Birth Control: Etu ọgwụ 'contraceptives' si chọọ idula m mmụọ

Ebe foto si, VANESSSA CENTENO
- Onye dere ya, Sandrine Lungumbu
- Ndị mere akụkọ a, BBC World Service
Mgbe Vanessa Centeno chọpụtara na o nwere mkpụkọ ọbara na ngụgụ ya, ọ gbara ya gharịị.
Mana oge ndịọrụ ahụike gwara ya ihe kpatara ụdị ihe a, ọ gbagwojuru ya anya karịa.
N'afọ 2019, Vanessa bụ onye na-arụ ọrụ n'obodo Boston, malitere ịṅụ ọgwụ 'contraceptive' iji gbochie ịtụrụ ime.
Nde kwuru nde ụmụnwaanyị na-ṅụ ọgwụ a n'akụkụ ụwa niile.
Mana ọgwụ a kpatara ọbara mkpụkọ na ngụgụ Vanessa nke mere ka ndụ ya gbanwee kpamkpam.
Ụjọ jidere m, e che m na m na-enwe obi nkoropu

Ebe foto si, Getty Images
Vanessa kwuru sị: "Ka m na-agbago elu otu ụbọchị, enwekwaghị m ike ikute ume nke ọma."
"Ụdị ihe a emetubeghị m ebe m na-agba mbọ niile m nwere ike iji kute ume"
Mana Vanessa mechara gbalịa gaa ụlọọgwụ ebe e nyere ya ihe ga-enyere ya aka ikute ume.
Nnyocha gosiri na e nwere ihe kpụkọrọ n'akụkụ ngụgụ ya, mana ha chere na ọ bụ 'pneumonia'.
Mana ka otu ọnwa gachara, iku ume Vanessa kawanyere njọ nke mere ka e ziga ya na nnukwu ụlọọgwụ.
Ebe ahụ ka nnyocha gosiri na ọbara kpụkọrọ na ngụgụ ya.
Vanessa kwuru na dọkịta gwara ya na "ihe kpatara ọbara mkpụkọ ahụ bụ ọgwụ 'contraceptive' m malitere ịṅụ n'ihi na onweghị ihe ọhụrụ ọzọ m tinyere n'ahụ m."
"Ha gwara m na ọ bụrụ na chekwuru ka otu ụbọchị gafee tupu m bịa ụlọọgwụ, ihe gaara akawanye njọ."
Kedụ etu ọbara mkpụkọ si emetụta ụmụnwaanyị na-aṅụ ọgwụ 'contraceptive'?

Ebe foto si, Getty Images
Ọ na-ara ahụ tupu ihe dị otu a emee.
Nnyocha nke ngalaba 'National Health Service' mere na mba UK gosiri na ọ bụ naanị ụmụnwaanyị iri na abụọ n'ime puku iri na-aṅụ ọgwụ 'contraceptive' nwere ike inwe ọbara mkpụkọ n'ime otu afọ.
Ndị NHS nyere ndụmọdụ ka mmadụ jụọ dọkịta ya maka ihe ọbụla gbagwojuru ya anya.
N'ụwa niile, ihe karịrị ụmụnwaanyị otu narị nde na iri ise (150 million) na-aṅụ ọgwụ 'contraceptive' iji gbochie afọ ime.
Ọgwụ a nwere ike ime ka mmadụ buo ibu, maọbụ metụta ọnọdụ echiche mmadụ, mana o nwekwara ike ịkpatara ụfọdụ ọbara mkpụkọ nke nwere ike idula mmadụ mmụọ.
Ọkammụta Beverly Hunt nke ụlọọgwụ Guy's and St Thomas' Hospital dị na London kwuru na mmadụ ịṅụkọ ụdị ọgwụ 'contraceptive' abụọ ọnụ nwere ike ịkpata ọbara mkpụkọ.
Etu mkpụrụọgwụ contraceptive si arụ ọrụ

Ebe foto si, Getty Images
Mkpụrụọgwụ 'contraceptive' na-enwe ụdị akụrụngwa 'oestrogen' maọbụ 'progesterone' bụ nke ahụ mmadụ na-emepụtakwa.
Ọ bụ akụrụngwa ndị a na-ezigara ụbụrụ ozi iji gbochie ahụ nwaanyị iyipụta akwa nke na-eme ka ọ tụrụ ime.
Mkpụrụọgwụ ndị a nwereike ịkpatara nwaanyị ịgbọ agbọ, ibu oke ibu, ihe ntukasị n'ihu nke a kpọrọ 'pimple', dịrị gawazie.
Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ekwu na ọ na-akpatakwara ha isi ọwụwa, anaghị achọ inwe mmekọ ahụ (low libido), ara ịfụ ụfụ na ihe ndị ọzọ.
Mana Dọkịta Zozo Nene nke ụlọọgwụ Steve Biko dị na Saụt Afrịka kwuru na ọbara mkpụkọ na-emekarị n'ụmụnwaanyị buru ibu.
Ụjọ ka ji m aka - Vannessa
Otu afọ agaala kamgbe Vannessa nwechara ọbara mkpụkọ na ngụgụ ya n'ihi ọgwụ 'contraceptive', mana o kwuru na egwu ka ji ya aka.
"Aṅụrụ m ọgwụ ọnwa isii ma na-akpachapụkwa anya n'ihe ọbụla m na-eme iji gbochie ịgba ọbara n'ime ahụ m," Vanessa na-ekwu.
"Oge ọbụla m chọrọ ịsa akwa, ụjọ ga-ejide m ka a ga-asị na okuku ume m ọ chọwala ịkwụsị ọzọ.:
"Mana ana m echetara onwe m oge niile na ahụ esiela m ike ugbua."

Ebe foto si, Getty Images
Vanessa gara n'ihu kwuo na ụwa nwaanyị adịghị mfe ma ncha n'ihi ọtụtụ ihe ha na-agabiga n'ahụ ha.
"Anyị na-anọ na nsọ kwa ọnwa ọbụla, ahụ mgbu oge niile, ma burukwa ya na-arụ ọrụ dị icheiche."
"Ọ bụrụ na i kwuo okwu, ndị mmadụ ga-ele gị anya dịka onye umengwụ. Ha ga-agwa gị sị, 'ihe a ekwesịla ịmata gị ahụ ugbua."
Ekwesịrị ịchọpụta ụzọ a ga-eji mee ka ihe ndị a dịwanyere anyị mfe. ọ bụ eziokwu na ha ga-abịarịrị mana e kwesịrị ime ya ka ọ dịrị anyị mfe ma kawanyere anyị mma."
















