Stingy Men Association na njirimara ha

Ebe foto si, Rude Boy Twitter Page
Stingy Men Association of Nigeria enwurula ọkụ kamgbe ndị ama ama tinyere ọnụ n'okwu a.
Ndị dịka oti egwu Don Jazzy ezigbo aha ya bụ Michael Collins Ajereh sonyere okwu a dịka onye ndu otu ahụ.
Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ bido jụwa ma ya bụ okwu abụ ezie ka ọbụ ihe egwuregwu.
Kedụ ka o si malite?
Atụmaatụ 'Stingy Men Association' a bidoro mbụ wuwe na Zambia ebe ụmụnwoke mba ahụ kwuru na ha agaghị atụnye ego gafere k5 n'ego Zambia n'isi ndị ọyị ha nwaanyị kama ha ewere ego ahụ chụta ego ga-abara ha uru.
Ihe ikwesiri ịma maka 'Stingy Men Association of Nigeria'
Atụmaatụ a bụ nke ụmụnwoke Niaịjirịa wepụtara na-ewu na soshal midia , iji kparị ọchị n'etiti ndị ji soshal midia ezi ozi.
N'ime akwụkwọ ndenye aha ha wepụtara, ha depụtara iwu otu ahụ bụ ikwalite ugwu ha site n'igbajọ inye ụmụnwaanyị ego na nkịtị.
Ha kwuru na ha agaghị etinye ego n'obi n'ọyị ha na-ayịsa ụmụnwaanyị.
Ndị ama ama sonyere n'atụmaatụ a
Na twitter , Don Jazzy wepụtara foto akwụkwọ njirimara ya a kpọrọ 'Id card' na bekee ma dee 'Emezuola m ndenye aha.'

Ebe foto si, Don Jazzy Twitter
Otiegwu Naịjirịa, Paul Okoye a.k.a Rude Boy sonyere otu a dịka o wepụtara id dịka onye otu ahụ nwa mgbe nta.

Ebe foto si, Rude Boy Twitter Page
Ndị ọnụ na-eru n'okwu na soshal midia nakwa ụfọdụ ụmụnwoke na Naịjirịa egosila mmasị ha isonye na ya bụ otu na-achọghị imefu ego ọbụla n'isi nwaanyị ọbụla ha na-ayị.
Ihe ha dere n'okpuru akara njirimara ha bụ enyekwa shi shi( enyekwela ego ọbụla).

Ebe foto si, Dr Pam Pam twitter page

Ebe foto si, Akin of Lagos Twiiter Page
A mabeghị ihe butere ọwuwu atụmaatụ a mana o butela mkparịtaụka n'etiti ụmụ nwoke Naịjirịa gbasara emefughị ego n'isi ndị ọyị nwaanyị.
[Stingy Women Association of Nigeria] SWAN
Ụmụnwaanyị Naịjirịa abanyela soshal midia ibọ ọbọ site n'ihibe otu a kpọrọ Stingy Women Association.
Ọ bụ eziokwu na owuwechabeghị ọfụma nke otu ahụ mana anyị ahụla esereese ndị a nakwa ụfọdụ ndị na-asa ha okwu na soshal midia.

Ebe foto si, Aderoyal jr 2 twitter page











