Igbochi afọime nwereike ịzọ nwaanyị ndụ

Aha onyonyo, Igbochi afọime nwereike ịzọ nwaanyị ndụ

Dibia Bekee bụ ọkammụta Uche nwagha gwara BBC Igbo na ọ dị mkpa na nwaanyị gbochiri ime oge ọ na-achọghị ya.

O kwuru n'ezie na ndị ụka anaghị anabata ya mana ọ bụ ihe dị mkpa iji hazie ezinaụlọ na ụmụ ole di na nwunye chọrọ ịmụta.

Uru atọ igbochi afọime bara

Ọkammụta Nwagha gụpụtara ụfọdụ uru dị icheiche igbochi afọime bara.

  • Igbochi afọime ga-eme ka di na nwunye mụta ole ha ga-azụlị
  • Igbochi afọime ga-eme ka nwaanyị ghara ịmụ nwa mberede
  • Igbochi afọ ime ga-echekwa nwaanyị ma nye ohere ka nwaanyị doo ahụ ma ọ mụchaa nwa tupu ọ dị ime ọzọ
  • Igbochi aafọime nwereike ịzọ nwaanyị ndụ ọkachasị ọ bụrụ na nwaanyị nwere oke ọrịa ọ na-arịa dịka kansa ara, maọbụ ọrịa obi.

Lee ihe ọkammụta ahụ kwuru ebe a

Ezie, ndị ụka ekwenyeghi n'igbochi afọime mana ha nwereike ịnabata ya naanị oge ọ na-amaja ndụ nwaanyị.