Nnamdi Kanu: Ndị ntoroọbịa Ohaneze Ndigbo kwadosiri ike ka eji udo kpezie okwu ya - Onwuasoanya

Ebe foto si, Getty Images
Ndi ntoroọbịa Ohaneze Ndigbo ekwuola na ha nabatara atụmatu iji mkparịtauka udo kpezie okwu Nnamdi Kanu.
Onyeisi otu a na nwamgbenta bụ FCC Jones Onwuasonya gwara BBC Igbo na gọọmentị Naịjirịa na-enye ndị dị ka Boko Haram ohere ichegharị, Kanu kwuru sọsọ okwu abụghị onye a ga-asị n ụdịrị atụmatụ ahụ agaghị eru aka.
Maazị Onwuasonya sị na ọ bụ mgbọ Ohaneze Ndigbo na ndị ọzọ na-agba n'azụ maka inwete mkpezi okwu Kanu n'ụzọ abụghị nke ụlọikpe mịtara mkpụrụ a.
Ọ sị: "Ohaneze na-ekwusi ike na ọ bụ ihe Bekee na-akpọ political solution bu usoro a ga-eji soro okwu Nnamdi Kanu. Ihe Ọkaiwu Malami kwuur gosiri na gọọentị Naịjirịa na-ege ntị ụdịrị okwu ahụ. Nke a bụ ezigbote ihe."
A ga-atọhapụ Kanu n'enweghị agbụ ọbụla ekere ya tupu okwu udo amalite - Aloy Ejimakor
Cheta na ọkaiwu pụrụiche nke Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor gwara BBC Igbo ebumnuche ha banyere atụmatụ ikpe udo n'etiti ya na gọọmentị.
Ọ sị na atụmatụ a abụghi ihe ebube maka gọọmentị Naịjirịa, site n'akara 17 nke iwu ji ulọ ikpe ukwu (nke Bekee kpọrọ Federal High Court Act), nwere ikike ịmalite njem mkpezi n'etiti ndị no n'ụlo ikpe iji hibe mkpezi ziriezi.
Mana, Ọkaiwu Ejimakor, dịka o gwara BBC, tụrụ aka na ọ bụ etu e si tụhapụ Nelson Mandela na Sawụt Afrịka bu atumatu mkparịtaụka mbụ e nwere mere ka apartheid laa na mba ahụ.
Cheta na Ejimakor gwara ụlọ ntaakụkọ Punch na Nnamdị Kanu dibu njikere ka ya na gọọmentị Naịjirịa mee mkparịtaụka tupu anwụchie ya.
Ọ gwara Punch: "Cheta nu na na mbido ọnwa Sepụtemba nke 2017 Kanu na ndị ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ nọ na-eme mkparịtụka nke gọọmentị etiti Naịjirịa kwadoro tupu atumatụ "Python Dance bịara chabie ya.
Ọ sịkwa na ugbua, ọ bụ gọomentị Naịjirịa ji ji jikwara mma. "Ọ bụ ha ka ọ dịrị ịmalite okwu a."
Cheta na ụfọdụ ulọntakụkọ dere na Ọkaiwu Ukwu nke Naịjirịa bụ Abubakar Malami kwuru na gọọmentị etiti anaghi agụpụ atụmatu ikpe udo n'okwu Nnamdi Kanu nakwa Sunday Adeyemo, bu onye e ji Sunday Igboho mara.
Ejimakor si na onweghi oge Kanu jiri kwuo okwu maọbụ kpaa agwa gosiri na ya achọghị ka enwe nkwekọrịta.
Mana, ọ sị na o zighiezi ị na-akparịtaụka ma ya bụru na onye a na-ekwu maka ya nọ n'agbu.
Otu Ohaneze Ndigbo nọ n'isi ndị na-asi ka ekwu okwu Kanu ekwu n'etiti ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ndị eze odinala.
Dịka a na-azo ọkwa gọvanọ Anambara, ọtụtụ ndị na-adọ ndọrọndọrọ ahụ sikwa ka ejiri atụmtau mkparịtaụka udo kpezie okwu ahụ.
Onye meriri na ntuliaka ahụ bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo gwara BBC Igbo na okwu Kanu bụ ihe ekwesiri ịdọnọrụ n'oche kpaa ka nwanne na nwanne.
Sinatọ Enyinnaya Abaribe sokwa kwuo na ọ bu atumatu ka mma iji kpezie ya bu okwu.
Cheta na Gọomenti Naịjirịa na-ebo Kanu ebubo na ọ na-akpa nkata megide Naịjirịa nakwa na ọ na-eyi ndụ egwu.
Ọ bụ n'ihu Ọkaikpe Binta Nyako ka a na-ekpe ya ikpe.












