Mosquito Bites: Lee ihe asaa mere ahụ gị ji adọta anwụnta karịa ndị ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ oge ka ụfọdụ mmadụ na-ekwu na anwụnta anaghị ekwe ka ha tinye ụra n'anya.
Mana ndị ọzọ nọkwa n'otu ebe ahụ anaghị aghọta ihe ha na-akọ n'ihi na anwụnta anaghị ata ha.
Nke a bụ maka na ndị ahụ ha na-adọta anwụnta karịa ndị ọzọ.
Ihe na-akpata anwụnta ji agakwu ụfọdụ ma na-agbara ụfọdụ ọsọ dị icheiche.
Nnyocha Sayensị gosiri n'ezie na ọ bụghị mmadụ niile ka ahụ ha na-amasị anwụnta.
Lee ihe asaa mere ahụ gị ji atọ anwụnta rịrịrị nke mere i ji bụrụ ezigbo enyi ya:
1) Agwa (Colour)
Nnyocha egosila na anwụnta na-achọkarị ebe gbara ọchịchịrị karịa ebe nwere nnukwu ihe.
Nke a pụtara na anwụnta ga-aka agakwu onye yi uwe ojii maọbụ uwe na-anaghị amuke amuke.
Ọ bụrụ na i yi akwa ojii, o nwere ike bụrụ ihe na-adọtara gị anwụnta.
2) Ọsịsọ (Sweat)

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụrụ na i nwere ahụ na-agba oke ọsịsọ, mara na gị na-anwụnta ga-abụ nnu na mmanụ.
Nke a bụ maka na nnyocha gosiri na ebe na-ekpo ọkụ ma nwee mmiri, na-amasị anwụnta nke ukwuu.
Chetakwa na ọsịsọ nwere isi ọ na-ewepụta n'ahụ mmadụ nke nwekwara ike ịdọta anwụnta.
3) Mmanya na-aba n'anya (Alcohol)

Ebe foto si, Getty Images
Na 2020, ndị ọkachamara mere obere nnyocha nke gosiri na anwụnta na-aka agakwu ndị ṅụrụ mmanya na-aba n'anya, ọ kachasị nke bekee na-akpọ 'beer'.
O dochaghị anya ihe kpatara nke a, mana a na-eche na o nwere ike ịbụ maka isi ya.
4) Ụdị ọbara
Nnyocha gosiri na ndị nwere ụdị ọbara O na-aka amasị anwụnta karịa ndị nwere ụdị ọbara A maọbụ B.
Iji mee nnyocha a, e tinyere mmadụ ole ma ole n'ime otu ọnụ ụlọ, mana anwụnta tara ndị nwere ụdị ọbara O pasentị 83, ebe ọ tara ndị nke ọzọ pasentị 46.5.
Mana a ka na-eme nnyocha iji mata ihe kpatara nke a.
5) Onye dị ime

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ụfọdụ nnyocha siri gosi, ahụ ụmụnwaanyị dị ime na-aka amasị anwụnta karịa ndị na-adịghị ime.
Nke a nwereike ịbụ maka maka na ahụ nwaanyị dị ime na-ekpotụ ọkụ karịa onye nke adịghị ime.
Ụmụnwaanyị dị ime na-akakwa ekuputa ikuku 'carbon dioxide' karịa.
Ụdị ikuku a na-amasị anwụnta nke ukwuu.
6) Mgba isi ọma (perfume)

Ebe foto si, Getty Images
Cheta na enwere okooko (flower) na-amasị ụmụanwụnta ifega.
Chetakwa na ọtụtụ mgba isi ọma bụ okoko ndị nwere isi ọma ka e ji emepụta ha.
Ọ bụrụ na ụdị mgba isi ọma nke ị gbara na-ahụ gị bụ ụdị nke e ji okoko na-amasị anwụnta mepụta, mara na gị na anwụnta ga-abụ enyi n'ụbọchị ahụ.
7) Ahụ isi
Ihe na-akpata ahụ mmadụ ji esi isi, maọbụ 'body odour' na bekee, bụ ihe anaghị ahụ anya nke bekee na-akpọ 'micro organisms'.
Ihe ọzọkwa bụ mburupụtaụwa bekee kpọrọ 'genetics'.
Ọ bụrụ na mmadụ nwere ahụ isi, anwụnta nwere ike ị na-abịakwute ya karịa.
Nke a bụ maka na anwụnta na ụmụ 'micro organisms' ụfọdụ na-akpata ahụ isi na-adị na mma.
Ihe ị ga-eme iji belata anwụnta ịhụ gị n'anya:
- Chọọ ude pụrụ iche na-achụ anwụnta; bekee na-akpọ ya 'mosquito repellent'.
- Na-eyi akwa nwere ogologo aka ma ọ bụrụ na ị nọ n'ogbe anwụnta dị nnukwu.
- Na-eyi akwa na-achake achake. Zeere akwa ojii.
- Wepụ ebe anwụnta nwere ike ịnọ na-amụba n'okirikiri gị, dịka ọdọ mmiri, ahịhịa na ihe ndị ọzọ.
- Mechie ụzọ na mpio ka anwụnta ghara ịbata.













