You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe i kwesiri ma maka Chioma Uzodinma; nwunye gọvanọ Imo steeti
Site n'ụbọchị 15 nke ọnwa Jenụwarị 2020, Chioma Uzodinma abụrụla nwunye gọvanọ Imo steeti.
Ọtụtụ ndị ma di ya bụ Hope Uzodinma; bụ onye ọ lụrụ n'afọ 2015 ka ọ gbachara nwunye ya nke mbụ alụkwaghịm, mana ụfọdụ amaghị Chioma a bụ onye ga-abụ 'nne mbụ' na steeti ahụ.
Lee ihe ndị BBC Igbo chọpụtara maka nwaanyị a.
- Ọ na-aza Chioma Ikeaka, tupu ọ lụọ di
- A mụrụ ya n'ọnwa Disemba afọ 1989, n'ezinaụlọ Humphrey na Beauty Ikeaka
- Ọ bụ onye Ideatọ dị n'Imo steeti
- Ọ bụ naanị otu nwa nwaanyị nne ya mụrụ, mana o nwere ụmụnne ndị nwoke abụọ
- Ụlọakwụkwọ Primarị ya bụ International Early Learning Centre dị n'Aba, Abịa steeti ebe o toro
- Ụlọakwụkwọ Sekọndrị ya bụ Dority International Secondary School.
- Ọ gụrụ dịka Ọkaiwu na mahadum Imo steeti (IMSU)
- Ọ gụkwara n'ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu bụ nke a na-akpọ 'law school' na Bekee, n'Abụja
- Ọ rụọla ọrụ dịka 'Junior Associate' n'ụlọọrụ ndị ọkaiwu a kpọrọ Emeka Etiaba & Co, nakwa Rickey Tarfa & co na Chris Uche & co.
- Ndị ma ya sị na ọ naghị enye nsogbu, na ọ na-adị ezigbo nwayọ
- Ọ mụrụ diọkpara ya n'afọ 2016. ka otu afọ ọ lụchara di gachara
- Ọ mụrụ ụmụejima nwaanyị abụọ n'afọ gara aga, iji meruo ọnụọgụgụ ụmụ ya atọ.
Ihe nkiri a ga-amasị gị: