Akanu Ibiam International Airport : NCAA ekwuola ụbọchị njem mba ofesi ga-amalite n'ọdọụgbọelu Enugwu Steeti

Akanu Ibiam Airport

Ebe foto si, Akanu Ibiam Airport

Akwụkwọ ozi BBC Igbo hụrụ na-ekwu na ngalaba Nigerian Civil Aviation Authority bụ NCAA n'aha ịchafụ ekwuola na ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam nke dị n'Enugwu Steeti ga-ebido njem mba ofesi site n'ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2021.

Ha kọwara na ha na-ama ọkwa a dịka ngalaba gọọmentị na-ahụ maka ibuso ọrịa covid-19 ọgụ bụ Presidential Task Force (PTF) kwuru na ha ebeletala mmachị ịme njem mba ofesi.

Ha kwukwara na ya bụ ikike njem mba ofesi ga-ehiwe isi n'iwu niile gbasara nchekwa na nkesa ọrịa covid-19.

Gịnị mere na ọdọụgbọelu a anaghị anabata njem mba ofesi na mbụ?

Ndị mmadụ jụrụ sị, "gịnị ji nkịta ọnwụ mere na ụgbọelu na-aga mba ofesi Bekee kpọrọ 'international flights' amalitebeghị ifepụ maọbụ ifebata n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam nke Enugwu steeti?:

Smart Adeyemi, onyeisi kọmiti na-ahụ maka njem ụgbọelu n'Ụlọomeiwu uỤwu, gwara ndị ntaakụkọ na njem ofesi ga-amalite n'ọdọụgbọelu ahụ n'ụbọchị Tọzde, Julaị 29.

N'otu aka ahụ, Nnolim Nnaji, onyeisi kọmiti na-ahụ maka njem ụgbọelu n'ụlọ omeiwu nta, kwuru makwara ya bụ ọkwa abalị olemole gara aga

Mana nnyocha BBC Igbo mere gosiri na nke a emeghị dịka Adeyemi na Nnaji siri kwuo.

Otu onye na-arụ n'ọdọụgboelu Akanu Ibiam gwara BBC Igbo na ihe niile ezuola oke iji malite njem ofesi, mana ọ malitebeghị.

Nwa amadi a achọghị ka a kpọọ aha ya n'ihi na o nweghị ikike ịgwa ndị ntaakụkọ okwu kwuru sị: "Ihe niile adịla etu o kwesịrị, anyị onwe anyị adịkwala njikere."

"Ihe fọrọ ugbua bụ ka ngalaba NCAA nakwa Mịnịsta njem ụgbọelu nye nkwado."

"Njem ofesi ga-amalite ọzọ ngwangwa anyị nwetara nkwado a."

Aha onyonyo, Ọrụ amalitela n'Ọdọ Ụgbọelu Enugu?

Mgbe BBC Igbo kpọrọ otu n'ime ndị isi ngalaba na-ahazị njem ụgbọelu a kpọrọ "Federal Airports Authority of Nigeria" bụ Henrietta Yakubu, ọ zaghị ekwentị ya.

Mana ọ zaghachiri ajụjụ anyị zigaara ya n'ozi ekwentị were kwuo sị: "Njem ofes ga-amaliterịrị n'ụbọchị Mọnde, abalị abụọ nke ọnwa Ọgọst 2021".

Mịnịsta njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika asabeghịkwa ajụjụ anyị zigaara ya n'ekwentị.

Gịnị mere e ji mechie mpaghara njem ofesi nke ọdọụgbọelu Enugwu?

Akanu Ibiam Airport

Naanị ụgbọelu ndị 'Ethiopian Airlines' na-esi n'ọdọụgbọelu nke Enugwu aga mba ofesi.

Mana ha kwụsịrị kemgbe gọọmentị etiti machiri njem ofesi n'ihi ọrịa coronavirus.

Ugbua, dịka gọọmentị maghere njem, ọtụtụ ọdọụgbọelu ebe ndị mba ofesi si efepu nakwa efebata amalitela ịrụ ọrụ, mana nke Enugwu amalitebeghị.

Ọtụtụ ndị njem na-ajụ ihe mere o jiri bụrụ naanị nke Enugwu ka emepebeghị.

Ọdọụgbọelu Akanu Ibiam Enugwu

Oge Ezenwaanyị Elizabeth bịara nleta na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n'ọnwa Febrụwarị afọ 1956

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọdọụgbọelu Enugwu, oge a na-anabata Ezenwaanyị Elizabeth dịka ọ bịara nleta na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n'ọnwa Febrụwarị afọ 1956.

Ọdọụgbọelu a nke a na-akpọ 'Akanu Ibiam International Airport' malitere n'oge gboo, oge ndị ọcha na-achị Naịjirịa.

Ndị ọcha rụrụ ebe ato n'Enugwu, Kalaba na Pọtakọtụ, ebe ụgbọelu na-ada nakwa efeli, a na-akpọ 'aerodome'

Ọ bụ n'abalị abụọ nke ọnwa Ọkụtoba afọ 1976, ka onyeisiala oge ahụ bụ Shehu Musa Yar'Adua mere ya ka ọ bụrụ ọdọụgbọelu kwụụrụ onwe ya.

Mana naanị njem n'ime Naịjirịa ka mmadụ nwere ike isi ebe ahụ mee.

Goodluck Jonathan na Stella Oduah

Ebe foto si, Stella Oduah/Facebook

Nkọwa foto, Ọ bụ oge Goodluck Jonathan bụ onyeisiala, Stella Oduah bụrụ Mịnịsta nje ụgbọelu, ka e buliri ogo ọdọụgbọelu Enugwu ka ọ bụrụ 'international'.

N'abalị abụọ nke ọnwa Febrụwarị afọ 2010, gọọmentị mechiri ọdọụgbọelu ahụ iji rụzigharịa ya ma mee ya ka ọ bụrụ ebe ụgboelu mba ofesi ga-esi na-efepu nakwa efebata.

Arụchara ọrụ a ma mepee ya bụ ọdọụgbọelu n'ọnwa Disemba 2010 oge Goodluck Jonathan bụ onyeisiala.

N'ọnwa Ọgọst 2019, gọọmentị mechikwara ọdọụgbọelu ahụ ọzọ iji rụọ ọrụ n'okporo ụzọ ebe ụgbọelu na-agba, bekee na-akpọ 'runway'.

Dịka a rụchara ya bụ ọrụ, gọọmentị mepekwara ya na ngwụcha ọnwa Ọgọst 2020.

Mana ruo taa ọtụtụ na-ekwu na ọdọụgbọelu nke Enugwu eruchabeghị ogo international, dịka ndị ọzọ e nwere na Naịjirịa.