You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Justice for Chima: Ndị uweojii kwuru na ọ bụ ọrịa shuga gburu onye nwụrụ n'ogige ha
Ndi uweojii na Pọtakọt nke Rivas steeti ekwuola na n'ezie na onye 'mekanik' aha ya bụ Chigozie Ikwunado nwụrụ n'ogige ha dịka ha jichiri ya.
Mana dịka ọ na-ewu na soshal midia na e gburu ya egbu, ndị uweojii na-ekwu na ọ bụ ọrịa shuga gburu nwa amadi ahụ ka ọ nọ n'aka ha n'ogige ha dị na Mile One, Pọtakọt.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni gwara BBC sị: "Anyị ma maka ihe mere nakwa ihe ndị ụlọọrụ ntakụkọ na-ekwu na ịntanet."
"Dịka m nọ ugbua mụ na onyeisi otu ndị uweojii 'E-Crack' bụ SP Benson Adetuyi nọ."
"O kweere nkwa na ọ ga achọpụta ihe mere nwoke ahụ nwụrụ na mkpọrọ ndị uweojii."
"Oge ha mechara nnyocha ozu ya, o gosiri na obu oke shuga dị ya n'ahụ."
Akụkọ na-efegharị na soshal midia nke si n'ọnụ ndị mara Chima na-ebo ebubo na ndị uweoji kugburu Chima dịka ha jichichara ya n'ihi ịgba ụgbọala n'okporo ekwesịghị maka na ọ jụrụ inye ha aka azụ.