You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
14th Headies: Ihe ị kwesiri ịma, oge, ebe na etu ị ga-esi kiri emume a
Emume Headies nke afọ 2020 ga-apụ nnukwu iche makana ndị mmadụ agaghị enwe ohere ha na ndị oti egwu na-amasị ha ịnọkọ n'ọgbọ emume ahụ.
Nke a bụ mbụ udiri ọnọdụ a na-eme nakwa ọ ga-abụ n'elu intanet ka a ga-ekiri ya.
Ndị hibere emume a na-agba mbọ ịhụ na ya bụ emume a ga-eme n'ụbọchị February 21, 2021 bụ nke ọtụtụ mmadụ kacha bịa site n'isonye n'intanet.
Ọ bụ maka usoro mgbọchị mfesa ọrịa covid Lagos nakwa Naịjiria wepụtara kpatara nke a.
Dịka ọ dị kamgbe afọ 2016, Ọ bụkwa n'Eko Convention Centre , ebe e nwere ụlọ oriri na nkwari ka ya bụ emume ka kpọtụ.
Ihe ndị mmadụ na-elegara anya
N'afọ a , ndị na-eso ndị dịka Tems, Omah Lay, Oxlade nakwa Bella Shmurda ga na-atụ anya ka oti egwu ka masị ha bute mmeri ma mee ọtụtụ ihe iribama dịka ṅdị ọzọ riterela nturugo Headies si eme.
Mana nturugo kachasịnụ bụ nke 'Artiste of di Year' nke o nwebeghị oti egwu ọbụla ritere ruo ugboro atọ.
Wizkid na Davido enwetala ya ugboro abuọ ma na-elekwa anya inweta ya nke ugboro atọ mana ha na ndị dịka Burna Boy, Mayorkun nakwa Tiwa Savage ga-akwata na Headies nke afọ 2020.
Akụkọ na-abịa
Headies 2018: Davido bụ onye kachasị turu ugo
David Adedeji Adeleke, onye otiegwu a maara amara dịka,'Davido',bụ onye turu ugo ọkachasị n'iti egwu(artiste of the Year) na nnturuugo Headies mere n'abalị Satode.
Egwu Davido a kpọrọ 'Fia' tukwara ugo dịka bụ egwu kachasị mma (Song of the Year), nakwa egwu kacha ewu(best pop song)
'Oge eruola ị nyere ndị oti egwu ka na-apụta apụta aka'
N'okwu ya oge ọ na-anara nturugo ahụ, Davido kwuru na oge eruola ndị ụkwa ha kwusiri ike n'iti egwu inye ndị na-apụta apụta nkwalite na nka ha.
Ọ sị,"oge eruola inyere ndị otiegwu ka na-apụta apụta aka".
Ndị ọzọ nwetara nntulugo bụ Simi,Wizkid,Omawunmi, Tiwa savage na ndị ọzọ.
Simi na ndị otiegwu ụmụnwaanyị
Simi pụtara dịka onye ọkachasị eti egwu n'ime ụmụnwanyị n'afọ 2018.
Simi turu ugo onye nchịkọta egwu kachasị mma, onye egwu kachasị ụtọ abụ gbasara ihunaanya na onye ritere 'Best Recording' n'afọ 2018.
Simi nupuru Tiwa Sava n'okwa nke a.
Ma ọ tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya na egwu Olamide na Phyno abaghị na ndị turu ugo na mmemme ahụ.
Ụfọdụ nturu ugo Davido turu n'oge garaaga
Davido enwela nzere ruru iri atọ.
Ụfọdụ n'ime ha bụ onye okacha eti egwu BET, MTV Africa, Kora, Channel O na Headies.
Ọ bụ egwu Davido tiri n'afọ 2011 ọ kpọrọ 'Dami Duro' bụ ihe mere ka ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa na mpaghara Afrịka marị ya ọfụma ọfụma.
Ugbua Davido bụ onye ama ama na mba ụwa niile.
Ụfọdụ n'ime egwu Davido bụ Fall (2010), If (2017), Aye (2015), The Sound (2015) na Biko (2016) na ọtụtụ ndị ọzọ.
Akụkọ ga-amasị gị