Abdulrasheed Maina: A tụọla ya nga afọ asatọ maka izu ego ndị lara ezumike nka

Ebe foto si, FACEBOOK/ABDULRASHEED MAINA
Ọkaikpe Okon Abang a tụọla Abdulrasheed Maina nga afọ asato dịka ọ mara ya ikpe maka ebubo na ọ zuru ego ndị lara ezumike nka gafere ijere narịa abụọ.
N'ikpe ya, Ọkaikpe Abang si na Maina zuru ego ndị lara ezumike nka, nke mere na "ọtụtụ n'ime ha afụghị ego ha tara ahuhụ ya tupu ha alaa mụọ".
Ọ sị: "A mara m Maazị Maina Ikpe n'ime ebubo 2, 6, 9, 3, 7 na 10."
Ọ bụ afọ 61 ka atụrụ Maịna mana a dịka ọ ga-anọkọ ataramahụhụ ikpe ndị a a mara ya, ọ bụ sọsọ afọ asatọ ka ọ ga-anọ.
N'ime ọnwa gara aga, ụlọikpe ahu tụrụ nwa Maina aha bu Faisal nga dika ikpe mara ya n'ime ebubo na ọ zuru nde naịra 58.1.
Ọ bụ n'ụbọchị 25 nke Ọktoba 2019 ka ngalana Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpụrụ Maazị maina gakwuru Ọkaikpe Abang.
Ụlọ ọrụ Common Input Property and Investment Ltd sọkwa na ndi akpụ gaa ụlọ ikpe.
Ọ bụ ebubo 12 ka EFCC wakwasara n'isi Maịna n'ụbọchị ahụ.
Otu ebubo ahu bụ na o ji ụlọ ọrụ ya gbarie ijere naịra abụọ site na-igo ụlọ dị iche iche n'Abuja.
Ọ sị na ọbụghị eziokwu na ya mere ihe ndị a.
Onye bụ Abdulrasheed Maina?
Maazị Maịna bụbu onyeisi ngalaba na-ahụ maka ụgwọ ezumike akpọrọ "Presidential Task Force Team on Pension Matters" (PRTT) nke Goodluck Jonathan hibere mgbe ọ bụ onyeisiala.
Ọ bụ n'afọ 2010 ka Jonathan họọrọ Maina ka ọ nọrọ n'isi ndị na-elebanye anya na mpụ dị n'ụgwọ ezumike nke Bekee kpọrọ 'Pension'.
N'afọ 2012 e boro Maina ebubo oke nrụrụ aka gbasara ụgwọ ezumike nka ndị mmadụ ruru ijeri narị narịa.
Ngalaba ụlọ omeiwu a kpọrọ "Commitee on Public Service and Establishment and State and Local Government Administration" nyochara ebubo a ma maa Maina ikpe.
Maina kpụpụrụ ngalaba ụlọ omeiwu a na onyeisi uweojii Naịjirịa ụlọikpe.
Ka o mechara nke a, onweghịzi onye hụrụ Maina anya ọzọ, nke mere ndị uweojii jiri sị na ha na-achọ ya achọ.
Gọọmentị chụrụ ya n'ọrụ ma wepụ okwu ya ụlọikpe.
N'afọ 2015, EFCC kpụpụrụ maazị Maina na onye bubụ onyeisi ndi ọrụ gọọmentị bụ Steve Oronsaye na ndi ọzọ ụlọikpe.
Ka ndị ọzọ si na-aka ha dị ọcha, anya ahụghị Maina.
Maina sepụtere isi ọzọ n'afọ 2017 mgbe gọọmenti Buhari weghacitere ya n'ọrụ ma bulie ya n'ọkwa.
Ka mba dawara ebe niile maka atụmatụ a, onyeisiala Muhammadu Buhari nyere iwu ka a chụo ya ozugbo.
Onye weghachiri ya n'ọrụ?

Ebe foto si, Winifred Ekanem Oyo-Ita
Maazi Maina na-esi ọnwụ na Onyeisiala Buhari ma maka nlaghachite ya.
Winifred Oyo-Ita bụbu onyeisi ndị ọrụ na Naịjirịa sị na aka ya adịghị ya.
Akụkọ kwuru na onye bụbụ Minista na-ahụ maka ime Naịjirịa bụ Abdulrahman Dambazau na Minista na-ahụ maka ikpe bụ Abubakar Malami ma maka ihe a mere.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:













