Davido: Gịnị jịkọrọ Davido na Ndigbo?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Aha David Adeleke ,otiegwu ama dịka Davido na-ewu ewu tata bụ Tọọsde sde na soshal midia maka na ọ gara n'ogige ndị ji otu afọ efe ala Naijiria na Legọs dịka otu onye n'ime ha.

Dịka o siri depụta n'igwe okwu Twitter ya, ndị ogbo ya na ndị ọrụ NYSC wakporo ya.

Njem a ọ gara ibido ofufe ala nna mere Davido okwu akpụ n'ọnụ ogige ahụ nakwa na soshal midia.

Cheta na nsonso, Davido kpanyere ọkụ na soshal midia oge egwu ọhụrụ ya bụ 'nwa-baby' pụtara...

Davido emepụtalarị 'Assurance' o tiri maka enyi ya nwaanyị bụ Chioma nakwa ọzọ wuru ewu bụ 'Flora my flawa'.

Mana ị ma ụzọ Davido jiri yie ndị Igbo?

  • 1. Ọ na-ayị onye Igbo.

Kemgbe mbido 2018, ihe kacha ewu na ndụ Davido karịchaa egwu ndị o tiri na nturuugo BET o ritere na mba Amerịka, bụ enyi ya nwaanyị bụ Chioma Avril Rowland.

Nkwupụta Davido na ọ na-ayị Chioma so mee ka ọtụtụ ndị Igbo bido ị hụ ya n'anya karịchaa etu ọ dị na mbụ.

Ka Davido bidoro ịyị Chioma, e setere ya n'ihe nkiri ebe o kwuru sị na "ndị Igbo na-enwe mmeri".

  • 2. O tiela egwu nwere aha Igbo.

Davido tiri egwu aha ya bụ 'NWA BABY'.

N'agbanyeghị na ọ bụ onye Yoruba, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ maka na ọ na-ayị onye Igbo mere o ji họrọ aha Igbo.

@iamflamie1 na-ekwu na ụmụnwaanyị Igbo na-anwakwa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: