You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
#EndSARS: A chụọla onyeuweojii maka ịna akaazụ N5,000
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
A chụrụ Charles Omotosho bụ ịnspectọ na-arụrụ FSARS ọrụ na mpaghara Ikorodu dị na Legọs maka ịnapụ ndị na-akwọ ụgbọala bị na mpaghara ahụ ego.
Osote onyeisi ndị uweojii bụ Abayomi Shogunle gwara BBC na ihe ahụ mere n'ezie.
Shogunle sịrị na a chụrụ Omotosho maka ị naa aka azụ.
O kwuru na ebukwara ndị uweojii atọ ndị ọzọ ha na Omotosho soro nwere kpaa akwụ n'ọkwa.
Nke a na-eme ka ọ gachara ọnwa atọ otu onye bi na Ikorodu a kpọrọ Princess Ife depụtara na ya ji ekwenti ya zigara nwaadi ahụ bụ Omotosho ego ka majara ya na ya ga-agbagbu ya ma ọ bụrụ na ya akwụghị ya puku naira ise.
Akụkọ ga-amasị gị: