu kpụpụrụ n'ụlọikpe maka ngagharịiwe EndSARS
Dịka okwu gbasara ngagharịiwe 'End SARS' nke e mere na Naịjirịa n'izuuka ole na ole gara aga ka na-aga n'ihu, otu onye a kpọrọ Kenechukwu Okeke, akpụpụla ndị so hazie ngagharịiwe ahụ ụlọikpe.
Ndị aha ha dị n'akwụkwọ ikpe ahụ gụnyere: Aisha Yesufu, ụkọchukwu ụlọụka DayStar bụ Sam Adeyemi, ndị otiegwu Peter na Paul Okoye (PSquare), Chinedu Okoli a ma dịka "Flavour" na Chibuzor Azubuike a ma dịka Phyno.
Ndị ọzọ bụ Folarin Falana (Falz) Bankole Wellington (Banky W), Innocent Idibia (2Face), David Adeleke (Davido), Ọkpaọchị Debo Adebayo nke a ma dịka Mr Macaroni," ọgbaabọọlụ Kanu Nwankwo, onye ejije Nollywood bụ Yul Edochie, na ọkaiwu Feyikemi Abudu.
Aha ndị ọzọ dịkwa n'akwụkwọ ụlọikpe ahụ bụ: Ọkammụta Joe Abah, Onye ejije Uche Jombo, otiegwu Tiwa Savage, onye ntaakụkọ Kiki Mordi, nakwa onye Ọkpaọchị Ayodeji Richard Makun (AY).
N'akwụkwọ ụlọikpe ahụ nke Kenechukwu tinyere n'akara Twitter ya, o boro ndị haziri ngagharịiwe a ebubo na ha haziri ọgbakọ ezighị ezi n' iwu.
Okeke kwukwara na e mebiri ọtụtụ ihe ya n'ọgbaaghara dapụtara na ya bụ ngagharịiwe.
Onye bụ Kenechukwu Okeke?
Tupu akụkọ a apụta n'ehihie Tuzde, onwechaghị onye ma aha a bụ Kenechukwu Okeke, kama nwa amadi a kọwara onwe ya dịka onye na-akwado ikike dịịrị onye nke a na-akpọ 'human rights activist' na bekee.
Okeke dekwara na ya bụ onye ozi Chineke ma bụrụkwa 'Eze Nri', nke a nwere ike ị na-arụtụ aka na ọ bụ onye Nri nke dị n'Anambara steeti.
N'ọnwa Mee afọ a, nwa amadị a bụ Kenechukwu kwukwara na ọ ga-akpọpụ ndị uweojii ụlọikpe ma ọ bụrụ na ha amaliteghi inyocha ndị otu ha maka ọrịa isi mgbaka.
O kwuru nke a n'ihi akụkọ pụtara oge ahụ maka nwata nwaanyị ndị uweojii gbagburu.
N'ọnwa Jenụwarị afọ 2019, Kenechukwu Okeke gbara gọvanọ Anambra steeti akwụkwọ, ma na-ekwu na etu o si wepụta bọjeetị nke afọ ahụ adabaghị adaba n'iwu Naịjirịa.
Ọzọkwa, n'ọnwa Ọgọst 2019, ya bụ nwata nwoke kpọpụkwara gọọmentị Anambra steeti ụlọikpe maka mmachi ha machiri ndị na-agba ọgbaatumtum ụkwụ atọ, nke a ma dịka Keke.
Ihe ụfọdụ ndị a gbara akwụkwọ a na-ekwu maka ya
Aisha Yesufu kwuru na obi bụ ya sọ aṅụrị n'ihi na aha ya bụ nke mbụ n'akwụkwọ ahụ.
Otu onye aha ya bụ Pamilerin Adegoke kelere Chineke na aha ya dị n'akwụkwọ ahụ
Omoyele Sowore na-ajụ kedụ ụbọchị ya bụ ikpe ga-amalite ka ha gawa agawa.
@Tissann_ kwuru na ọ ka mma ka a gbaa onye ntorobịa ọbụla nọ na Naịjirịa akwụkwọ