Supreme Court Judgement: Hope Uzodinma emeriela dịka gọvanọ Imo steeti

Ụlọikpe Kachasị na-anọkọ ikpe ikpe Gọvanọ Emeka Ihedioha nke Imo state enyela Hope Uzodinma mmeri na mgbede a.

Mkpebi gbara ọkpụrụkpụ ha kpebiri:

  • Ndị ọkaikpe nyere mkpebi ahụ kwuru ka Gọvanọ nọ n'ọche ahụ kwara lawa ozigbo.
  • Ha nyere iwu ka Inec napụta gọvanọ Emeka Ihedioha akwụkwọ Asambodo mmeri.
  • Ha nyekwara iwu ka a duo Uzodinma iyiọrụ dịka Gọvanọ.

Cheta na izuụka abụọ gara aka, Fada Mbaka mụnyere ọkụ na soshal midia dịka o buru amụma na Uzodinma ga-eweghara oche Gọvanọ Imo steeti.

Chetakwa na ha higharịrị ikpe Gọvanọ Abdullahi Umar Ganduje nke Kano steeti gaa ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Jenuwarị 2020.

Ebe a ka ha ga-ama onye meriri ntuliaka gọvanọ steeti ha dịka ụlọikpe ukwu ga-ekwu.

Rochas ekelela Uzodinma maka mmeri ya n'ụlọikpe

Aka chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekelela gọvanọ ọhụrụ bụ Hope Uzodinma maka mmeri ya n'ụlọikpe Kachasi

Okorocha onye bụ Sinetọ na-anọchite Imo-West n' ụlọ omeiwu ukwu kelekwara otu APC maka mmeri ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na kwuru n'ozi nke ọ nụ na-ekwuru ya bụ Sdam Onwuemedo binyere aka na ga na-enye ọchịchị Uzodinnma ezi nkwado.

Ihe mere n'ụlọikpe kachasị ụbọchị 14/01/2020

Ọkaikpe Tanko Muhammad, bụ onyeisi mmadụ asaa ndị ọkaikpe kpere ya bụ ikpe yighariri ya ka o gechara mkpesa ọkaiwu ndị ikpe ahụ metụtara.

Abba Kabiru-Yusuf, bụ onye zọrọ ọkwa gọvanọ Kano steeti n'otu PDP, na-arịọ ka ụlọikpe kachasị kpọpụta ya dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.

N'otu aka ahụ kwa ka ndị otu APC na-arịọkwa ka a chutuo Ihedioha n'ọkwa gọvanọ.

Lee onyonyoo etu ndị ọkaiwu si jupụta n'ụlọikpe 'Supreme Court' n'ụtụtụ Tuzde:

Akụkọ na-abịa.